25
Pọl nʼihu Festọs
Mgbe ụbọchị atọ gasịrị site nʼoge Festọs bịara na mpaghara ọchịchị ya, o sitere Sizaria garuo Jerusalem. Nʼebe ahụ ka ndịisi nchụaja na ndịisi ndị Juu kọwara ya ihe banyere Pọl. Ha rịọkwara ya nʼamara ọ ga-emere ha bụ ime ka Pọl bịa na Jerusalem. Nʼihi na ha agbaala izu igbu ya nʼụzọ. Ma Festọs zara, “Pọl nọ dịka onye mkpọrọ na Sizaria. Ebe ahụ ka mụ onwe m ga-alaghachi na mgbe na-adịghị anya. Ya mere, ka ndịisi unu ji ikike soro m gaa, boo nwoke ahụ ebubo ma ọ bụrụ na o nwere ihe ọjọọ o mere.”
Ọ nọnyeere ha ihe dịka ụbọchị asatọ maọbụ ụbọchị iri, tupu ọ laghachi na Sizaria. Nʼụbọchị so ya, ọ nọdụrụ nʼoche ikpe, nye ikike ka a kpọpụta Pọl. Mgbe ọ bịaruru, ndị Juu sitere Jerusalem bịa gbara ya gburugburu na-ekwu ọtụtụ ihe megide ya nke ha na-enweghị ike ịkọwa.
Ma Pọl gọọrọ onwe ya, na-asị, “Ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere megide iwu ndị Juu maọbụ ụlọnsọ, maọbụ Siza.”
Ma ebe Festọs na-achọ inwe ihuọma nʼebe ndị Juu nọ, ọ sịrị Pọl, “Ị chọrọ ịga Jerusalem ka m kpee gị ikpe nʼebe ahụ?”
Pọl eburu ikpe gaa nʼihu Siza
10 Ma Pọl sịrị, “Eguzo m nʼụlọikpe Siza nʼonwe ya, ebe e kwesiri ka a nọdụ kpee m ikpe. Ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere ndị Juu, dịka ị maara nke ọma. 11 Ọ bụrụ na ọ dị ihe m mere kwesiri ọnwụ, anaghị m arịọ ka m gbanarị ọnwụ. Ma ọ bụrụ na ọ dịghị eziokwu dị nʼebubo ndị Juu a na-ebo m, mmadụ ọbụla agaghị e were m nyefee nʼaka ha. Ya mere, ọ bụ Siza ka m na-akpọku.”
12 Ya mere, mgbe Festọs na ndị na-adụ ya ọdụ gbara izu, ọ zara, “Ị kpọkuola Siza, ọ bụkwa Siza ka ị ga-agakwuru.”
Festọs na eze Agripa e nwee nzukọ
13 Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, eze Agripa na Benaisi bịara Sizaria ịnabata Festọs. 14 Mgbe ha nọrọ ọtụtụ ụbọchị nʼebe ahụ, Festọs kọwara eze a ọnọdụ Pọl sị, “Ọ dị nwoke Feliks hapụrụ nʼụlọ mkpọrọ nʼebe a. 15 Mgbe m gara Jerusalem, ndịisi nchụaja na ndị okenye ndị Juu gwara m banyere ya. Ha rịọkwara ka m maa ya ikpe.
16 “Ma emere m ka ha ghọta na o megidere iwu ndị Rom ịrara mmadụ ọbụla nye tupu ekpee ya ikpe nyekwa ya ohere ịgọrọ onwe ya nʼihu ndị na-ebo ya ebubo. 17 Nʼihi nke a, mgbe ha bịara nʼebe a, atụfughị m oge ọbụla, kama nʼụbọchị nke ọzọ ya, anọdụrụ m nʼoche ikpe, nye ikike ka a kpọbata nwoke ahụ. 18 Mgbe ndị na-ebo ya ebubo biliri, ọ dịghị otu nʼime ụrụ ala ndị m chere ha ga-akpọ aha nke ha gụpụtara na o mere. 19 Okwu ha niile bụ ịrụ ụka banyere okpukpe ha, na banyere otu onye ọzọ a na-akpọ Jisọs onye nwụrụ, onye Pọl na-ekwusịkwa ike na ọ dị ndụ. 20 Ọ rara m ahụ imedo okwu dị otu a. Nʼihi ya, a jụrụ m ya ma ọ ga-amasị ya ị ga nʼụlọikpe dị na Jerusalem ka ọ nọrọ nʼebe ahụ gọrọ onwe ya. 21 Ma Pọl rịọrọ ka e debe ya nʼụlọ mkpọrọ ruo mgbe Siza nʼonwe ya ga-ekpebi ikpe ya. Ya mere, ezighachiri m ya nʼụlọ mkpọrọ tutu ruo mgbe m jikeere izigara ya Siza.”
22 Agripa gwara Festọs, “Achọrọ m ịnụ okwu site nʼọnụ nwoke a nʼonwe ya.”
Ọ sịrị, “Ị ga-anụ ya echi.”
Pọl nʼihu Agripa
23 Ya mere, nʼechi ya, Agripa na Benaisi rutere nʼụlọ ọha na-anọ anụ ikpe nʼoke nganga. Ọtụtụ ndịisi agha na ndị a maara aha ha nʼobodo a sooro ha. Festọs nyere iwu ka a kpọbata Pọl. 24 Festọs sịrị, “Eze Agripa na ndị niile soro anyị nọrọ nʼebe a, unu ahụla nwoke a onye ọha ndị Juu niile, ma ndị nọ nʼebe a ma ndị nọ na Jerusalem, wetara ikpe ya nʼaka m na-eti mkpu na o kwesighị ịdị ndụ ọzọ. 25 Ma achọpụtaghị m ihe ọjọọ o mere nke kwesiri ka ọ nwụọ. Ma ebe ọ rịọrọ ka Siza lenye ikpe ya anya, ekpebiri m iziga ya. 26 Ma enweghị m ihe ọbụla doro anya m ga-edegara Siza banyere ya. Ya mere m jiri kpọpụta ya nʼihu unu niile, ma karịsịa nʼihu gị onwe gị eze Agripa, ka ọ ga-abụ anyị tulesịa ihe banyere ya, ka m nwee ihe m ga-ede. 27 Nʼihi na ọ bụ ihe na-ezighị ezi na m ga-ezipụ onye mkpọrọ na-egosighị nʼebubo e boro ya.”