3
Ndị ama megide Izrel
Nụrụnụ okwu ndị a nke Onyenwe anyị kwuru megide unu, unu ndị Izrel, megidekwa ezinaụlọ ahụ niile nke m kpọpụtara site nʼala Ijipt.
“Naanị unu ka m họọrọ
nʼime ezinaụlọ niile nke nọ nʼelu ụwa;
Ọ bụ nʼihi nke a ka m ga-eji nye unu ahụhụ
nʼihi mmehie unu niile.”
 
Mmadụ abụọ ga-esi aṅaa jekọọ ije
ma ọ bụrụ na ha enweghị nkwekọrịta?
Ọdụm ọ na-agbọ ụja nʼọhịa
ma ọ bụrụ na o nweghị anụ ọ hụrụ?
Nwa ọdụm ọ na-ebigbọ nʼime olulu ya,
mgbe ọ dịghị anụ ọ dọgburu?
Nnụnụ ọ na-ama nʼọnya dị nʼala
ma ọ bụrụ na o nweghị ọnya e siri ijide ya?
Ọnya e siiri anụ ọ na-akụchi
ma ọ bụrụ na o nweghị ihe ọ matara?
Mgbe a fụrụ opi nʼobodo,
ọ bụ na ndị bi nʼime ya adịghị ama jijiji?
Mgbe mbibi na ịla nʼiyi dakwasịrị obodo ọbụla
ọ bụghị Onyenwe anyị mere ka ọ dị?
 
Nʼezie Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị adịghị eme ihe ọbụla
tutu ruo mgbe o buru ụzọ gosi ya
ndị na-ejere ya ozi bụ ndị amụma.
 
Ọdụm agbọọla ụja,
o nwere onye na-agaghị atụ egwu?
Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ekwuola okwu,
onye ga-ahapụ ibu amụma?
 
Kwusaanụ ya nʼobodo niile e wusiri ike nke Ashdọd
na ebe niile e wusiri ike nke Ijipt, sị,
“Zukọtanụ* nʼelu ugwu niile nke Sameria
ka unu hụ oke ọgbaaghara nke dị nʼetiti ya
na mmegbu niile nke dị nʼetiti ndị ya.
 
10 “Ha echezọọla ime ezi ihe.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“bụ ndị ahụ na-akpakọba ihe e zutere nʼohi na ihe e sitere nʼaka ike pụnara ndị mmadụ
nʼime nʼụlọ ha niile e wusiri ike.”
11 Nʼihi ya nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,
“Onye iro na-abịa! Ọ ga-agba ala gị gburugburu;
ọ ga-akwatu ebe niile gị bụ nke e wusiri ike,
ma kwakọrọkwa ihe niile dị nʼụlọ gị ndị ahụ e wusiri ike.”
12 Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,
“Dịka onye ọzụzụ atụrụ si anapụta
naanị ọkpụkpụ ụkwụ abụọ maọbụ iberibe ntị site nʼọnụ ọdụm,
otu a ka a ga-esi zọpụta ụmụ Izrel bi na Sameria,
na nkuku isi ihe ndina
na nʼiberibe akwa ọma site nʼelu ihe ndina.§
13 “Nụrụ nke a, ma gbaanụ ama megide ụmụ Jekọb,” ọ bụ otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, kwubiri.
14 “Nʼụbọchị ahụ, m ga-enye Izrel ahụhụ nʼihi mmehie ha,
aghaghị m imebikwa ebe ịchụ aja nke dị na Betel.
Mpi dị nʼebe ịchụ aja ka a ga-ebipụkwa,
mee ka ha daa nʼala.
15 Aga m etida ụlọ ndị niile ha wuru maka oge oyi,
na nke ha wuru maka oge okpomọkụ;
aga m ebibikwa ụlọ ndị ahụ niile ha ji ọdụ enyi wuo.
Ọtụtụ ebe obibi ha niile ka a ga-etitukwa.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
* 3:9 3:9 Maọbụ, Werenụ ọnọdụ unu 3:9 3:9 A na-eme nʼime ya 3:12 3:12 Ndị na-edina nʼelu akwa dara oke ọnụahịa § 3:12 3:12 Ọ bụ nʼọnụ akụkụ ihe ndina na akwa ha