15
Amụma e buru banyere Moab
Amụma megide Moab:
Ar dị na Moab a laala nʼiyi,
a lara ya nʼiyi naanị nʼotu abalị.
Kia dị na Moab a laala nʼiyi,
a lara ya nʼiyi naanị nʼotu abalị.*
Ndị niile bi na Dibọn
na-aga nʼihu ụlọ mmụọ ha ịkwa akwa. Ndị
Moab na-akwa akwa nʼihi Nebo na Medeba.
Isi ha niile bụ isi nkwọcha,
afụọnụ ha niile ka akpụchakwara.
Ha na-eyi akwa mkpe na-agagharị nʼezi,
mkpu akwa na-ada nʼelu ụlọ, na nʼama.
Ha niile ji iti mkpu na ịkwa akwa
na-ada nʼala.
Heshbọn na Eleale na-eti mkpu akwa,
a na-anụ olu akwa ha ọ bụladị ruo Jehaz.
Nʼihi nke a, ndị agha Moab na-eti mkpu akwa,
mkpụrụobi ha na-amakwa jijiji.
 
Ọ na-ewute mkpụrụobi m nʼihi Moab,
ndị ya na-agba ọsọ ruo ọ bụladị nʼobodo Zoa
na Eglat Shelishiya.
Ha na-akwa akwa
dịka ha na-arịgo Luhit.
Mgbe ha na-agbago ụzọ Heronaim,
ha na-ebe akwa mwute nʼihi mbibi bịakwasịrị ha.
Mmiri Nimrim atachaala!
Ahịhịa akpọnwụọkwala;
ahịhịa ndụ niile agwụkwala
o nwekwaghị akwụkwọ ndụ nke fọrọ.
Ya mere akụnụba ha kpakọbara ndị ha chekwara
ka ha buuru gafee ofe ndagwurugwu warawara nke ọdọ mmiri osisi pọpla niile.
Mkpu akwa ha na-ada ụda gburugburu oke ala Moab niile;
akwa ha na-ebesi ike na-ada ruo obodo Eglaim;
abụ akwa ha na-erukwa Bịa-Elim.
Iyi Dibọn jupụtara nʼọbara,
ma aga m atụkwasịkwa ọ bụladị ọtụtụ ihe ndị ọzọ nʼelu Dibọn!
Ọdụm ka a ga-atụkwasịrị ndị Moab§ gbapụrụ
tụkwasịkwara ndị fọdụrụ nʼala ahụ.
 
 
* 15:1 15:1 Obodo Ar na Kia, bụ obodo abụọ dị mkpa nʼala ndị Moab. 15:5 15:5 Aịz 16:11; Jer 48:31 15:5 15:5 Jer 48:5 § 15:9 15:9 2Ez 17:25; Jer 50:17