6
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Ugbu a, ị ga-ahụ ihe m ga-eme Fero. Nʼihi ike aka m, ọ ga-ezipụ ha. Nʼihi ike aka, ọ ga-achụpụ ha site nʼala ya.”
Chineke gara nʼihu gwa Mosis sị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.” Egosiri m Ebraham na Aịzik na Jekọb onwe m dịka Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile. Ma ọ dịghị mgbe m mere ka ha mata aha m dịka Onyenwe anyị. Emere m ka ọgbụgba ndụ m guzosie ike nʼetiti mụ na ha, ọgbụgba ndụ nke inye ha ala Kenan ebe ha biri dịka ndị ọbịa. Ugbu a, anụla m ịsụ ude ụmụ Izrel, bụ ndị ahụ ndị Ijipt mere ka ha bụrụ ndị ohu. Echetakwala m ọgbụgba ndụ m.
“Ya mere, gwa ụmụ Izrel, ‘Abụ m Onyenwe anyị. Aga m akpọpụta unu site nʼọnọdụ ịbụ ohu ndị Ijipt. Aga m eme ka unu nwere onwe unu site nʼọnọdụ ịbụ ndị ohu nye ha. Aga m eji aka ike m nke m ga-esetipụ, ya na ihe ngosipụta dị ukwuu nke ikpe ikpe m, gbapụta unu. Mgbe ahụ, aga m ewere unu ka unu bụrụ ndị m. Aga m abụ Chineke unu. Unu ga-amata na m bụ Onyenwe anyị, onye kpọpụtara unu site nʼaka ịbụ ohu nʼala Ijipt. Aga m akpọbata unu nʼala ahụ m weliri aka m elu, ṅụọ nʼiyi, nye Ebraham, na Aịzik, na Jekọb, ime ka ọ bụrụ ihe nketa unu. Abụ m Onyenwe anyị.’ ”
Mosis gwara ụmụ Izrel ihe ndị a, ma ha egeghị ntị nʼihi ịda mba nke obi ha na ahụhụ sitere na ndọgbu nʼọrụ ha.
10  Onyenwe anyị gwara Mosis okwu ọzọ sị, 11 “Gaa gwa Fero eze Ijipt, ka ọ hapụ ụmụ Izrel ka ha pụọ nʼala ya.”
12 Mosis kwuru nʼihu Onyenwe anyị sị, “Mgbe ụmụ Izrel na-aṅaghị m ntị, olee otu Fero ga-esi ṅaa m ntị? Nke ka nke, enweghị m ike ikwu okwu nke ọma.”
Agbụrụ Mosis na Erọn
13  Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu banyere ụmụ Izrel na banyere Fero eze Ijipt. O nyere ha iwu sị ha site nʼala Ijipt kpọpụta ụmụ Izrel.
 
14 Ndị a bụ aha ndịisi ebo Izrel niile.
 
Ụmụ ndị ikom Ruben, ọkpara Izrel bụ,
Hanok na Palu, Hezrọn na Kami.
Ndị a bụ agbụrụ Ruben.
 
15 Ụmụ ndị ikom Simiọn bụ,
Jemuel, Jamin, Ohad, Jakin, Zoha na Shaul (onye nne ya bụ onye Kenan).
Ndị a bụ agbụrụ Simiọn.
 
16  *Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Livayị nʼusoro e si mụọ ha:
Geshọn, Kohat na Merari.
Livayị nʼonwe ya gbara narị afọ na iri afọ atọ na asaa mgbe ọ nwụrụ.
17 Ụmụ ndị ikom Geshọn, nʼagbụrụ ha,
bụ Libni na Shimei, nʼusoro ezinaụlọ ha.
18 Ụmụ ndị ikom Kohat bụ,
Amram, Izha, Hebrọn na Uziel.
Kohat gbara narị afọ na iri afọ atọ na atọ mgbe ọ nwụrụ.
19 Ụmụ ndị ikom Merari bụ
Mahali na Mushi.
Ndị a niile si nʼagbụrụ Livayị, dịka ihe e dere banyere ha si dị.
 
20 Amram lụrụ Jokebed, nwanne nna ya. Erọn na Mosis bụ ụmụ ha ndị ikom.
Ma Amram gbara narị afọ na iri afọ atọ na asaa mgbe ọ nwụrụ.
21 Ụmụ ndị ikom Izha bụ
Kora, Nefeg na Zikri.
22 Ụmụ ndị ikom Uziel bụ,
Mishael, Elzafan na Sitri.
23 Erọn lụrụ Elisheba, nwa Aminadab, na nwanne nwanyị Nashọn. Ụmụ ha bụ, Nadab, na Abihu, Elieza na Itama.
 
24 Ụmụ ndị ikom Kora bụ,
Asịa, Elkena na Abiasaf.
Ndị a bụ ndị ikwu Kora.
 
25 Elieza, nwa Erọn lụrụ otu nʼime ụmụ Putiel, onye mụtaara ya Finehaz.
 
Ndị a bụ aha ndịisi ezinaụlọ Livayị dịka ikwu ha si dị.
 
26 Ọ bụkwa Mosis na Erọn ka Onyenwe anyị gwara okwu sị, “Sitenụ nʼala Ijipt dupụta ụmụ Izrel dịka ọnụọgụgụ ha si dị.” 27 Ha bụ ndị gwara Fero, eze Ijipt okwu banyere ime ka ụmụ Izrel site nʼala Ijipt pụọ. Ọ bụkwa otu Mosis na Erọn ahụ.
Erọn ga-ekwuchitere Mosis ọnụ ya
28 Otu ụbọchị, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼIjipt, 29 ọ sịrị ya, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, gaa gwa Fero eze Ijipt ihe niile m gwara gị.”
30 Mosis kwuru nʼihu Onyenwe anyị sị, “Lee, abụ m onye na-adịghị ekwuzi okwu nke ọma, gịnị mere Fero ga-eji gee ntị nʼihe m ga-agwa ya?”
* 6:16 6:16 Nʼusoro ọmụmụ a, ọ bụ naanị ndị ikom atọ e buru ụzọ mụọ ka a kpọrọ aha. Mosis na Erọn so na ndị ikom atọ Amram bụ ụzọ mụta.