12
Ya mere, cheta Onye kere gị
mgbe ị ka bụ okorobịa,
tupu ụbọchị ọjọọ ndị ahụ abịa,
na mgbe afọ aka abịarubeghị
mgbe ị ga-asị, “Ha anaghị atọkwa m ụtọ.”
Tupu anyanwụ na ìhè,
ọnwa na kpakpando ga-agba ọchịchịrị,
na nlọghachi igwe ojii mgbe mmiri zosiri.
Mgbe ndị na-echebe ụlọ ga-ama jijiji,
mgbe ndị dimkpa nwoke ga-ehulata,
mgbe ndị na-akwọ ihe kwụsịrị maka ha dị ole na ole,
mgbe ndị na-elepụ anya site nʼoghere ga-ebido ịgba ọchịchịrị,
mgbe e mechiri ọnụ ụzọ nke pụrụ nʼokporoụzọ,
mgbe olu ịkwọ nri ga-adị ala,
mgbe ụda olu abụ ụmụ nnụnụ ga-akpọte ndị mmadụ,
ma abụ ha niile na-ala ala,
mgbe ndị mmadụ ga-atụ egwu ebe dị elu;
na ihe egwu nke okporoụzọ,
mgbe osisi alụmọnd ga-ama ifuru
mgbe ụkpana ga na-adọkpụ onwe ya nʼụzọ,
agụụ ihe ọbụla ga-akwụsịkwa.
Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ala ụlọ ebighị ebi ya,
ndị na-akwa akwa ga na-agagharị nʼokporoụzọ niile.
 
E, cheta ya, tupu e gbubie ụdọ ọlaọcha ahụ,
tupu e tiwaa ọkwa ọlaedo,
tupu ite adawaa nʼisi iyi,
tupu e tijie ụkwụ igwe olulu mmiri.
Mgbe ahụ, anụ ahụ anyị ga-alaghachi nʼaja ebe o si pụta;*
mmụọ anyị ga-alaghachikwuru Chineke onye nyere ya.
 
“Ihe efu! Ihe efu!” ka onye ozizi kwuru.
“Ihe niile bụ ihe efu!”
Nchịkọta okwu niile
Ọ bụghị naanị nʼonye ozizi ahụ bụ onye maara ihe, o jegharịrị na-ezi ndị mmadụ ihe ọ maara. Ọ tụgharịrị uche chọpụta ọtụtụ ilu, detuokwa ha nʼusoro. 10 Onye ozizi chọpụtara okwu ndị dabanyere nʼusoro, ihe o depụtara bụ ihe ziri ezi na eziokwu.
11 Okwu ọnụ nke onye maara ihe dị ka ndụdụ e ji achụ ehi. Nchịkọta okwu amamihe ndị a dị ka ǹtu a kumiri nke ọma, nke onye na-azụ atụrụ nyere. 12 Ma nwa m nwoke lezie anya, atụkwasịla ihe ọzọ nʼelu ihe ndị a.
Akwụkwọ a na-ede ede enweghị ọgwụgwụ, ọtụtụ mmụta na-agwụ ike.
13 Ugbu a anụla ihe ndị a niile,
ma nụrụ ihe bụ nkwubi okwu:
Tụọ egwu Chineke, debekwa iwu ya niile,
nʼihi na nke a bụ ọrụ niile dịrị mmadụ.
14 Nʼihi na Chineke ga-ekpe ọrụ ọbụla ikpe,
ya na ihe nzuzo anyị niile,
ma ha dị mma ma ha dị njọ.
* 12:7 12:7 Jen 3:19; Job 34:15; Abụ 90:3 12:7 12:7 Ekl 3:21