23
Ikpe ziri ezi na inwe obi ebere
“Ị gaghị agbasa akụkọ ụgha ọbụla. Esokwala mmadụ ọjọọ nwekọọ ihe ọbụla site nʼịgba ama ị maara na ọ bụghị eziokwu.
“Ị gaghị eso igwe mmadụ mee ihe ọjọọ. Mgbe ị na-agba akaebe nʼụlọikpe, ị gaghị esonye igwe mmadụ ndị na-atụgharị ikpe ziri ezi. Nʼebe nwa ogbenye nọ, ị gaghị ekpelara ya nʼoge ikpe nʼihi na ọ bụ nwa ogbenye.
“Ọ bụrụ na ị hụ ehi, maọbụ ịnyịnya ibu nke kpafuru akpafu, ọ bụrụkwa na ọ bụ nke onye iro gị, duru ya dulatara onye iro gị ahụ. Ọ bụrụ na ị hụ onye kpọrọ gị asị ka ọ na-agbalị iwelite ịnyịnya ibu ya nke dara nʼihi ibu dị arọ o bu, elefula ya anya, kama gaa nyere ya aka bulite ịnyịnya ahụ.
“Ewezugala ikpe ziri ezi nʼebe ndị ogbenye nọ, nʼihi ọnọdụ ogbenye ha. Ebola mmadụ ibe gị ebubo ụgha. Esonyekwala gbuo onye aka ya dị ọcha, maọbụ onye na-eme ihe ziri ezi. Nʼihi na mụ onwe m agaghị ahapụ onye na-emebi iwu na-ataghị ya ahụhụ kwesiri ya.
“Erikwala ngarị, nʼihi na iri ngarị na-eme ka ndị na-ahụ ụzọ kpuo ìsì, meekwa ka okwu onye aka ya dị ọcha gbagọọ agbagọ.
“Abụkwala onye na-emegbu ndị ọbịa, nʼihi na ị maara ihe banyere ọnọdụ ndị ọbịa nke ọma. Gị onwe gị bụrịị ọbịa nʼIjipt.
Iwu maka Ụbọchị nke asaa na afọ nke asaa
10 “Afọ isi ka ị ga-agha mkpụrụ nʼala ubi gị, ghọọkwa ihe omume ya. 11 Ma nʼafọ nke asaa, arụla ọrụ ọbụla nʼala ahụ ọzọ, hapụ ka ala ahụ zuru ike. Mgbe ahụ ndị ogbenye nʼetiti unu ga-aga nʼebe ahụ weta ihe oriri. Mkpụrụ ndị ọzọ fọdụrụ ga-adịrị ụmụ anụ ọhịa dị iche iche. Iwu ndị a ga-adịrị ubi vaịnị na ubi oliv unu niile.
12 “Ị ga-arụ ọrụ gị niile nʼime ụbọchị isii. Ị ga-ezukwa ike nʼụbọchị nke asaa. Izuike a ga-adịkwara ehi gị na ịnyịnya ibu gị, na ndị ohu gị nọ nʼezinaụlọ gị na ndị ọbịa niile bi nʼetiti unu.
13 “Kpachapụnụ anya hụ na unu mezuru ihe niile ndị a m gwara unu. Unu akpọkwala chi ndị ọzọ aha. Unu ekwupụtakwala ihe banyere ha nʼọnụ unu.
Mmemme atọ a na-eme kwa afọ
14 “Ugboro atọ nʼafọ ka unu ga-emere m mmemme a.
15 “Meenụ Mmemme Achịcha na-ekoghị eko, ụbọchị asaa ka unu ga-eri achịcha nke e jighị ihe na-eko achịcha mee. Unu ga-eri ya na mgbe a kara aka, nʼọnwa Abib. Nʼihi na ọ bụ nʼọnwa ahụ ka unu si nʼala Ijipt pụta.
“Ọ dịghị onye ọbụla ga-agba aka efu bịa nʼihu m.
16 “Mee Mmemme Owuwe Ihe ubi,* bụ nke ị ga-eji mkpụrụ mbụ nke ihe niile ị kụrụ nʼubi unu.
“Meekwanụ Mmemme Nchịkọta Ihe, nʼọgwụgwụ afọ ọbụla. Mgbe unu si nʼubi na-achịbata mkpụrụ ubi unu niile.
17 “Ugbo atọ nʼafọ ka ndị ikom niile ga-abịa chee onwe ha nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.
18 “Unu etinyekwala ihe ọbụla nke nwere ihe na-eko achịcha nʼime ya, mgbe unu na-achụ ọbara nke aja nʼihu m.
