27
Ebe ịchụ aja
“Ị ga-eji osisi akashia wuo ebe ịchụ aja. Ịdị elu ya ga-abụ otu mita na iri sentimita anọ. Ogologo ya na obosara ya ga-aha nʼotu, mita abụọ na iri sentimita atọ, mita abụọ na iri sentimita atọ. Rụnye mpi nʼakụkụ anọ nke ebe ịchụ aja ahụ nʼotu nʼotu. Mee ka mpi ndị a na ebe ịchụ aja ahụ bụrụ ihe e jikọtara nʼotu. Jiri bronz machie ebe ịchụ aja a. Jiri bronz kpụọ ngwongwo niile dị iche iche, ya bụ efere ikpofu ntụ, shọvel ya niile, efere ịkwọsa mmiri niile, ngaji eze ịdụta anụ na efere ndị e ji agụ ọkụ. Ị ga-eme ngịga mbadamba, ihe ọkpụkpa bronz, meekwa mgbaaka bronz nke ga-adị nʼakụkụ anọ nke ngịga ahụ. Tinye ya nʼokpuru oghere dị nʼebe ịchụ aja ahụ. Tinye ya ka ọ dịrị nʼetiti ebe ịchụ aja ahụ. Jiri osisi akashia mee mkpara osisi maka ebe ịchụ aja ahụ, were bronz machie ha. A ga-eme ka mkpara ahụ baa nʼime mgbaaka ndị ahụ, ka ha dị nʼakụkụ abụọ nke ebe ịchụ aja ahụ mgbe ọbụla a na-ebu ya. Jiri obodobo osisi rụọ ebe ịchụ aja ahụ, ka o nwee oghere nʼime, dịka igbe. Ị ga-arụ ya dịka e gosiri gị nʼelu ugwu ahụ.
Ogige ụlọ nzute
“Ị ga-arụkwa ogige maka ụlọ nzute ahụ. Nʼakụkụ ndịda ya ga-adị iri mita anọ na ise nʼogologo. Ọ ga-enwekwa akwa mgbochi nke e ji ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee. 10 Iri ogidi abụọ ga-adị na iri ebe ndọkwasị abụọ nke e ji bronz kpụọ. Anya nko ogidi ndị ahụ ha na ihe ikegide ha ga-abụ ọlaọcha. 11 Otu a kwa, akụkụ ugwu ga-adịkwa iri mita anọ na ise. Ọ ga-enwe akwa mgbochi, nwekwa iri ogidi abụọ na iri ebe ndọkwasị abụọ nke e ji bronz kpụọ, ya na anya nko nke ọlaọcha na ihe e ji ekegide ha nʼogidi ahụ.
12 “Akụkụ ọdịda anyanwụ nke ogige ahụ ga-adị iri mita abụọ na atọ nʼobosara. Ọ ga-enwe akwa mgbochi, na ogidi iri na ebe ndọkwasị iri. 13 Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, ebe anwụ na-awalite, akwa mgbochi ahụ ga-adịkwa iri mita abụọ na atọ nʼobosara. 14 Akwa mgbochi nke ogologo ya dị mita isii na sentimita iri asatọ ga-adị nʼotu akụkụ nke ọnụ ụzọ mbata ahụ. O nwere ogidi atọ na ebe ndọkwasị atọ. 15 Otu a kwa, akwa mgbochi nke ịdị ogologo ya dị mita asaa ga-adị nʼakụkụ nke ọzọ. Ọ ga-enwekwa ogidi atọ na ebe ndọkwasị atọ.
16 “Banyere ọnụ ụzọ mbata nke ogige ahụ, mee akwa mgbochi ga-adị mita itoolu nke e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, akaọrụ nke onye na-akpa ihe ịchọ mma. Ọ ga-enwe ogidi anọ na ihe ndọkwasị anọ. 17 Ogidi niile dị gburugburu ogige ahụ ga-enwe ihe njikọta ọlaọcha na nko, tinyere ebe ndọkwasị bronz. 18 Ogologo ogige ahụ ga-abụ iri mita anọ na ise. Ebe obosara ya ga-adị iri mita abụọ na atọ. Ọ ga-enwe akwa mgbochi nke ịdị elu ya dị iri mita abụọ na atọ, nke e ji ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee, nwekwa ebe ndọkwasị bronz. 19 Ngwongwo niile nke e ji eje ozi nʼụlọ nzute ahụ, ihe ọbụla bụ ọrụ ha, tinyere ǹtu ya niile na nke ogige ahụ, ga-abụ ihe e ji bronz rụọ.
Mmanụ ịmụ ọkụ
20 “Nye ndị Izrel niile iwu ka ha wetara gị mmanụ oliv asụrụ asụ nke a na-agwaghị ihe maka itinye nʼiheọkụ ime ka ọkụ oriọna na-enwu mgbe niile. 21 Nʼime ụlọ nzute ahụ, na mpụta nke akwa mgbochi nke kpuchiri igbe Ihe Ama ahụ, Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eme ka oriọna ndị ahụ dị nʼihu Onyenwe anyị, na-enwu ọkụ, site nʼuhuruchi ruo nʼụtụtụ. Nke a bụ ụkpụrụ ga-adịgide nʼetiti ndị Izrel nye ọgbọ niile dị nʼihu.