4
Okwu Onyenwe anyị megide Izrel
Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị unu ndị Izrel,
nʼihi na Onyenwe anyị nwere ebubo*
megide unu ndị bi nʼala a.
“Nʼihi na ọ dịghị ikwesi ntụkwasị obi, ọ dịghị ịhụnanya,
ọ dịghịkwa ihe ọmụma banyere Chineke nʼala a niile.
Ọ bụ naanị ịbụ ọnụ, ịgha ụgha na igbu mmadụ,
izu ohi na ịkwa iko.
Ọgbaaghara dị nʼebe niile,
ya na ogbugbu mmadụ na-esepụghị aka.
Nke a mere ala jiri nọrọ nʼiru ụjụ,
ndị niile nọ na ya na-atakwa ahụ,§
ma anụ ọhịa, ma nnụnụ nke igwe,
ọ bụladị azụ dị nʼosimiri ka a na-ekpochapụ.
 
“Ma otu ọ dị, ka onye ọbụla ghara ise okwu,
ka onye ọbụla ghara ibo ibe ya ebubo.
Nʼihi na ndị gị dịka
ndị na-eseso onye nchụaja okwu.
Ị na-asọ ngọngọ ehihie na abalị,
ndị amụma na-esokwa gị sụọ ngọngọ.
Nʼihi ya aga m ala nne gị nʼiyi
ndị m ka a na-ala nʼiyi nʼihi na ha amaghị ihe.
 
“Ebe ọ bụ na ị jụrụ ihe ọmụma,
aga m ajụkwa gị dị ka onye nchụaja m;
ebe ọ bụ na ị gbakụtara iwu Chineke gị azụ
mụ onwe m ga-agbakụtakwa ụmụ gị azụ.
Ka ha* na-abawanye nʼọnụọgụgụ,
otu a ka ha si na-aga nʼihu na-emehie megide m,
ha gbanwere Chineke ha dị ebube nʼihi ihe na-eweta ihere.
Ha na-eriju afọ site na mmehie ndị m.
Ha ji anya ukwu na-achọ ka ha na-emehie na-aga nʼihu.
Ọ ga-abụkwa ka ndị nchụaja dị, otu a ka ndị obodo dịkwa.
Nʼihi ya, aga m enye ha ntaramahụhụ
ma kwụghachi ha ụgwọ nʼihi omume ha niile.
 
10 “Ha ga na-eri ihe ma afọ agaghị eju ha.
Ha ga-ebi ndụ akwụna ma ha agaghị amụba,
nʼihi na ha ajụla Onyenwe anyị,
were onwe ha nyefee 11 nʼaka ịgba akwụna,
na mmanya ochie na mmanya ọhụrụ,
nke na-ewepụ mmụọ nghọta.
12 Ndị nke m na-ajụ osisi apịrị apị ase ihe ha ga-eme,
na-anata ọsịsa site na mkpara osisi onye ọ na-ajụ ase.
Mmụọ nke ịgba akwụna na-eme ka ha kpafuo;
ha gbara akwụna ma hapụ Chineke ha.
13 Ha na-achụ aja nʼelu ugwu niile,
na-esure onyinye nsure ọkụ nʼelu ugwu nta niile,
na nʼokpuru osisi ook, osisi pọpla na osisi terebint,
ebe ndo ya dị ezi mma.
Nʼihi nke a ka ụmụ unu ndị inyom na-agba akwụna,
ndị nwunye ụmụ unu na-akwa iko.
 
14 “Agaghị m ata ụmụ unu ndị inyom ahụhụ,
mgbe ha na-agba akwụna,
maọbụ taa ndị nwunye ụmụ nwoke unu ahụhụ
mgbe ha na-akwa iko,
nʼihi na ndị ikom unu nʼonwe ha na-ejekwuru ndị akwụna,
ha na ndị akwụna ụlọ arụsị na-achụkọkwa aja,
ma ndị a na-enweghị nghọta ga-ala nʼiyi.
 
15 “Ọ bụ ezie na unu bụ ndị na-akwa iko unu bụ Izrel,
ma ka ikpe gharakwa ịma Juda.
 
“Unu agakwala Gilgal,
unu agakwala ruo Bet-Aven,
unu aṅụkwala iyi sị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ.’
16 Ndị Izrel dị isiike
dịka nwaagbọghọ ehi dị isiike.
Onyenwe anyị ọ ga-esi aṅaa zụọ ha
dịka ụmụ atụrụ nʼebe ịta nri sara mbara?
17 Ifrem na arụsị agbaala ndụ
hapụ ya ka ọ nọọrọ onwe ya.
18 Ọ bụladị mgbe mmanya ha gwụrụ,
ha na-aga nʼihu na-agba akwụna;
ha hụrụ ihere nʼanya nke ukwuu karịa otuto ha.
19 Ifufe ga-ebupụ ha,
aja ha na-achụ ga-ewetara ha ihere.
* 4:1 4:1 Maọbụ, Onyenwe anyị akpọọla unu ikpe 4:1 4:1 Ịma ihe banyere Chineke adịghị nʼuche unu 4:2 4:2 Maọbụ, ịṅụ iyi § 4:3 4:3 Maọbụ, na-anwụkwa anwụ * 4:7 4:7 Ya bụ, ndị nchụaja 4:7 4:7 Akwụkwọ Masori na-ede, nsọpụrụ ha ka m gbanwere ka ọ ghọọ ihere