21
Babilọn, mma agha Chineke
Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, “Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼụzọ Jerusalem, buo amụma megide ụlọnsọ ukwu ahụ. Bukwaa amụma megide ala Izrel sị ala Izrel otu a, ‘Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, Mụ onwe m na-emegide gị. Aga m esite nʼọbọ mịpụta mma agha m, site na gị gbuchapụ ma onye ezi omume na onye ajọ omume. Nʼihi na m na-aga igbuchapụ ndị ezi omume na ndị ajọ omume, mma agha m ga-esite nʼọbọ ya pụta megide onye ọbụla site nʼugwu ruo na ndịda. Mgbe ahụ, mmadụ niile ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị amịpụtala mma agha m site nʼọbọ ya, ọ gaghị amịghachi baa nʼọbọ ọzọ.’
“Nʼihi ya, sụọ ude, nwa nke mmadụ, sụọ ude nʼihu ha nʼọnọdụ oke mwute na obi mgbawa. Mgbe ha jụrụ gị, ‘Gịnị kpatara i ji asụ ude?’ Ị ga-asị, ‘Nʼihi ozi nke na-abịa. Obi niile ga-agbaze site nʼegwu, aka niile ga-akụdakwa; mmụọ niile ga-ada mba,* ikpere niile ga-ede mmiri site nʼamịrị.’ Ọ na-abịa, ọ ghaghị imezu, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.”
Ọzọkwa, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, “Nwa nke mmadụ buo amụma sị, ‘Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru:
“ ‘Lee, mma agha, lee, mma agha,
a mụọla ya, hichakwaa ya.
10 Amụọla ya nʼihi oke ogbugbu nke gaje ịdị,
hichakwaa ya nke ọma ka ọ na-egbu dịka amụma.
“ ‘Anyị ọ ga-aṅụrị ọṅụ na mkpara eze nwa m nwoke Juda? Mma agha na-elelị mkpara niile dị otu a anya.
11 “ ‘E nyere iwu ka e hichazie mma agha ahụ,
ka e jidekwa ya nʼaka.
A mụọla ya, hichazie ya.
E doziela ya maka onye ahụ ga-eji ya laa ndụ nʼiyi.
12 Nwa nke mmadụ, tie mkpu akwa ma kwasie akwa ike,
nʼihi na ọ bụ megide ndị m
ọ bụkwa megide ndịisi Izrel niile.
A na-atụnyere ha mma agha ga-egbu ha,
ha na ndị m.
Nʼihi ya, tie aka gị nʼobi gị.
13 “ ‘Ọnwụnwa aghaghị ịbịa. Ma gịnị ga-eme, ma ọ bụrụ na mkpara eze nke mma agha na-elelị anya, agaghị nʼihu na-adịgide? Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’
14 “Nʼihi ya, buo amụma, nwa nke mmadụ.
Kụkọọ ọbụ aka gị abụọ,
ka mma agha gbuo ugboro abụọ
e, ọ bụladị ugboro atọ.
Ọ bụ mma agha e debere maka ogbugbu,
nke e debere maka oke ogbugbu
nke ga-abịachibido ha gburugburu.
15 Ka obi ha gbazee site nʼegwu,
ka ndị na-ada ada hie nne,
nʼihi na edoziela m mma agha ahụ nʼọnụ ụzọ ama ha niile
maka oke ogbugbu.
Lee, mma agha ahụ na-egbu amụma,
etinyela ya nʼaka onye ga-egbu oke ogbugbu.
16 Gị mma agha, ebe ọbụla ị chọrọ, ebe ọbụla i nwere ike, gbuo onye ọbụla,
ma ọ nọ gị nʼaka nri
ma ọ nọ gị nʼaka ekpe.
17 Mụ onwe m ga-akụkọtakwa ọbụ aka m,
ime ka iwe m jụrụ.
Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola.”
