3
Mmehie na Ọdịda
Agwọ dị aghụghọ karịa ụmụ anụ ọhịa niile Onyenwe anyị Chineke kere. Ọ bịakwutere nwanyị ahụ sị ya, “Ọ bụ ezie na Chineke sị unu erila mkpụrụ si nʼosisi niile dị nʼogige a?”
Nwanyị ahụ zara sị ya, “Anyị nwere ike rie mkpụrụ si nʼosisi niile dị nʼogige a ma Chineke kwuru sị, ‘Unu erila mkpụrụ si nʼosisi dị nʼetiti ogige a, unu emetụkwala ya aka, ka unu ghara ịnwụ.’ ”
Agwọ gwara nwanyị ahụ sị, “Unu agaghị anwụ. Nʼihi na Chineke maara na ọ bụrụ na unu erie ya, anya unu ga-emeghe, unu ga-amata ezi ihe na ajọ ihe.”
Nwanyị ahụ hụrụ na mkpụrụ si nʼosisi ahụ dị mma iri eri, na ọ dị mma nʼanya, na ọ bụ osisi mara mma e si enweta amamihe. Ọ ghọọrọ mkpụrụ ahụ rie, nyekwa di ya, onye nke na ya nọ, o rie. Mgbe ahụ, anya ha abụọ meghere, ha chọpụtara na ha gba ọtọ. Ya mere, ha dụkọtara ahịhịa fiig, jiri ya mere onwe ha akwa.
Mgbe nwoke ahụ na nwunye ya nụrụ ụda njegharị Onyenwe anyị Chineke nʼogige ahụ nʼoge uhuruchi, ha zoro onwe ha site nʼebe Onyenwe anyị Chineke nọ nʼetiti osisi ndị dị nʼogige ahụ. Ma Onyenwe anyị Chineke kpọrọ nwoke ahụ oku sị ya, “Ebee ka ị nọ?”
10 Ọ zara si, “Anụrụ m ụda ụkwụ gị nʼogige, nʼihi ya, atụrụ m ụjọ, ebe ọ bụ na m gba ọtọ. Ezokwara m onwe m.”
11  Onyenwe anyị Chineke jụrụ ya sị, “Onye gwara gị na ị gba ọtọ? I riela mkpụrụ si nʼosisi ahụ m nyere gị iwu sị gị erila?”
12 Nwoke ahụ sịrị, “Nwanyị ahụ i mere ka mụ na ya nọdụ, ọ bụ ya nyere m mkpụrụ sitere nʼosisi ahụ, m rie.”
13 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị Chineke sịrị nwanyị ahụ, “Gịnị bụ ihe a i mere?”
Nwanyị ahụ zara sị, “Ọ bụ agwọ ghọgburu m, mee m ka m rie ya.”
Ikpe Ọmụma
14 Ya mere, Onyenwe anyị Chineke gwara agwọ ahụ sị, “Nʼihi ihe a i mere,
“Ihe a bụrụ ọnụ ka ị bụ nʼetiti anụ ụlọ niile
na nʼetiti anụ ọhịa niile.
Afọ gị ka ị ga-eji na-aga ije,
aja ka ị ga na-eri
ogologo ụbọchị ndụ gị niile.
15 Aga m eme ka iro
dịrị nʼetiti gị na nwanyị ahụ,
nʼetiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya,
mkpụrụ ya ga-etipịa gị isi,
gị onwe gị ga-ata ya arụ nʼikiri ụkwụ.”
16 Ọ gwara nwanyị ahụ sị ya,
“Aga m eme ka ihe mgbu nke ịmụ nwa gị baa ụba nke ukwuu,
ọ bụ site nʼihe mgbu ka ị ga-eji mụpụta ụmụ gị.
Ọchịchọ nke obi gị ga-adị nʼaka di gị,
ọ bụ ya ga-achịkwa gị.”
17 Ọ gwara Adam sị, “Nʼihi na ị ṅara nwunye gị ntị, rie mkpụrụ site nʼosisi ahụ m nyere gị iwu sị, ‘Gị erila mkpụrụ sitere na ya,’
“Ala bụ ihe a bụrụ ọnụ nʼihi gị,
site nʼoke ndọgbu nʼọrụ ka ị ga-eri ihe si na ya pụta
ogologo ụbọchị ndụ gị niile.
18 Ọ ga-erupụtara gị ogwu na uke,
ị ga-erikwa ahịhịa nke ubi.
19 Site nʼọsụsọ nke ga-agbapụta gị nʼihu
ka ị ga-eri nri gị
tutu ruo mgbe ị lọghachiri nʼala
ebe ọ bụ site nʼala ka e si mepụta gị
nʼihi na aja ka ị bụ,
nʼaja ka ị ga-alaghachikwa.”
20 Adam* gụrụ nwunye ya Iiv, nʼihi na ọ bụ nne mmadụ niile dị ndụ.
21 Emesịa, Onyenwe anyị Chineke weere akpụkpọ anụ meere Adam na nwunye ya uwe oyiyi. 22  Onyenwe anyị Chineke sịrị, “Lee, mmadụ adịla ka onye ọbụla nʼime anyị site nʼịmata ihe ọma na ihe ọjọọ. Ugbu a, ka ọ gharakwa ị setịpụ aka ya ghọrọ mkpụrụ osisi ahụ na-enye ndụ rie, si otu a dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.” 23 Nʼihi nke a, Onyenwe anyị Chineke chụpụrụ ya site nʼogige Iden ka ọ gaa na-arụ ọrụ nʼala e si wepụta ya. 24 Mgbe ọ chụpụrụ mmadụ, o dochiri nʼọwụwa anyanwụ nke ogige Iden ndị mmụọ ozi dị ike a na-akpọ Cherubim, na mma agha na-acha ọkụ, ka ha na-eche ọnụ ụzọ e si aba nʼebe osisi ahụ na-enye ndụ dị nche.
* 3:20 3:20 Maọbụ, Nwoke ahụ 3:20 3:20 Eleghị anya Iiv pụtara Ịdị ndụ