7
Amamihe
Ezi aha* ka mma karịa mmanụ isi ụtọ.
Ụbọchị mmadụ nwụrụ ka ụbọchị a mụrụ ya mma.
Ọ kaara gị mma ije nʼebe a na-eru ụjụ
karịa ebe a na-eri na-aṅụ.
Nʼihi na ọnwụ dịịrị mmadụ ọbụla;
ndị dị ndụ kwesiri iburu nke a nʼobi.
Iru ụjụ ka ịchị ọchị mma,
ihu gbarụrụ agbarụ na-enyere obi aka
Onye maara ihe na-eche echiche banyere ọnwụ,
ma onye nzuzu na-eche naanị banyere ikpori ndụ.
Ọ ka mma ige ntị nye mba onye maara ihe
karịa ịṅa ntị nʼabụ ndị na-enweghị uche na-abụ.
Ọchị onye nzuzu
dị ka mkpọtụ nke ogwu na-ere ọkụ na-eme nʼokpuru ite.
Ihe a bụkwa ihe efu.
 
Iji anya ike nara mmadụ ihe na-eme ka onye mara ihe ghọọ onye nzuzu,
iri ngarị na-emerụ obi mmadụ.
 
Ọgwụgwụ ihe ọbụla dị mma karịa mmalite ya!
Ogologo ntachiobi dị mma karịa mpako!
Abụla onye na-ewe iwe ọsịịsọ,
nʼihi na iwe bụ oke ndị nzuzu.
 
10 Asịla, “Gịnị mere ụbọchị gara aga ji dị mma karịa ụbọchị ndị a?”
Nʼihi na ọ bụghị amamihe ị jụ ajụjụ dị otu a.
 
11 Amamihe dịka ihe nketa, bụ ihe dị mma.
Ọ na-abara uru nye ndị na-ahụ anyanwụ anya.
12 Amamihe bụ ndo
dịka ego si bụrụkwa ndo,
ma ụzọ ihe ọmụma ji dị mma karịa bụ nke a:
Amamihe na-echebe ndụ ndị nwere ya.
13 Chee echiche banyere ihe Chineke na-eme.
Mmadụ ọ pụrụ ime ka ọ dịzie adịzie,
bụ ihe Chineke mere ka ọ gbagọọ agbagọ?
14 Mgbe ihe na-agara gị nke ọma, ṅụrịa ọṅụ, nʼihi ọ dịrị gị mma,
ma mgbe mmekpa ahụ batara, mata nke ọma
na Chineke onye na-enye ọnọdụ ọma
makwa ihe banyere ọnọdụ ọjọọ.
Ya mere, o nweghị onye ọbụla nwere ike ịchọpụta
ọdịnihu ya.
15 Ndụ m nʼụwa a bụ ihe efu, ahụla m ihe abụọ ndị a;
onye ezi omume na-anwụ nʼezi omume ya,
ma onye na-emebi iwu na-ebi ogologo ndụ na mmebi iwu ya.
16 Nʼihi ya, abụbigala onye ezi omume oke,
emekwala onwe gị onye mabigara ihe oke.
Gịnị mere i ji achọ igbu onwe gị?
17 Abụbigala onye na-emefe ajọ omume oke,
abụkwala onye nzuzu!
Gịnị ka ị ga-eji nwụọ mgbe oge gị na-erubeghị?
18 Ọ dị mma ijide otu
na-esepụghị aka na nke ọzọ,
onye na-atụ egwu Chineke ga-enweta uru nʼime ha abụọ.
 
19 Amamihe na-eme ka otu onye dị ike
karịa mmadụ iri na-achị otu obodo.
 
20 Gbaa ụwa niile gburugburu, ọ dịghị otu onye bụ onye ezi omume,
ọ dịghị onye na-eme ihe ziri ezi nke na-adịghị eme mmehie mgbe ọbụla.
 
21 Egela ntị nʼihe niile ndị mmadụ na-ekwu,
ị pụrụ ịnụ nkọcha nke ohu gị na-akọcha gị.
22 Gị onwe gị maara
na ọtụtụ oge, ị na-akọchakwa ndị ọzọ.
23 Agbalịsiela m ike inwe nghọta. Ekwuru m sị,
“Aga m abụ onye amamihe,”
ma nke a karịrị m.
24 Amamihe adịghị mfe inweta, ọ dị omimi nke ukwuu;
ọ bụ onye pụrụ ịchọpụta ya?
25 A tụgharịrị uche m ka m ghọta,
iledo na ịchọpụta amamihe na atụmatụ otu ihe niile si dị
na ịghọtakwa nzuzu nke dị na ajọ omume
na ịyị ara nke dị na enweghị uche.
 
26 Achọpụtara m na ọ dị ihe dị ilu karịa ọnwụ,
ihe ahụ bụ nwanyị.
Obi ya dị ka ụgbụ.
Otu a kwa, aka o ji ejikụ gị dị ka ụdọ igwe.
Onye ahụ na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ na-esi nʼaka ya gbapụ,
ma ndị mmehie ka ọ na-enwude nʼọnya ya.
27 “Lee, Ihe a ka m chọpụtara,” ka onye nkuzi kwuru:
“Site nʼịtụkwasị otu ihe nʼelu ibe ya ka m matara isi ihe niile.
28 Mgbe m ka na-achọ
ma achọtaghị m,
nʼetiti puku mmadụ ndị ikom, achọtara m otu onye aka ya dị ọcha,
ma ọ dịghị otu nwanyị m chọtara nʼetiti ha.
29 Achọpụtara m naanị nke a,
Chineke mere ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị ụzọ ha ziri ezi,
ma ha atụgharịala chọrọ ọtụtụ ihe nchepụta gawa.”
 
* 7:1 7:1 Ilu 22:1 7:1 7:1 Maọbụ, mmanụ oke ọnụahịa 7:6 7:6 Mgbe ogwu na-ere ọkụ, na-eme mkpọtụ, na-asụkwa anwụrụ, nke a adịghị eme ka ahụ ndị na anya ọkụ ya nʼoge oyi kporo ọkụ.