18 Okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 19 “Nwa nke mmadụ mee ụzọ abụọ nke mma agha eze Babilọn ga-eso. Ka ụzọ abụọ ndị a malite nʼotu obodo. Dee ihe ngosi manye ha nʼebe ahụ ụzọ wara abụọ. 20 Mee ka otu nʼime ụzọ ndị ahụ bụrụ ebe mma agha ga-esi bịa megide Raba nke Amọn, ka nke ọzọ megide Juda na Jerusalem, bụ ebe e wusiri ike. 21 Nʼihi na eze Babilọn ga-abịa guzo nʼebe ahụ ụzọ wara abụọ, nʼisi ụzọ abụọ ahụ ịchọ ihe ama. Ọ ga-esite nʼịgba àkụ nke ife nza, jụọ ase site nʼaka arụsị ya niile, nyochakwaa umeju ahụ. 22 Nʼụzọ dị nʼaka nri, ka ihe ịjụ ase banyere Jerusalem ga-esi bịa. Nʼebe ahụ ka ọ ga-ewu ihe niile ha ji etida mgbidi obodo ahụ. Nʼebe ahụ ka ọ ga-anọ nye iwu maka igbuchapụ ndị niile, na iwu ido ihe e ji etipu mgbidi nʼọnụ ụzọ ama niile, na iwu a ga-eji wuo nkwasa agha na mgbidi e ji ebuso ya agha. 23 Ọ ga-adị ha dịka ọjụjụ ase nke na-abaghị uru, nye ndị ahụ ṅụrụ ha iyi, ma ọ ga-echetara ha ihe ọjọọ§ ha mere, dọkpụrụ ha nʼike.
24 “Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru. ‘Ebe ọ bụ na unu esitela na nnupu isi unu mee ka e cheta ajọ omume unu, si otu a na-ekpughe mmehie unu nʼihe niile unu na-eme. Ebe ọ bụ na unu emeela ihe dị otu a, a ghaghị ịdọta unu nʼagha.
25 “ ‘Gị onye rụrụ arụ, onye na-emebi iwu, gị nwa eze nʼIzrel, gị onye ụbọchị ahụhụ ya rurula, 26 ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, yipụ okpueze gị, ya na akwa ị na-atụghị nʼisi. Ihe agaghị adịkwa dịka o si adị na mbụ. A ga-ebuli ndị dị ala, wedata ndị dị elu. 27 Mbibi, mbibi. Aga m eme ka ọ ghọọ ihe e bibiri ebibi. A gaghị eweghachikwa ya ọzọ tutu ruo mgbe onye ahụ o ruuru nʼizi ezi bịara. Ya ka m ga-enyefe ya nʼaka.’
28 “Ma gị onwe gị, Nwa nke mmadụ, buo amụma kwuo, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru megide ndị Amọn nʼihi ịkwa emo ha:
“ ‘Lee mma agha, lee mma agha,
nke a mịpụtara maka oke ogbugbu.
E hichaziela ya mee ka ọ dị nkọ iripịa,
ka ọ na-egbu amụma dịka amụma egbe eluigwe.
29 Nʼagbanyeghị ọhụ ụgha nke a na-ahụ banyere unu,
na a jụtakwala ase ụgha banyere unu,
a ga-etinye ya nʼolu
ndị mmebi iwu ahụ a gaje igbu egbu,
bụ ndị ụbọchị ha rurula,
ndị oge ịta ahụhụ ha zukwara.
 
30 “ ‘Mịghachinụ ya nʼọbọ ya.
Nʼebe ahụ e kere unu
nʼala nna nna unu ha,
Aga m ekpe unu ikpe.
31 Aga m awụkwasị unu ọnụma m,
kukwasịkwa unu ikuku nke oke iwe m.
Aga m ewere unu nyefee nʼaka ndị na-eme ihe ike,
ndị bụ ọka na ịla mmadụ nʼiyi.
32 Unu ga-aghọkwa mmanụ a na-awụnye nʼọkụ.
A ga-awụsịkwa ọbara unu nʼala unu.
Ọ dịkwaghị onye ga-echeta unu ọzọ,
nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola.’ ”
* 21:7 21:7 Maọbụ, ike ga-agwụ mmụọ niile 21:12 21:12 Maọbụ, tie aka nʼapata ụkwụ gị 21:21 21:21 Maọbụ, nʼagbata ụzọ § 21:23 21:23 Ya bụ, ajọ omume ha