3
Ekpere Habakuk
Nke a bụ ekpere Habakuk onye amụma kpere. Ọ dị nʼusoro Shiginot. Nke a bụ ihe o kwuru.
Onyenwe anyị anụla m ihe niile e kwuru banyere ude gị.
Ịdị ukwuu nke ọrụ gị niile na-emekwa ka m dere duu nʼegwu nʼihu gị, Onyenwe anyị.
Mekwaa ya ọzọ nʼoge nke anyị,
mekwaa ka anụ akụkọ ya nʼọgbọ anyị.
Nʼoke iwe gị chetakwa ebere.
 
Chineke si na Teman bịa,
Onye Nsọ ahụ sikwa nʼugwu Paran.
Sela
Ebube ya na-ekpuchi eluigwe,
otuto ya jupụtakwara nʼụwa.
Ịma mma ya na-achapụta dịka ihe anyanwụ ụtụtụ,
ihe na-enwupụta site nʼaka ya,
ọ bụkwa nʼebe ahụ ka e zoro ike ya.
Nʼihu ya ka ajọ ọrịa na-efe efe na-aga,
oke mbibi na-esokwa ya nʼazụ.
O guzoro ọtọ yọgharịa ụwa;
o lere anya, mee ka mba niile maa jijiji.
Ugwu ukwu ochie ahụ niile dara,
ugwu nta ochie ndị ahụ dakwara.
Nʼihi na ụzọ ya ga-adịgide ruo mgbe niile ebighị ebi.
Ahụrụ m ụlọ ikwu nke Kushan ka ha nọ ọnọdụ ụbọchị ọjọọ,
na ebe obibi ndị Midia ka ha nọ na oke ahụ ụfụ.
 
Ọ bụ osimiri, ka gị bụ Onyenwe anyị were iwe megide?
Ọnụma gị, ọ dị ukwuu megide iyi niile?
Oke iwe gị ọ bụ megide oke osimiri
mgbe ị nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya gị,
nakwa nʼelu ụgbọ ịnyịnya ị wetara ndị nke gị mmeri?
I kpughepụrụ ụta gị,
kpọọ oku ka a chịtara gị ọtụtụ àkụ.
Sela
I ji osimiri dị iche iche kewaa ụwa.
10 Mgbe ugwu niile hụrụ gị ha nyagharịrị onwe ha nʼihi ihe mgbu bịakwasịrị ha.
Oke mmiri ozuzo gabigakwara.
Ogbu mmiri mere ka olu ya daa ụda,
buliekwa ebili mmiri elu.
 
11 Anyanwụ na ọnwa guzokwara duu na mbara eluigwe,
mgbe ha hụrụ ihe nke àkụ gị,
mgbe ha hụrụ amụma nke ùbe gị gburu.
12 I sitere nʼọnụma gị zọgharịa ije nʼụwa,
sitekwa nʼiwe gị zọchaa mba dị iche iche dịka ọka.
13 Ị pụtara ịzọpụta ndị gị,
ịzọpụta onye ahụ i tere mmanụ.
Ị zọpịara isi onyendu nke ala ajọ omume ahụ,
gbawa ya ọtọ site nʼisi ruo nʼụkwụ.
14 Ọ bụ ùbe ya ka i ji mawaa ya isi,
mgbe ndị dike nʼagha ya bịara dịka oke ifufe ịchụsa anyị,
mgbe ha si nʼobi ụtọ ha chee na ha na-aga iripịa ndị ogbenye e wedara nʼala,
bụ ndị na-ezo onwe ha.
15 Ị chịrịla ịnyịnya gị zọọ ije nʼoke osimiri,
kpagharịa mmiri ukwu ndị ahụ.
 
16 Amara m jijiji nʼobi m mgbe m nụrụ ihe ndị a niile,
egbugbere ọnụ m abụọ kụkọtara nʼegwu,
ọkpụkpụ dị m nʼahụ malitere ire ure,
mee ka ụkwụ m maa jijiji.
Ma aga m eji ndidi chere ụbọchị ọjọọ ahụ
nke ga-abịakwasị ndị ahụ na-abịa ibuso anyị agha.
17 A sịkwarị na osisi fiig amaghị ifuru,
na ọ dịghị mkpụrụ dị nʼosisi vaịnị,
a sịkwa na mkpụrụ osisi oliv ebilata
na ala ubi niile emepụtaghị ihe oriri,
a sịkwa na ọ dịghị atụrụ dị nʼọgba anụ,
na ọ dịkwaghị ehi nọ nʼụlọ anụmanụ,
18 mụ onwe m ga-anọgide na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị.
Aga m etegharịkwa egwu ọṅụ nʼime Chineke Onye nzọpụta m.
 
19 Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ ike m,
ọ na-eme ụkwụ m abụọ ka ha dịka nke ele.*
Ọ na-emekwa ka m zọọ ije nʼebe niile dị elu.
Nke a dịrị onyeisi abụ, nʼụbọ akwara m dị iche iche.
* 3:19 3:19 Ịdị ngwa nʼịgba ọsọ