3
Ihe niile nwere oge
Ihe ọbụla nwere oge;
mgbe dịkwara ihe ọbụla a na-eme eme nʼeluigwe.
 
Oge ịmụ nwa na oge ịnwụ anwụ,
oge ịkụ ihe na oge ihopu,
oge igbu egbu; na oge ịgwọ ọrịa,
oge itikpọ na oge iwuzi ewuzi,
oge ịkwa akwa, na oge ịchị ọchị,*
oge iru ụjụ na oge ite egwu,
oge ikposa nkume na oge ịchịkọta nkume,
oge ịbakụ na oge ịkwụsị ịbakụ,
oge ịchọ ihe, na oge ntufu,
oge ịchịkọba, na oge ichifusi,
oge ndọwasị, na oge ndụkọta,
oge ịgba nkịtị, na oge ikwu okwu,
oge ịhụnanya na oge ịkpọ asị,
oge ibu agha, na oge ime udo.
Gịnị bụ nnọọ ihe mmadụ na-enweta site na ndọgbu niile nke nʼọrụ niile ọ na-arụ? 10 Ahụla m ibu arọ nke Chineke bokwasịrị ndị mmadụ e kere eke. 11 O meela ka ihe niile maa mma nʼoge nke ya. O tinyekwala ebighị ebi nʼime obi ndị mmadụ; ma o nweghị ka mmadụ ghọta ọrụ Chineke site na mmalite ruo nʼọgwụgwụ. 12 Nʼihi ya, ekpebiri m na ihe dịịrị mmadụ ịchọ bụ obi ụtọ na inwe aṅụrị na ndụ ya niile. 13 Ihe ọzọ bụ ka mmadụ rie, ṅụọ, ma nwee afọ ojuju na ndọgbu niile ọ na-adọgbu onwe ya, nʼihi na ha bụ onyinye si nʼaka Chineke. 14 Amaara m na ihe niile Chineke mere na-adịgidekwa. O nweghị ihe apụrụ itinye na ya, o nweghịkwa ihe apụrụ iwepụkwa site na ya. Chineke na-eme nke a ka ndị mmadụ tụọ egwu ya.
15 Ihe ọbụla dị ugbu a, adịlarị na mgbe ochie,
ihe ọbụla gaje ịdị dịlarị na mbụ.
Chineke na-eme ka ihe niile mere na mgbe gara aga megharịakwa ọzọ.
16 Ọzọkwa, achọpụtara m otu ihe nʼokpuru anyanwụ,
na ọnọdụ ezi ikpe naanị mmebi iwu jupụtara,
nʼebe e kwesiri inwe ikpe ziri ezi ị ga-achọpụta na ihe ọjọọ dịkwa ya.
17 A gwara m onwe m,
“Chineke ga-ekpe,
ndị ezi omume na ndị ajọ omume ikpe,
nʼihi na a ga-enwe oge maka ihe ọbụla a na-eme eme,
oge dịkwa maka ikpe ọrụ niile nke mmadụ ikpe.”
18 Echere m nʼobi sị, “Ebe mmadụ nọ, Chineke na-anwale ya, ka mmadụ mata na ha dị ka anụmanụ. 19 Nʼihi na ihe na-eche mmadụ na anụmanụ bụ otu. Ha abụọ na-eku ume, ha abụọ na-anwụkwa anwụ. Ọ dịghị ihe mmadụ ji karịa anụmanụ. Ihe niile bụ ihe efu. 20 Ha niile na-alaghachi nʼotu ebe; ọ bụ nʼaja ka ha si pụta, ebe ahụ kwa ka ha ga-alaghachi. 21 Onye pụrụ iguzo gbaa akaebe na mmụọ mmadụ na-ala nʼelu ma nke anụmanụ na-ala nʼaja?”
22 Nʼihi ya, ahụrụ m na ọ dịghị ihe ọzọ ụmụ mmadụ kwesiri ime karịakwa inwe ọṅụ nʼọrụ ha, nʼihi na nke ahụ bụ oke ha nʼebe a. Onye ga-eme ka ha bịaghachi hụ ihe ga-eme nʼazụ ha?
* 3:4 3:4 Rom 12:15 3:7 3:7 Ems 5:13; Ilu 25:11