40
Nguzo e guzobere ụlọ nzute
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Guzobe ụlọ nzute ahụ nʼụbọchị mbụ nke ọnwa mbụ. Dọnye igbe ọgbụgba ndụ nke Ihe Ama ahụ nʼime ya. Konyekwa akwa mgbochi nke ga-ezo ya. Webata tebul ahụ, na ngwongwo dị nʼelu ya, webatakwa ihe ịdọba oriọna ahụ. Mụnyekwa oriọna ndị ahụ ọkụ. Doo ebe ịchụ aja ọlaedo ahụ nke e mere maka ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼihu igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ. Konyekwa akwa mgbochi nke kwesiri ịdị nʼọnụ ụzọ e si abata nʼime ụlọ nzute ahụ.
“Doo ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ nʼihu ọnụ ụzọ ịbata nʼụlọ nzute bụ ụlọ ikwu ahụ. Dọnye efere ukwu ịsa mmiri ahụ nʼetiti ụlọ nzute na ebe ịchụ aja ahụ. Gbajukwaa ya mmiri. Guzobe ogige gburugburu ụlọ nzute ahụ. Konyekwa akwa mgbochi nʼọnụ ụzọ ogige ahụ.
“Were mmanụ nsọ ahụ tee ụlọ nzute ahụ, ya na ihe niile dị nʼime ya, si otu a doo ha nsọ ma ngwongwo ịchọ mma ya niile. Ọ ga-abụ ebe dị nsọ. 10 Mgbe ahụ, tee ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ mmanụ ya na ihe ya niile e ji eje ozi. Doo ebe ịchụ aja ahụ nsọ, ọ ga-abụkwa ebe dịkarịsịrị nsọ. 11 Tekwaa efere ukwu ịsa mmiri ahụ na ụkwụ ya mmanụ. Doo ha nsọ.
12 “Kpọbata Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Jiri mmiri saa ha ahụ nʼebe ahụ. 13 Yikwasị Erọn uwe nsọ ya. Tekwaa ya mmanụ, ido ya nsọ maka i jere m ozi dịka onye nchụaja. 14 Mekwaa ka ụmụ ya ndị ikom bịaruo nso, yikwasịkwa ha uwe ime ahụ. 15 Tee ha mmanụ dịka i si tee nna ha, ime ka ha bụrụ ndị na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja. Otite mmanụ ha ga-abụ nye ọrụ nchụaja ha nke ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.” 16 Mosis mezuru ihe niile dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu ime.
17 O ruo, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa mbụ, nʼafọ nke abụọ, e mere ka ụlọ nzute ahụ guzo ọtọ. 18 Mosis mere ka ụlọ nzute ahụ guzo ọtọ site nʼitinye mbudo ibo ya niile, ụkwụ ya na mkpọrọ osisi ya niile nʼọnọdụ ha. 19 Emesịa, ọ gbasapụrụ ihe mkpuchi nʼelu ụlọ nzute ahụ, tụkwasịkwa okpukpu ihe mkpuchi nke abụọ nʼelu ya dịka Onyenwe anyị nyere ya iwu.
20 O tinyere Ihe Ama nʼime igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Emesịa, ọ tụkwasịkwara mkpara e ji ebu igbe ahụ nʼakụkụ igbe ahụ, were okwuchi igbe ahụ, nke bụ Oche Ebere ahụ, kpuchie igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ. 21 Emesịa, o bubatara igbe ahụ nʼime ụlọ nzute ahụ, kwụnyekwa akwa mgbochi nke mgbochi, kewapụ igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
22 Mosis dọnyere tebul ahụ nʼakụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ, na mpụta nke akwa mgbochi ahụ. 23 Ọ dọkwasịrị achịcha ahụ a na-edo nʼihu Onyenwe anyị nʼelu tebul ahụ, dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
24 Ọ dọkwasịrị ihe ịdọba oriọna ahụ nʼime ụlọ nzute nʼakụkụ tebul ahụ, nʼakụkụ ndịda nke ụlọ nzute ahụ. 25 Ọ mụnyere oriọna ndị ahụ nʼihu Onyenwe anyị dịka Onyenwe anyị si nye nʼiwu.
26 Mosis debere ebe ịchụ aja ọlaedo ahụ nʼime ụlọ nzute nso nso ebe akwa mgbochi ahụ dị, 27 surekwaa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ya, dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
28 Ọ kwụbara akwa mgbochi nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. 29 Debekwa ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ nso ọnụ ụzọ ịba ụlọ nzute ahụ. O surekwara aja nsure ọkụ nʼelu ya, na aja onyinye mkpụrụ ọka dịka Onyenwe anyị si nye ya nʼiwu.
30 Ọ dọbara efere ịsa mmiri ahụ nʼetiti ụlọ nzute na ebe ịchụ aja, wụjuo ya mmiri, maka iji sachaa ihe. 31 Mosis, na Erọn, na ụmụ ya ndị ikom na-eji ya akwọcha aka ha, sakwaa ụkwụ ha. 32 Mgbe ọbụla ha na-abanye nʼụlọ nzute na mgbe ha na-abịa nso ebe ịchụ aja, ha na-asacha, dịka Onyenwe anyị nyere ya Mosis nʼiwu.
33 Mosis guzobere ogige ahụ gburugburu ụlọ nzute ahụ na ebe ịchụ aja ahụ. O konyekwara akwa mgbochi nʼụzọ mbata nke ogige ụlọ nzute ahụ. Otu a, Mosis rụzuru ọrụ niile ahụ.
Ebube Onyenwe anyị
34 Mgbe ahụ, igwe ojii kpuchiri ụlọ nzute ahụ, ebube Onyenwe anyị jupụtakwara nʼime ya. 35 Mosis nʼonwe ya enweghị ike ịbanye nʼime ụlọ nzute ahụ nʼihi igwe ojii kpuchiri elu ya na ebube Onyenwe anyị jupụtara nʼụlọ nzute ahụ.
36 Nʼime njegharị ha niile, mgbe ọbụla igwe ojii ahụ si nʼelu ụlọ nzute ahụ bilie, mgbe ahụ ka ụmụ Izrel na-ebuli njem. 37 Ma ọ bụrụ na igwe ojii ahụ ebilighị, ụmụ Izrel adịghị ebulikwa njem tutuu ruo mgbe o biliri. 38 Igwe ojii Onyenwe anyị ahụ na-anọgide nʼelu ụlọ nzute ahụ nʼehihie ma nʼabalị, ọkụ na-esi nʼime ya na-enwupụta. Ndị Izrel niile na-ahụkwa ya anya ụbọchị niile nke ha jegharịrị nʼọzara.