2
Ọmụmụ Mosis na mgbapụ ya
Nʼoge a, otu nwoke onye Hibru si nʼebo Livayị, gakwara lụọ otu nwaada onye Livayị. Nwanyị a tụụrụ ime, mụọ otu nwa nwoke. Mgbe ọ hụrụ na nwa ọhụrụ ahụ mara mma, o zoro ya nʼụlọ ọnwa atọ. Mgbe ọ na-enweghịkwa ike izo nwantakịrị a gaa nʼihu, o jiri ahịhịa papịrọs* kpaa nkata, were korota tee nʼahụ nkata ahụ niile igbochi mmiri ịbata nʼime ya. O kunyere nwantakịrị ahụ nʼime ya buru nkata ahụ debe ya nʼakụkụ osimiri Naịl ebe ahịhịa mmiri na-eto. Nwanne nwantakịrị ahụ, nke nwanyị, gakwara guzo nʼebe dị anya na-eche nwantakịrị ahụ nche, ịhụ ihe ga-eme ya.
Ọ dịghị anya, ada Fero bịara nʼakụkụ osimiri Naịl ahụ ịsa ahụ. Mgbe ọ nọ na-asa ahụ, ụmụ agbọghọ na-ejere ya ozi malitere ịgagharị nʼakụkụ osimiri Naịl. Ma ada Fero lepụrụ anya hụ nkata ahụ nʼetiti riidi, zie otu nʼime ohu ya nwanyị ka ọ gaa bute ya. Mgbe o bupụtara ya, meghee ya, ada Fero hụrụ nwantakịrị ahụ ka ọ na-akwa akwa. O nwere ọmịiko nʼebe nwantakịrị ahụ nọ. Ọ sịrị, “Nwatakịrị a ga-abụrịrị otu nʼime ụmụ ndị Hibru.”
Mgbe ahụ, nwanne nwanyị nwantakịrị a jụrụ ada Fero sị, “Ọ bụ m gaa chọọrọ gị otu nwanyị nʼime ndị inyom Hibru ka ọ na-elekọtaara gị nwantakịrị a anya?”
Ada Fero zaghachiri sị, “Ee, gaa mee otu ahụ.” Nwaagbọghọ ahụ gara ngwangwa nʼụlọ ha kpọọ nne nwantakịrị ahụ. Mgbe ha bịaghachiri, ada Fero gwara nne nwantakịrị ahụ sị ya, “Kuru nwantakịrị a, gaa zụpụtara m ya. Aga m akwụ gị ụgwọ nke ọma.” Ya mere, nwanyị ahụ kuuru nwantakịrị ahụ, gaa zụọ ya. 10 Mgbe nwantakịrị ahụ tolitere, nne ya kulaara ya ada Fero, ka ọ bụrụ nwa ada Fero. Aha ada Fero gụrụ ya bụ Mosis, nʼihi ọ sịrị, “Esi m na mmiri gụpụta ya.”
Mosis agbapụ ọsọ
11 Otu ụbọchị, mgbe Mosis toro, ọ pụrụ gaa nʼebe ụmụnna ya nọ, ilele ha mgbe ha nọ na-arụ ọrụ ike ha. Ọ hụrụ otu onye Ijipt ka ọ na-eti onye Hibru ihe, bụ otu nʼime ụmụnna ya. 12 Mosis lere anya nʼakụkụ abụọ. Mgbe ọ hụrụ na ọ dịghị onye na-ele ya anya, o gburu onye Ijipt ahụ, lie ya nʼime aja. 13 Nʼechi ya, Mosis pụrụ hụ ndị Hibru abụọ ka ha na-alụ ọgụ. Mosis jụrụ onye nke ikpe mara ajụjụ sị ya, “Gịnị mere i ji si otu a na-eti nwanna gị ihe?”
14 Ma onye ahụ jụrụ Mosis ajụjụ sị, “Onye mere gị onyeisi na onye ikpe nʼetiti anyị? Ị na-achọ igbu m dị ka i si gbuo onye Ijipt ahụ?” Mgbe ahụ Mosis tụrụ ụjọ. O kwuru nʼime onwe ya sị, “Ndị mmadụ amatala banyere ihe ahụ m mere.”
15 Mgbe Fero nụrụ ihe Mosis mere, ọ gbalịrị igbu Mosis. Ma Mosis si nʼihu Fero gbapụ ọsọ gbaga ala Midia. Nʼebe ahụ ọ gara nọdụ ala nʼakụkụ olulu mmiri. 16 Ma o nwere otu onye nchụaja obodo Midia mụtara ụmụ agbọghọ asaa. Nʼoge a, ha bịara iseta mmiri na ịgbanye ya nʼime ihe ịgbanye mmiri anụ ụlọ maka inye igwe anụ ụlọ nna ha mmiri. 17 Ma ụfọdụ ndị na-azụ atụrụ bịara chụpụ ha. Mosis biliri ọtọ, bịa napụta ha, nyere ha aka nye igwe anụ ụlọ ha mmiri.
18 Ha lọghachikwutere nna ha, Reuel, onye jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji lọta nʼoge taa?”
19 Ha zara nna ha sị, “Otu onye Ijipt napụtara anyị site nʼaka ndị ọzụzụ atụrụ. O setaara anyị mmiri, nyekwa igwe anụ ụlọ anyị mmiri.”
20 Nna ha jụrụ ha sị, “Olee ebe ọ nọ? Gịnị mere unu ji hapụ ya nʼebe ahụ? Gaanụ kpọọ ya ka o soro anyị rie nri.”
21 Mosis nabatara oku ahụ Reuel kpọrọ ya ka ha na ya biri. O sokwara ha biri. Reuel kpọnyere Mosis Zipọra, otu nwa ya nwanyị, ka ọ bụrụ nwunye ya. 22 Zipọra mụtara nwa nwoke, onye Mosis kpọrọ aha ya Geshọm. Nʼihi na Mosis sịrị, “Abụ m onye ọbịa nʼala ndị ọzọ.”
23 O ruo, mgbe ọtụtụ ụbọchị gara, Fero eze Ijipt nwụrụ. Nʼoge a, ụmụ Izrel nọ na-asụ ude nʼime ọnọdụ ịbụ ohu ha. Ha kwara akwa nke ukwuu. Akwa ha kwara ka e nyere ha aka nʼihi ọnọdụ ịbụ ohu ha ruru Chineke ntị. 24 Chineke nụrụ ịsụ ude ha. O chetara ọgbụgba ndụ ahụ ya na Ebraham, na Aịzik, na Jekọb gbara. 25 Chineke hụrụ ụmụ Izrel, ihe banyere ha metukwara ya nʼobi.
* 2:3 2:3 Bụ ahịhịa na-epu nʼakụkụ mmiri 2:15 2:15 Midian bụ otu nʼime ụmụ Ebraham mụtara nʼikpeazụ. Jen 25:2 Ndị Midia na-ebi nʼakụkụ ugwu nke Ugwu Saịnaị. 2:18 2:18 Reuel bụ aha ọzọ e ji mara Jetro ọgọ Mosis. Ọpụ 3:1; Ọnụ 10:29