9
Ihe na-eche mmadụ niile
Ihe ndị a niile ka m tulere nke ọma nʼobi m, kpebie na ihe ndị ezi omume na ndị maara ihe na-eme dị nʼaka Chineke, ma ọ dịghị onye maara ihe na-echere ha maọbụ ịhụnanya maọbụ ịkpọ asị. Ihe niile na-adakwasị mmadụ niile nʼotu ụzọ ahụ, ma onye ezi omume ma onye ajọ omume, ezi mmadụ na onye na-abụghị ezi mmadụ, onye dị ọcha na onye na-adịghị ọcha, onye na-achụ aja na onye na-adịghị achụ aja.
Dịka ọ dịrị ezi mmadụ,
otu a ka ọ dịrị onye mmehie;
dịka ọ dịrị ndị na-aṅụ iyi,
otu a kwa ka ọ dị nye ndị na-adịghị aṅụ.
Nke a bụkwa ihe ọjọọ na-eme nʼokpuru anyanwụ. Otu ihe ndakwasị dịrị mmadụ niile. Ọzọkwa, obi ụmụ mmadụ jupụtara nʼihe ọjọọ na ịyị ara mgbe ha nọ na ndụ, emesịa ha alakwuru ndị nwụrụ anwụ. Naanị ndị dị ndụ nwere olileanya. Ọ ka mma ịbụ nkịta dị ndụ karịa ịbụ ọdụm nwụrụ anwụ.
Nʼihi na ndị dị ndụ maara nke ọma na ha ga-anwụ,
ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọbụla;
ha enwekwaghị ụgwọ ọrụ ọzọ,
nʼihi na ha bụ ndị echefurula echefu.
Ịhụnanya ha, na ịkpọ asị ha,
na ekworo ha gabigara mgbe ha nwụrụ.
Ha agaghị enwekwa oke
nʼihe ọbụla na-eme nʼokpuru anyanwụ.
Ya mere, gaa nʼihu, jiri ọṅụ rie nri gị, jirikwa ọṅụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ nʼihi na ọ bụ ugbu a ka Chineke nabatara ọrụ gị. Yiri akwa dị ọcha mgbe niile, tee mmanụ na-esi isi ụtọ nʼisi gị.* Bie ndụ obi ụtọ, gị na nwunye gị ị hụrụ nʼanya, ụbọchị niile nke ndụ ihe efu gị nke Chineke nyere gị nʼokpuru anyanwụ, nʼihi na nke a bụ oke dịịrị gị na ndụ ndọgbu onwe gị nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ. 10 Ihe ọbụla ị na-eme, were ike gị niile mee ya, nʼihi na ịrụ ọrụ maọbụ iche echiche, maọbụ ihe ọmụma, maọbụ amamihe adịghị nʼala ndị nwụrụ anwụ. Ebe ahụ kwa ka ị na-aga.
11 Ahụrụ ihe ọzọ nʼokpuru anyanwụ,
ọ bụghị ndị nwere ụkwụ ọsọ na-agbata ihe,
ọ bụkwaghị onye sikarịrị ike na-emeri nʼagha;
ọ bụghị ndị maara ihe ka nri dịrị,
ọ bụghị ndị nwere nghọta ka akụnụba dịrị,
ọzọkwa, ọ bụghị ndị nka ka amara na-adịrị;
kama ọ bụ mgbe na ihe ndaba na-eme ka ihe ndị a dịrị.
12 Nke ka nke, ọ dịghị mmadụ ọbụla maara mgbe oge ya ga-eru:
Ọ dị ka nnụnụ nke mara nʼọnya,
maọbụ azụ e jidere nʼụgbụ.
Dịka ha, ụmụ mmadụ na-adaba nʼọnya nke ihe ọjọọ
mgbe ha na-atụghị anya ya.
Amamihe dị mkpa karịa nzuzu
13 Ahụkwara m ihe ọzọ nʼokpuru anyanwụ, nke a bụ ụdị amamihe nke metụrụ m nʼobi nʼebe ọ dị ukwuu. 14 Ọ dị obodo nke naanị mmadụ ole na ole bi nʼime ya, ma otu eze dị ike chịịrị ndị agha ya bịa ibuso obodo nta a agha. Ndị agha ya gbara obodo a gburugburu na-achọ ịkwatu mgbidi ya. 15 Ma ọ dị otu onye ogbenye bi nʼobodo nta ahụ, onye maara ihe, ọ zọpụtara obodo ahụ site nʼamamihe ya. Ma o nweghị onye chetara ihe banyere ya. 16 Nke a mere m ji sị, inwe amamihe bara uru karịa ịdị ike, ma ọ bụrụ na onye amamihe ahụ bụ onye ogbenye, a ga-eleda ya anya, a gaghị akpọkwa okwu ya ihe.
17 Okwu nke onye maara ihe na-ekwu na nwayọọ ka a na-anụ,
karịa iti mkpu nke onye na-achị achị nʼetiti ndị nzuzu.
18 Amamihe ka ihe agha niile mma,
ma otu onye mmehie na-ala ọtụtụ ezi ihe nʼiyi.
 
* 9:8 9:8 Ihe e ji maara ndị Juu nʼoge mmemme, maọbụ ụbọchị izuike, bụ iyi akwa ọcha na itekwasị mmanụ nʼisi ha.