Emọs
1
Okwu ndị Emọs kwuru, onye bụ otu nʼime ndị ọzụzụ atụrụ nke obodo Tekoa. Ndị a bụ ọhụ ọ hụrụ banyere Izrel. Ọ hụrụ ọhụ a mgbe Uzaya bụ eze ndị Juda. Nʼoge ahụ kwa ka Jeroboam nwa Joash na-achị Izrel. Ọ hụrụ ọhụ a afọ abụọ tupu oke ala ọma jijiji ahụ adịrị.
 
 
Ọ sịrị,
Onyenwe anyị si nʼugwu Zayọn na-ebigbọ,
o si na Jerusalem na-eme ka olu ya daa ụda.
Ebe ịta nri nke ndị ọzụzụ atụrụ ga-eru ụjụ.
Elu ugwu Kamel ga-akpọnwụkwa.
Ikpe ọmụma dịrị ndị agbataobi Izrel
Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu,
“Nʼihi njehie atọ nke Damaskọs,
na nʼihi njehie ha nke ugboro anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.
Nʼihi na ha azọpịala ndị m nʼime Gilead,
ha ji igwe ịzọcha mkpụrụ ọka nwere eze.
Nʼihi ya, aga m esunye ọkụ nʼụlọeze Hazael;
ọkụ a ga-erepịakwa ebe niile e wusiri ike nke Ben-Hadad.
Aga m etiji ibo ọnụ ụzọ ama Damaskọs,
aga m ekpochapụkwa ndị niile bi na Ndagwurugwu Aven,
na onye ahụ mkpara eze dị nʼaka ya, nke nọ na Bet-Eden.
Ndị Aram ga-abụkwa ndị a dọtara nʼagha, ndị a ga-adọkpụrụ gaa Kia.”
Ka Onyenwe anyị kwuru.
Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu,
“Nʼihi njehie atọ nke Gaza,
e, nʼihi njehie nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ,
nʼihi na ha dọtara mmadụ niile nʼagha,
ranye nʼaka ndị Edọm.
Nʼihi ya, aga m esunye ọkụ na mgbidi niile nke Gaza,
ebe ya niile e wusiri ike ga-agba ọkụ.
Aga m egbu ndị Ashdọd,
ma bibiekwa onye ahụ na-achị Ashkelọn.
Aga eweli aka m megide ndị Ekrọn,
ruo mgbe ndị Filistia fọdụrụ ga-ala nʼiyi.”
Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị.
Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu,
“Nʼihi njehie atọ nke Taịa,
e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.
Nʼihi na ha dọkpụrụ ọgbakọ ndị mmadụ renye nʼaka Edọm dịka ohu,
ma chefuo ọgbụgba ndụ nwanne na nwanne dị nʼetiti ha.
10 Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na mgbidi niile nke Taịa;
ọ ga-eredakwa ebe ha niile e wusiri ike.”
11  Onyenwe anyị na-ekwu,
“Nʼihi njehie atọ nke Edọm,
e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.
Nʼihi na o ji mma agha chụọ nwanne ya ọsọ,
o meghị ebere,
kama, o mere ka iwe ya dịgidesie ike;
nrubiga oke nke ọnụma ya akwụsịkwaghị akwụsị.
12 Nʼihi ya, aga m esunye ọkụ na Teman;
ọ ga-erekwa nʼebe niile e wusiri ike nke Bozra.”
13 Ma otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu,
“Nʼihi njehie atọ nke Amọn,
e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ,
nʼihi na ha were mma agha ha bọwaa afọ ụmụ nwanyị Gilead dị ime,
nʼihi ime ka oke ala ha saa mbara.
14 Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na mgbidi niile nke Raba.
Ọ ga-erepịakwa ebe ya niile e wusiri ike.
Oke ụzụ agha nke ga-ada dịka ụzụ oke ifufe,
na ụzụ egbe eluigwe ga na-ada nʼụbọchị ahụ.
15 Eze ha na ndịisi ọchịchị ya ga-abụ ndị a dọtara nʼagha,
ndị ga-aga biri nʼala ọzọ.”
Ka Onyenwe anyị sịrị.