26
Abụ Otuto
Nʼụbọchị ahụ, a ga-abụ abụ a nʼala Juda niile:
Anyị nwere obodo e wusiri ike.
Chineke na-eme ka mgbidi ya
na ebe ya niile e wusiri ike bụrụ nzọpụta nye anyị.
Meghee ụzọ ama niile,
ka mba ndị ahụ na-eme ezi omume bata,
e, bụ mba ahụ kwesiri ntụkwasị obi.
Ị na-eme ka ndị niile echiche uche ha guzosiri ike
nwee udo zuruoke,
nʼihi na ọ bụ na gị ka ha na-atụkwasị obi ha.
Tụkwasị Onyenwe anyị Chineke obi mgbe niile,
nʼihi na Onyenwe anyị Chineke bụ oke nkume nke mgbe ebighị ebi.
Ndị na-akpa nganga ka ọ na-ewedata ala,
na-emekwa ka obodo na-anya isi kpọọ ọnụ nʼala.
Mgbidi ya
ka ọ na-eme ka ọ daruo ala.
Ọ na-enyefe obodo ahụ
nʼaka ndị a na-emegbu emegbu,
na nʼaka ndị ogbenye ka ha zọtọọ ya ụkwụ.
 
Ụzọ nke onye ezi omume ha nʼotu,
gị, Onye ziri ezi, na-eme ka okporoụzọ ndị ezi omume dị larịị.
E, Onyenwe anyị, anyị na-aga nʼụzọ nke ikpe gị niile,
na-ele anya gị.
Aha gị na ihe niile e ji mara gị
bụ ihe na-agụsị obi anyị agụ ike.
Abalị niile ka obi m na-achọsi gị ike,
nʼụtụtụ eji m mmụọ m niile na-achọsi gị ike,
nʼihi na ọ bụ naanị mgbe ị bịara kpee ụwa ikpe
ka mmadụ ga-esi nʼajọ omume tụgharịa ime ezi ihe.
10 Obi ebere gị nʼebe ndị na-emebi iwu nọ
adịghị eme ka ha gbanwee.
Ọ bụladị nʼala a, ebe ndị ezi omume bi, ha na-anọgide na-eme ihe ọjọọ.
Ha adịghị echeta ịdị ukwuu gị, Onyenwe anyị.
11  Onyenwe anyị ebuliela aka ya elu,
ha adịghị ahụ ya.
Gosi ha ekworo gị banyere ndị gị, ka e si otu a mee ka ihere mee ha.
E, ka ọkụ ahụ ị kwadooro ndị iro gị rechapụ ha.
 
12  Onyenwe anyị, ị na-enye anyị udo;
nʼihi na ihe niile anyị nwere sitere nʼaka gị.
13 O, Onyenwe anyị Chineke anyị, ọ dị mgbe anyị nọ nʼokpuru ọchịchị ndị ọzọ dị iche iche,
ma ugbu a, ọ bụ naanị aha gị ka anyị na-efe.
14 Ndị niile anyị fere na mbụ anwụchaala; ha adịghịkwa ndụ;
mmụọ ha agakwaghị alọghachi ọzọ.
Nʼihi na ị tara ha ahụhụ, laa ha nʼiyi;
e chefukwaala ha.
15 I meela ka mba a dị ukwuu, Onyenwe anyị;
i meela ka mba a saa mbara.
I wetarala onwe gị nsọpụrụ,
i meela ka oke ala ahụ niile gbatịa.
 
16  Onyenwe anyị, nʼime mkpagbu ha, ha gbakwutere gị.
Mgbe iwe gị bịakwasịrị ha,
ọ bụ olu dị nta ka ha ji kpeere gị ekpere.
17 Gị, Onyenwe anyị, emeela ka anyị kwaa akwa,
dị ka nwanyị ime na-eme si ata ikikere eze na akwa akwa nʼihi ihe mgbu.
Otu a ka anyị nọ nʼihu gị.
18 Anyị anọọla ọnọdụ ihe mgbu, na ịta ikikere eze,
ma o nweghị ihe ọma anyị nwetara nʼime ya.
Mgbalị anyị niile emeghị ka nzọpụta rute ụwa aka.
O nwekwaghị ihe nwere isi anyị rụpụtara.
 
19 Ma ndị gị niile nwụrụ anwụ ga-adị ndụ, O Onyenwe anyị.
Ozu ha ga-esite nʼọnwụ bilie.
Unu ndị niile bi nʼaja
tetanụ ma tie mkpu ọṅụ.
Nʼihi na igirigi gị dị ka igirigi nke ụtụtụ,
ala ga-amụpụtakwa ndị ya niile nwụrụ anwụ.
 
20 Baanụ nʼụlọ, ndị m,
kpọchienụ ụzọ unu!
Zoonụ onwe unu naanị nwa oge nta,
tutu ruo mgbe iwe Chineke ga-agabiga.
21 Lee anya! Onyenwe anyị si nʼebe obibi ya
na-abịa ikpe ndị bi nʼụwa ikpe nʼihi mmehie ha niile.
Ụwa ga-ekpughepụ gosi ọbara niile a wụsiri nʼelu ya,
ọ gaghị ezokwa ndị niile e gburu lie nʼime ya.