10
Usoro ọmụmụ ụmụ Noa
Ndị a bụ akụkọ banyere Shem, Ham na Jafet, ụmụ ndị ikom atọ Noa mụrụ. Ha onwe ha mụtara ụmụ nke aka ha, mgbe uju mmiri gafesịrị.
Ụmụ Jafet
Ụmụ ndị ikom Jafet bụ:
Goma, Magog, Madai, Javan, Tubal, Meshek na Tiras.
Ụmụ ndị ikom Goma bụ:
Ashkenaz, Rifat na Togama.
Ụmụ ndị ikom Javan bụ:
Elisha, Tashish, Kitim na Rodanim. (Site nʼagbụrụ ndị a bi nʼakụkụ mmiri ka e nwetara mba dị iche iche, nʼagbụrụ ha nʼime obodo ha dị iche iche, ndị ọbụla nʼime ha nwekwara asụsụ nke ha.)
Ụmụ Ham
Ụmụ ndị ikom Ham bụ:
Kush,* Ijipt, Put na Kenan.
Ụmụ ndị ikom Kush bụ:
Seba, Havila, Sabta, Raama na Sabteka.
Ụmụ ndị ikom Raama bụ:
Sheba na Dedan.
Kush bụ nna Nimrọd, onye mesịrị bụrụ dike nʼagha nʼụwa. Ọ bụ dike nʼịchụ nta, nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ nke a mere e ji na-ekwu okwu na-asị, “Ị dị ka Nimrọd, dike nʼịchụ nta, nʼihu Onyenwe anyị.” 10 Obodo ndị bụ mmalite alaeze ya bụ, Babel, Erek, Akad na Kalne, ndị dị nʼala Shaịna.§ 11 Site nʼala ahụ ọ gara Asịrịa, ebe o wuru obodo Ninive na Rehobọt Ia, na Kala, 12 na Resin, nke dị nʼetiti Ninive na Kala, ya bụ obodo ukwu ahụ.
13 Ijipt bụ nna ndị
Lud, ndị Anam, ndị Lehab, ndị Naftuh, 14 ndị Patrus, ndị Kasluh (onye ndị Filistia* sitere na ya) na ndị Kafto.
15 Kenan bụ nna
Saịdọn, ọkpara ya, na ndị Het, 16 ndị Jebus, ndị Amọrait, ndị Gigash, 17 ndị Hiv, ndị Aka, ndị Sini, 18 ndị Avad, ndị Zema na ndị Hamat.
Emesịa, ndị ikwu Kenan gbasara, 19 oke ala ndị Kenan sitere na Saịdọn ruo Gera, gbatịa ruo Gaza, ruokwa Sọdọm, Gọmọra, Adma na Zeboiim, nke dị nso Lasha.
20 Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Ham, dịka ikwu ha na asụsụ ha si dị, nʼoke ala ebe ha bi, na obodo ha dị iche iche.
Ụmụ Shem
21 A mụụrụ Shem ụmụ ndị ikom, onye nwanne nwoke nke tọrọ ya bụ Jafet. Ọ bụkwa nna nna ochie ụmụ ndị ikom niile Eba mụtara.
22 Ụmụ ndị ikom Shem bụ
Elam, Ashua, Apakshad, Lud na Aram.
23 Ụmụ ndị ikom Aram bụ,
Uz, Hul, Geta na Meshek.
24 Apakshad bụ nna Shela,
Shela bụrụ nna Eba.
25 Eba mụtara ụmụ ndị ikom abụọ:
Aha otu nʼime ha bụ Peleg, nʼihi na ọ bụ nʼoge ndụ ya ka e kewara ụwa. Aha nwanne ya nwoke bụ Joktan.
26 Joktan bụ nna
Almodad, Shelef, Hazamavet, Jera, 27 Hadoram, Ụzal, Dikla, 28 Obal, Abimael, Sheba, 29 Ọfịa, Havila na Jobab. Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Joktan.
30 Akụkụ ala ha bi gbasapụrụ site na Mesha ruo Sefa nʼala ugwu ugwu nke ọwụwa anyanwụ.
31 Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Shem, dịka ikwu ha na asụsụ ha si dị, nʼoke ala ebe ha dị, na obodo ha dị iche iche.
 
32 Ndị a bụ ndị ikwu ụmụ Noa ndị ikom dịka usoro ọmụmụ ha si dị, dịka ha si biri na mba dị iche iche. Ọ bụ site na ndị a ka mba niile si gbasasịa ruo akụkụ niile nke ụwa mgbe uju mmiri ahụ gafechara.
* 10:6 10:6 Kush na-ekwu banyere ala dị nʼugwu ugwu Naịl, nʼala Itiopia, nakwa ala Sụdan. Mizraim bụ maka ndị Ijipt, ebe Put na-ekwu banyere ndị Libiya, maọbụ ndị bi gburugburu ala Sọmalia. 10:7 10:7 Ọ bụ nʼime ala Arab ka mba asaa ndị Kush dị. 10:10 10:10 Maọbụ, Babilọn § 10:10 10:10 Shaịna bụ ala Babilọn ochie. * 10:14 10:14 Ndị Filistia bụ mba si nʼagbụrụ (agwara ụgwa) abụọ, otu agbụrụ sitere nʼEshịa, ebe nke ọzọ bụ agbụrụ ndị Ọcha. Njem mbụ ha duuru ha gaa ala Kriit, ebe ha gara biri. Jer 47:4; Ems 9:7 Emesịa, ha busoro ndị Ijipt agha na senchuri nke iri na atọ, ma bichie ala ha. Mgbe e sitere nʼala Ijipt chụpụ ha, ha gara biri nʼakụkụ ọnụ mmiri ala Kenan. 10:22 10:22 Aha ochie e ji mara Asịrịa.