2
“Gwa ụmụnne gị ndị nwoke Ami, ‘nke pụtara ndị m,’ gwakwa ụmụnne gị nwanyị Ruhama, nke pụtara, ‘Unu ndị m hụrụ nʼanya.’
Ntaramahụhụ na nlọta
“Unu guzogidenụ nne unu, rịọọnụ ya,
nʼihi na ọ bụghị nwunye m,
mụ onwe m abụkwaghị di ya.
Gwanụ ya ka o wezuga ịkwa iko site nʼihu ya,
ya wezugakwa ịgba akwụna nke dị nʼetiti ara ya abụọ.
Ma ọ bụghị otu a, aga m eyipụ ya uwe ya mee ka ọ gbara ọtọ,
aga m eme ka o gbara ọtọ dị ka nʼụbọchị ahụ a mụrụ ya.
Aga m eme ya ka ọ dị ka ọzara,
ka ọ ghọọ nʼala kpọrọ nkụ,
were akpịrị ịkpọ nkụ mee ka ọ nwụọ.
Agaghị m egosi ụmụ ya ebere m,
nʼihi na ha bụ ụmụ a kwatara nʼiko.
Nʼihi na nne ha bụ onye na-akwa iko,
ọ tụrụ ime ha nʼọnọdụ ihere.
Site nʼikwu sị, ‘Aghaghị m ịgbakwuru ndị enyi nwoke hụrụ m nʼanya,
ndị na-enye m nri na mmiri,
ajị anụ m na akwa ọcha m, mmanụ oliv m na ihe ọṅụṅụ m.’
Nʼihi nke a, aga m eji ogwu na uke gbachie ya gburugburu;
aga m agbachi ụzọ ya, mee ya ka ọ ghara ịma ebe ọ na-eje.
Ọ ga-agbaso ndị ahụ hụrụ ya nʼanya ma ọ gaghị achụkwute ha.
Ọ ga-achọ ha ma ọ gaghị ahụ ha.
Mgbe ahụ, ọ ga-asị,
‘Ka m gaa laghachikwuru di mbụ m,
nʼihi na ọ dịrị m mma mgbe ahụ karịa ugbu a.’
Ma ọ kwetaghị na ihe ndị a si nʼaka m,
na ọ bụ mụ nyere ya ọka, na mmanya ọhụrụ, na mmanụ oliv,
na ọlaọcha, na ọlaedo ndị ahụ niile
nke o ji na-efe Baal.
 
“Ya mere, aga m ewerekwa ọka m mgbe ọ chara,
na mmanya ọhụrụ m mgbe oge ya ruru.
Aga m anapụkwa ya akwa ajị anụ m na akwa ọcha m,
nke ekwesiri iji kpuchie ọtọ ya.
10 Ugbu a, aga m ekpughe ọtọ ya
nʼihu ndị ahụ na-ahụ ya nʼanya,*
ọ dịkwaghị onye nwere ike ịnapụta ya site nʼaka m.
11 Aga m eme ka obi ụtọ ya kwụsị;
ọ bụladị mmemme nke afọ niile, mmemme ọnwa ọhụrụ,
nke ụbọchị izuike na mmemme ndị ọzọ ahụ niile a kara aka.
12 Aga m ala ubi vaịnị ya na osisi fiig ya niile nʼiyi,
nke ọ sịrị bụ ụgwọ ọrụ ya site nʼaka ndị hụrụ ya nʼanya;
aga m emekwa ka ha ghọọ oke ọhịa,
anụ ọhịa ga-eripịa ha.
13 Aga m enye ya ahụhụ maka ụbọchị niile
bụ nke o surere ihe na-esi isi ụtọ nye chi Baal niile,
ọ chịrị mgbaaka mkpịsịaka na ihe ịchọ mma niile, jikere onwe ya,
pụọ chụso ndị ahụ hụrụ ya nʼanya,
ma chezọọ m,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
 
14 “Nʼihi nke a, aga m arara ya,
duba ya nʼime ọzara,
jiri olu dị nro gwa ya okwu nʼebe ahụ.
15 Ebe ahụ ka m ga-enyeghachi ya ubi vaịnị ya,
gbanweekwa Ndagwurugwu Akọ, mee ka ọ ghọọ ọnụ ụzọ olileanya.
Mgbe ahụ, ọ ga-azakwa m dịka o mere mgbe ọ bụ agbọghọbịa,
nʼoge ahụ o si nʼala Ijipt pụta.
 
16 “Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,
“Ị ga-akpọ m ‘Di m,’
ị gaghị akpọkwa m ‘nna m ukwu,’ ọzọ.
17 Nʼihi na aga m ewepụkwa aha niile nke arụsị Baal nʼegbugbere ọnụ ya,
ha gaghị akpọkwa ha aha ọzọ.
18 Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka gị na ụmụ anụ ọhịa gbaa ndụ,
meekwa ka gị na ụmụ nnụnụ,
na ihe niile e kere eke nʼakpụgharị nʼala gbaa ndụ.
Aga m emebi ngwa agha niile,
agha niile ga-akwụsịkwa.
Mgbe ahụ, a ga-eme ka ị dịnaa ala nʼudo na-enweghị nsogbu, na ụjọ.
19 Aga m ekwerekwa ịlụ gị dịka nwunye ruo ebighị ebi;
aga m ekwerekwa ịlụ gị nʼezi omume na ikpe ziri ezi,
nʼịhụnanya nke na-adịgide, nakwa obi ebere.
20 Aga m eji ikwesi ntụkwasị obi kwere ịlụ gị.
Ị ga-amatakwa Onyenwe anyị.
 
21 “Nʼụbọchị ahụ m ga-azaghachi,”
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
“M ga-azaghachi eluigwe,
ha ga-azaghachi ala.
22 Ala ga-azaghachi ọka
na mmanya ọhụrụ na mmanụ oliv,
mgbe ahụ ha ga-azaghachi Jezril.
23 Aga m akụkwa ya nye onwe m nʼala ahụ dịka mkpụrụ.
Aga m egosi ịhụnanya m nʼahụ onye ahụ m kpọrọ, ‘Onye m na-ahụghị nʼanya.’
M ga-asịkwa ndị ahụ a kpọrọ, ‘Ndị na-abụghị ndị m,§’ ‘Unu bụ ndị nke m,’
Ha ga-azakwa, ‘Chineke m ka ị bụ.’ ”
* 2:10 2:10 Ndị ya na ha na-akwa iko 2:16 2:16 Maọbụ, Baal nʼasụsụ Hibru 2:23 2:23 Enwekwa obi ebere nʼahụ Lo-Ruhama, § 2:23 2:23 Ya bụ, Lo-ammi,