8
Nkata mkpụrụ chara acha
Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gosiri m. Otu nkata nke mkpụrụ osisi ọkọchị chara acha jupụtara. Ọ sịrị m, “Emọs, gịnị ka ị na-ahụ?”
A sịrị m: “Otu nkata nke mkpụrụ osisi chara acha jupụtara nʼime ya.”
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, “Oge ọgwụgwụ abịakwasịla ndị m, Izrel. Agaghị m ewezugakwa ntaramahụhụ dịrị ha.”
Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, “Nʼụbọchị ahụ, abụ niile nke a na-abụ nʼime ụlọnsọ ukwu ga-aghọ iti mkpu akwa. Ọtụtụ, ọtụtụ ozu ndị nwụrụ anwụ, nʼebe niile ọbụla ka atụpụsịrị ha! Mkpọtụ ọbụla adịghịkwa!”*
Nụrụnụ nke a, unu ndị na-azọpịa ndị mkpa na-akpa,
na-emekwa ka ụmụ ogbenye dị nʼala a gwụsịa,
na-asị,
“Olee mgbe ọnwa ọhụrụ ga-agafe
ka anyị ree mkpụrụ ubi,
na mgbe ụbọchị izuike ga-agwụ
ka anyị ree ọka wiiti?”
Ka anyị jiri ihe ọtụtụ dị nta,
na ibuli ọnụ ngwa ahịa elu,
na aghụghọ site nʼiji ihe ọtụtụ na-ezughị ezu.
Jiri ọlaọcha zụta ụmụ ogbenye,
jirikwa akpụkpọụkwụ abụọ anyị zụta ndị mkpa na-akpa,
ma reekọta ọka wiiti anyị zachatara nʼala ya na ezi ọka wiiti.
Onyenwe anyị ewerela nganga Jekọb ṅụọ iyi, “Nʼezie, agaghị m echefu, ọ bụladị otu nʼime ọrụ niile ha rụrụ.”
Ọ bụ na ala agaghị ama jijiji nʼihi nke a,
ndị niile bi nʼime ya ha agaghị eru ụjụ?
Ala a niile ga-etoju dịka osimiri Naịl,
a ga-eme ka ọ magharịa malie elu, ma tachaa
dịka iyi Ijipt.
“Ma nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya,
“Aga m eme ka anyanwụ daa nʼetiti ehihie,
ime ka ọchịchịrị dịrị nʼetiti oke ehihie nke ụbọchị.
10 Aghaghị m ime ka ụbọchị oke oriri unu ghọọ ụbọchị iru ụjụ;
gbanwee abụ unu niile ka ha ghọọ abụ akwa.
Aga m eme ka onye ọbụla nʼime unu yiri akwa mkpe,
meekwa ka unu kpụchaa isi unu.
Aga m eme ka ụbọchị ahụ dịrị ka ụbọchị a na-eru ụjụ, nʼihi otu mkpụrụ nwa nwoke nwụrụ anwụ.
Ọgwụgwụ ya ga-adịka ụbọchị na-elu ilu ilu.
 
11 “Lee, ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya,
“mgbe m ga-eziga oke ụnwụ nʼelu ala,
ọ bụghị ụnwụ nke nri maọbụ nke akpịrị ịkpọ nkụ nke mmiri,
kama ọ bụ oke ụnwụ nke ịnụ okwu niile nke Onyenwe anyị.
12 Ha ga-awagharị site nʼotu osimiri ruo nʼosimiri ọzọ,
sitekwa nʼugwu ruo nʼọwụwa anyanwụ;
ha ga-agbagharị nʼelu na ala ịchọ okwu Onyenwe anyị,
ma ha agaghị achọta ya.
13 “Nʼụbọchị ahụ,
“ụmụ agbọghọ ndị mara mma ile anya, na ụmụ okorobịa ndị dị ike
ga-ada mba nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ.
14 Ndị ahụ na-eji mmehie Sameria na-aṅụ iyi,
ndị na-asị, ‘Dịka chi gị na-adị ndụ, gị Dan,’
nakwa, ‘Ebe ọ bụ na chi ndị Bịasheba na-adị ndụ,’
ha ga-ada, ha agakwaghị ebilite ọzọ.”
* 8:3 8:3 Ya bụ, ebe ọbụla dere juu 8:9 8:9 Ya bụ, ime ka chi jie 8:14 8:14 Nʼaha Ashima bụ arụsị