38
Ọrịa Hezekaya rịara
Nʼoge ahụ, Hezekaya rịara ọrịa ruo na ọ gaara anwụ. Aịzaya onye amụma, nwa Emọz, bịakwutere ya, sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị: Dozie ezinaụlọ gị, nʼihi na ị ga-anwụ. Ị gaghị esite nʼute ọrịa a bilie.”
Hezekaya tụgharịrị chee ihu ya nʼaja ụlọ kpee ekpere nye Onyenwe anyị sị, “Chetakwa, Onyenwe anyị, otu m si jegharịa nʼihu gị nʼikwesị ntụkwasị obi, jiri obi m niile fee gị ofufe, ma meekwa ihe dị mma nʼanya gị.” Hezekaya bekwara akwa nke ukwuu.
Mgbe ahụ, okwu nke Onyenwe anyị rutere Aịzaya, “Gaa, gwa Hezekaya, sị ‘Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Chineke nna gị Devid kwuru, anụla m ekpere gị, ahụkwala m anya mmiri akwa gị. Aga m atụkwasị afọ iri na ise nʼụbọchị ndụ gị. Aga m anapụtakwa gị na obodo a site nʼaka eze Asịrịa. Aga m echebe obodo a.
“ ‘Nke a bụ ihe ịrịbama site nʼaka Onyenwe anyị nye gị, na Onyenwe anyị ga-emezu ihe a nke o kwere na nkwa. Aga m eme ka anyanwụ laa azụ nzọ ụkwụ iri nʼihe nrigo ụlọ elu Ehaz.’ ” Ya mere, anyanwụ laghachiri azụ nzọ ụkwụ iri.
Ederede Hezekaya eze Juda, mgbe ọrịachara ọrịa, nwee ahụ ike:
10 Asịrị m, “Ọ bụ nʼoge m bụ okorobịa
ka m ga-agabiga nʼọnụ ụzọ nke ọnwụ,
bụrụ onye anapụrụ oge ndụ m nke fọdụrụ afọdụ?”
11 Asịrị m, “Ọ dịkwaghị mgbe m ga-ahụ Onyenwe anyị ọzọ
nʼala ndị dị ndụ,
m gaghị elegidekwa mmadụ ibe m anya ọzọ,
maọbụ bie nʼetiti ndị bi nʼime ụwa a.
12 Esila nʼọnọdụ ya bupụ ụlọ m
dịka ụlọ ikwu nke onye ọzụzụ atụrụ.
Apịakọtala m ndụ m dịka ọkpa akwa si apịakọta akwa
o bipụla ndụ site nkwe-akwa,
ehihie na nʼabalị, ị mere ka ndụ m gwụsịa.
13 Enwere m ntachiobi chere chi ọbụbọ.
Ma dịka ọdụm ka ọ na-agbaji ọkpụkpụ m niile.
Ehihie na nʼabalị ka ị na-eme ka ndụ m gwụsịa.
14 Dịka eleke maọbụ ụgbala ka m na-ebe akwa.
Ana m asụ ude dịka nduru na-eru ụjụ.
Ike gwụrụ anya m nʼihi ile anya nʼeluigwe.
Anọ m nʼọnọdụ mkpagbu, Onyenwe anyị, bịa nyere m aka.”
 
15 Ma gịnị ka m ga-ekwu?
Ya onwe ya gwara m sị na ọ bụ ya mere nke a.
M ga-eji obi umeala gagharịa ụbọchị ndụ m niile
nʼihi ihe mwute nke obi m.
16 Onyenwe anyị, ọ bụ nʼihi ihe ndị a ka mmadụ ji adị ndụ.
Mmụọ m na-adịkwa ndụ nʼime ha.
I nyeghachila m ahụ ike,
mee ka m dị ndụ.
17 Nʼezie, ọ bụ nʼihi ọdịmma m,
ka m ji taa ahụhụ nke ihe mgbu dị otu a.
Nʼịhụnanya gị ka ị zọpụtara m
site nʼolulu nke ịla nʼiyi.
I werela mmehie m niile
wefee nʼazụ gị.
18 Nʼihi nʼala mmụọ agaghị eto gị,
ọnwụ agakwaghị abụku gị abụ otuto.
Ndị na-arịda nʼolulu
agaghị ele anya ikwesi ntụkwasị obi gị.
19 Ọ bụ ndị dị ndụ, e, naanị ndị dị ndụ ga-eto gị otuto,
dị ka m na-eme taa.
Ọ bụ otu ọgbọ na-eme ka ọgbọ na-eso ha
mata ihe banyere ikwesi ntụkwasị obi gị.
 
20  Onyenwe anyị ga-azọpụta m,
anyị ga-abụ abụ kpọọ ụbọ akwara
nʼụbọchị niile nke ndụ anyị,
nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
21 Aịzaya ekwuolarị sị, “Kwadoonụ mmanụ fiig dị ọkụ tee ya nʼelu etuto ahụ, ahụ ga-adịkwa ya mma.”
22 Hezekaya jụrụ sị, “Gịnị ga-abụ ihe ịrịbama na m ga-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị?”