33
Jekọb ezute Ịsọ
Jekọb lepụrụ anya nʼihu, hụ Ịsọ ka ọ na-abịa, ya na narị ndị ikom anọ ndị so ya. Nʼihi ya, o kesara ụmụntakịrị ndị ahụ, nʼetiti Lịa, na Rechel na ndị odibo nwanyị ya abụọ. O mere ka ndị odibo nwanyị ya abụọ ahụ na ụmụ ha buru ụzọ, Lịa na ụmụ ya esoro nʼazụ, ebe Rechel na Josef nọ nʼazụ azụ. Ma ya onwe ya buru ụzọ na-aga nʼihu ha niile, na-akpọ isiala nye Ịsọ ugboro asaa, tutu ruo mgbe ọ bịarutere nwanne ya nwoke nso.
Ma Ịsọ gbaara ọsọ bịakwute ya, makụọ ya, jikụọ ya aka nʼolu, sutu ya ọnụ. Ha abụọ kwara akwa. Mgbe Ịsọ lelitere anya hụ ndị inyom ndị a na ụmụntakịrị ndị ahụ. Ọ sịrị, “Ndị ole bụ ndị a gị na ha so?”
Jekọb sịrị, “Ha bụ ụmụ Chineke sitere nʼamara ya nye ohu gị.”
Mgbe ahụ, ndị odibo nwanyị abụọ na ụmụ ha rutere nso, kpọọ isiala. Lịa na ụmụ ya bịarutekwara kpọọ isiala, nʼikpeazụ Rechel na Josef bịara kpọọkwa isiala.
Ịsọ sịrị, “Igwe ewu na atụrụ ndị a niile m zutere nʼụzọ, gịnị ka ọ pụtara?”
Jekọb zara, “Ha bụ maka ịnata ihuọma nʼaka gị, onyenwe m.”
Ma Ịsọ sịrị, “Nwanne m nwoke, debere onwe gị ihe i nwere, nʼihi na enwere m akụ hie nne.”
10 Jekọb sịrị, “E, biko, ọ bụrụ na m achọtala ihuọma nʼanya gị, nara m onyinye ndị a. Nʼihi na ịhụ gị anya dịka ilekwasị Chineke anya nʼihu, nke ka nke, otu a i ji ihu ọcha nabata m. 11 Biko nara onyinye ndị ahụ e wetaara gị, nʼihi na Chineke emelara m amara. Enwekwara m ihe ga-ezuru m.” Jekọb kwagidere ya, ọ naara onyinye ndị ahụ.
12 Mgbe ahụ, Ịsọ sịrị, “Bilienụ ka anyị malite ije ịlaghachi. Aga m esonyere unu.”
13 Ma Jekọb sịrị ya, “Onyenwe m, ị maara na ụmụntakịrị ndị a adịghị ike, aga m ejikwa nwayọọ chịa ụmụ atụrụ ndị a na ehi ndị na-enye ụmụ ha ara. Ọ bụrụ na a chịa ha nʼike nʼime otu ụbọchị, ụmụ anụmanụ ndị a niile ga-anwụ. 14 Ya mere, ka onyenwe m buru ohu ya ụzọ na-aga, ma ka m jiri nwayọọ nwayọọ na-abịa, dịka ike igwe anụ ndị a na ụmụaka ndị a si dị. Tutu ruo mgbe m ga-ezute onyenwe m na Sia.”
15 Ịsọ sịrị, “Ọ bụrụ otu a, ka m hapụrụ gị ụfọdụ ndị a mụ na ha so.”
Ma Jekọb sịrị, “Nʼihi gịnị kwanụ? Ka m hụta naanị ihuọma nʼanya onyenwe m.”
16 Ịsọ laghachikwara azụ na Sia nʼotu ụbọchị ahụ. 17 Ma Jekọb na ezinaụlọ ya jere Sukọt, ebe o wuuru onwe ya ụlọ obibi, wuokwara anụ ụlọ ya ụlọ obibi ha. Ọ bụ nke a mere e ji kpọọ ebe ahụ Sukọt.
18 Mgbe Jekọb si Padan Aram lọghachi, o rutere obodo Shekem nke dị nʼala Kenan nʼudo. O mara ụlọ ikwu ya nʼihu obodo ahụ. 19 Ọ zụrụ ala ebe o mara ụlọ ikwu ya nʼaka ụmụ Hamọ, nna Shekem, ọ kwụrụ narị mkpụrụ ọlaọcha maka ala ahụ. 20 Nʼebe ahụ, o wuru ebe ịchụ aja, kpọọ aha ya El Elohe Izrel.*
* 33:20 33:20 Nke a pụtara Chineke Izrel dị ike nke ukwuu.