“Maọbụ hapụ abụba nke aja mmemme m ka ọ dịgide ruo ụtụtụ.
19 “Wetanụ mkpụrụ mbụ niile nke ala ubi unu, bụ ndị kachasị mma, nʼụlọ Onyenwe anyị bụ Chineke unu.
“Unu esikwala nwa ewu nʼime mmiri ara nne ya.§
Nkwa onye ga-edu ha
20 “Lee, ana m eziga mmụọ ozi nʼihu unu, ichebe unu nʼije unu nakwa ịkpọbatakwa unu nʼebe ahụ M doziri nye unu. 21 Geenụ ya ntị, nụrụkwa olu ya. Unu enupukwarala ya isi, nʼihi na ọ gaghị agbaghara njehie unu niile, nʼihi na Aha m dị nʼime ya. 22 Ọ bụrụ na unu elezie anya nke ọma, gee ya ntị, mee ihe niile m nyere unu nʼiwu, mgbe ahụ, mụ onwe m ga-abụkwara ndị iro unu onye iro, megidekwa ndị na-emegide unu. 23 Mmụọ ozi m ga-ejekwa nʼihu unu, ịkpọbatakwa unu nʼala ndị Amọrait, na ndị Het, na ndị Periz, na ndị Kenan, na ndị Hiv, na ndị Jebus. Aga m ehichapụ obodo ndị a niile. 24 Unu agaghị akpọ isiala nye chi ha niile. Unu efekwala ha, maọbụ gbasoro omenaala ha. Kama, kwatuonụ ha. Tipịasịakwanụ ebe nkume nsọ* niile nke chi ha. 25 Ma unu ga-efe Onyenwe anyị bụ Chineke unu. Mgbe ahụ, ngọzị ya ga-adịkwasị nri unu na mmiri ọṅụṅụ unu. Aga m ewezugakwa ọrịa nʼetiti unu. 26 Nwanyị aga na nwanyị ime ya na-apụ agaghị adị nʼala unu. Aga m emekwa ka unu nwee ogologo ndụ.
27 “Aga m ezipu oke ụjọ m ka ọ nọrọ unu nʼihu tinye ọgbaaghara nʼime mba niile unu ga-ezute. Aga m eme ka ndị iro unu tụgharịa gbaa ọsọ. 28 Ọzọkwa, aga m eziga ebu ka ọ chụpụ ndị Hiv na ndị Kenan na ndị Het site nʼụzọ unu. 29 Ma agaghị m achụpụ ha nʼotu afọ, nʼihi na nke a ga-eme ka ala ahụ niile tọgbọrọ nʼefu, ụmụ anụ ọhịa a baa ụba karịa unu. 30 Ma aga m achụpụ ha nwantịntị nwantịntị, tutu ruo oge unu ga-adị ọtụtụ, mgbe ọnụọgụgụ unu ga-akarị nke ha ukwuu, mgbe unu ga-ejupụta ala ahụ niile.
31 “Aga m etinye oke ala unu site nʼOsimiri Uhie ruo nʼosimiri Mediterenịa, sitekwa nʼọzara ruo nʼosimiri Yufretis. Aga m enyefe ndị niile bi nʼala ahụ nʼaka unu. Unu ga-achụpụkwa ha. 32 Unu na ha agbala ndụ ọbụla. Unu na chi ha enwekwala mmekọ ọbụla. 33 Unu ekwela ka ha biri nʼala unu, ma ọ bụghị ya, ha ga-eme ka unu mehie megide m, nʼihi nʼife chi ha dị iche iche aghaghị ịbụrụ unu ihe ịma nʼọnya.”
* 23:16 23:16 Aha ọzọ a na-akpọ mmemme owuwe ihe ubi bụ mmemme Izu, gụọ ya nʼakwụkwọ Ọpụ 34:22, nʼihi na ọ bụ izu asaa, mgbe Mmemme Ngabiga gafesịrị ka a na-eme ya. Ọ bụkwa nʼọgwụgwụ owuwe ihe ubi. 23:16 23:16 Mmemme nchịkọta mkpụrụ bụ ihe na-egosi na e wechaala ihe ubi. Dit 16:13 23:18 23:18 Ya bụ chi ọbụbọ § 23:19 23:19 Otu nʼime omenaala dị nʼusoro ofufe ndị Kenan bụ isi nwa ewu nʼime mmiri ara nne ya. Dit 14:21 * 23:24 23:24 Ebe a manyere ogidi, ka e ji amata ebe bụ ebe ịchụ aja ha.