30
Abụ akwa nʼihi Ijipt
Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, “Nwa nke mmadụ, buo amụma sịkwa, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu,
“ ‘Kwasienụ akwa ike ma sị,
“Ewoo, nʼihi ụbọchị ahụ!”
Nʼihi nʼụbọchị ahụ adịla nso,
Ụbọchị nke Onyenwe anyị abịala nso,
ụbọchị igwe ojii,
ụbọchị ga-ewetara mba dị iche iche mbibi.
Mma agha ga-abịakwasị Ijipt,
ihe mgbu ga-adakwasị Kush.
Mgbe ndị e gburu egbu ga-abụ aja dị nʼala,
a ga-ekpokọrọkwa akụnụba ya,
mebikwaa ntọala ya. Ala ya ga-abụkwa ihe e bibiri ebibi.
Kush* na Libiya, Lidiya na ndị Arebịa niile gwara ọgwa, Kub na ndị mba ọgbụgba ndụ ahụ, na Ijipt ga-eso daa site na mma agha.
“ ‘Ọ bụ ihe a ka Onyenwe anyị kwuru:
“ ‘Ndị niile na-akwagide Ijipt ga-ada,
nganga niile nke ike ya ga-agwụsịkwa.
Site na Migdol ruo nʼAswan,
ọ bụ site na mma agha ka ha ga-ada nʼime ya.
Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
Ha ga-atọgbọrọ nʼefu,
nʼetiti ala niile tọgbọrọ nʼefu.
Obodo ha niile ga-abụ mkpọmkpọ ebe,
nʼetiti ọtụtụ obodo e bibiri ebibi.
Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị,
mgbe m tinyesịrị ọkụ nʼIjipt,
mgbe m gwepịara ndị niile na-enyere ya aka.
“ ‘Nʼụbọchị ahụ, aga m ezipu ndị ozi ndị ga-eji ụgbọ dị iche iche, ka ha gaa menye ndị Kush egwu, bụ ndị onwe ha jụrụ afọ. Oke egwu ga-ejidekwa ha nʼoge ahụ nʼihi ihe dakwasịrị Ijipt, nʼihi ihe ndị a aghaghị imezu.
 
10 “ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,
“ ‘Aga m esite nʼaka Nebukadneza eze Babilọn
bibie igwe ndị agha Ijipt niile.
11 Ya onwe ya na ndị agha ya, bụ mba kachasị mba niile njọ na-enweghị obi ebere,
ka a ga-akpọbata ka ha bịa bibie ala ahụ.
Ha ga-amịpụta mma agha ha megide Ijipt,
werekwa ozu ndị e gburu egbu tụsasịa nʼala ahụ.
12 Aga m eme ka osimiri Naịl taa. Ọ ga-aghọkwa ala kpọrọ nkụ.
Aga m ewerekwa ala ahụ resi mba ndị ọjọọ.
Aga m ala ala ahụ na ihe niile dị nʼime ya nʼiyi.
Ọ bụkwa ndị mba ọzọ ka m ga-eji mee ya.
Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya.
 
13 “ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,
“ ‘M ga-ala arụsị niile nʼiyi,
mekwaa ka ihe niile a kpụrụ akpụ dị na Memfis kwụsị.
Onye eze agakwaghị adị ọzọ nʼIjipt,
aga m emekwa ka egwu jupụta nʼala ahụ niile.
14 Aga m emekwa ka Patros tọgbọrọ nʼefu.
Aga m etinye ọkụ na Zoan,
ma taa Tibs ahụhụ.
15 M ga-awụkwasị Pelusium ọnụma m,
bụ ebe siri ike nke Ijipt,
m ga-ebipụkwa igwe ndị Tibs niile.
16 Aga m amụnye ọkụ nʼIjipt,
Pelusium ga-anọ nʼoke ihe mgbu.
A ga-eji ike tipịa Tibs.
Memfis ga-anọgidekwa nʼọnọdụ ọjọọ ụbọchị niile.
17 Ụmụ okorobịa Heliopolis na Bubasti
ga-anwụ site na mma agha.
Obodo ndị a niile ga-abụkwa ndị a dọtara nʼagha.
18 Ụbọchị ahụ ga-agba ọchịchịrị na Tapanhis
mgbe m ga-agbaji yoku Ijipt,
nʼebe ahụ ka mpako nke ike ya ga-agwụsị.
Igwe ojii ga-ekpuchi ya,
a ga-adọtakwa obodo nta ya niile nʼagha.
19 Aga m eme ka Ijipt taa ahụhụ dị ukwuu,
ka ha mata nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”
Aka Fero agbajiela
20 O ruo, nʼafọ nke iri na otu ya, nʼụbọchị nke asaa, nʼọnwa nke mbụ, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 21 “Nwa nke mmadụ, agbajiela m ogwe aka Fero, eze Ijipt. Lee, o nwebeghị onye gbara ya ọkpụkpụ, ma ọ bụkwanụ kee ya ihe, ka o sie ike ọzọ ijide mma agha. 22 Nʼihi ya, nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: Lee, mụ onwe m na-emegide Fero bụ eze Ijipt. Aga m agbaji ogwe aka ya abụọ, ma nke siri ike ma nke gbajiri agbaji na mbụ. Aga m emekwa ka mma agha ya si nʼaka ya dapụ. 23 Aga m achụsa ndị Ijipt nʼetiti mba niile tụsaakwa ha nʼobodo niile, 24 meekwa ka ogwe aka abụọ nke eze Babilọn sie ike. Aga m etinye mma agha m nʼaka ya, ma ogwe aka abụọ nke Fero ka m ga-agbajisi. Mgbe ahụ, Fero ga-asụ ude nʼihu eze Babilọn dịka onye e merụrụ ahụ. 25 Aga m eme ka ogwe aka abụọ nke eze Babilọn sie ike; ma ogwe aka Fero ga-akpọnwụ. Mgbe ahụ, ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m tinyere mma agha nʼaka eze Babilọn, na mgbe o setịpụrụ ya imegide Ijipt. 26 Aga m achụsa ndị Ijipt nʼetiti mba niile, fesaa ha nʼala niile. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”
* 30:5 30:5 Ya bụ, Itiopia 30:6 30:6 Ka a ga-eji gbuchapụ ha 30:15 30:15 Maọbụ, Sin