49
Ohu nke Onyenwe anyị
Geenụ m ntị, unu niile ndị bi nʼala mmiri gbara gburugburu,
nụrụkwanụ nke a, unu ndị nọ na mba dị anya.
Onyenwe anyị kpọrọ m tupu amụọ m.
Ọ kpọrọ m aha m mgbe m ka nọ nʼime afọ nne m.
O mere ka okwu sị m nʼọnụ dịrị nkọ dịka mma agha.
O zobere m nʼaka ya kpuchie m.
O mere m ka m dịrị ka àkụ dị nkọ
nke o zoro nʼime akpa àkụ ya.
Ọ sịrị m, “Ị bụ ohu m, Izrel.
Ọ bụkwa site na gị ka m ga-eji gosi ịma mma* na ike m.”
Ma mụ onwe m sịrị, “Ọ bụ nʼefu ka m dọgburu onwe m nʼọrụ.
Etufuola m ike m niile nʼihi ihe na-abụghị ihe.
Ma ihe ruru m dị nʼaka Onyenwe anyị,
ụgwọ ọrụ m dịkwa nʼaka Chineke m.”
 
Ma ugbu a Onyenwe anyị na-asị,
Onye ahụ kpụrụ m nʼafọ nne m ka m bụrụ onye na-ejere ya ozi;
ka ọ kpọghachite Jekọb nye ya
ka achịkọtakwa ndị Izrel nyekwa ya onwe ya,
nʼihi na-abụ m onye nsọpụrụ dịrị nʼanya Onyenwe anyị,
Chineke m aghọkwaarala m ike m.
Ọ sịrị,
“Ọ bụ ihe dị nta karịa, gị ị bụrụ m ohu,
ịkpọghachita ebo niile nke Jekọb
na ịkpọghachita ndị Izrel ndị m chebere.
Aga m emekwa ka ị bụrụ ìhè nye ndị mba ọzọ,
ka nzọpụta m site nʼaka gị ruo ndị bi na nsọtụ ụwa niile.”
 
Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru,
Onye mgbapụta na Onye nsọ Izrel
na-agwa onye ahụ a na-elelị anya, onye ahụ mba kpọrọ ihe arụ,
e, onye ahụ ndị na-achị achị mere ka ọ ghọọ ohu ha,
“Ndị eze ga-eguzo ọtọ mgbe ị na-agafe.
Ndịisi na-achị achị ga-akpọ isiala nye gị,
nʼihi na Onyenwe anyị, Onye kwesiri ntụkwasị obi,
Onye nsọ Izrel, ahọpụtala gị.”
Nlọghachi nke Izrel
Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu:
“Nʼoge amara m, aga m aza unu,
nʼụbọchị nzọpụta aga m enyere unu aka.
Aga m echebe unu, mee ka unu
bụrụ ọgbụgba ndụ nye ndị mmadụ,
iweghachite ala ahụ
na ikegharịkwa ihe nketa ya nke tọgbọrọ nʼefu;
na-asị ndị mkpọrọ, ‘Pụtanụ,’
na-asịkwa ndị nọ nʼọchịchịrị, ‘Pụtanụ nʼihe.’
 
“Ha ga-adịkwa ka atụrụ m, nọọ nʼakụkụ ụzọ,
ndị na-ata ahịhịa nʼebe ịta nri nke ahịhịa ndụ, nʼakụkụ ugwu nta niile.
10 Agụ agaghị agụ ha, akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ.
Oke anwụ otiti nke ọzara agaghị acha ha ọzọ.
Nʼihi na Onyenwe anyị ga-esite nʼobi ebere ya duo ha
nʼakụkụ isi iyi jupụtara na mmiri.
11 Aga m emekwa ka ugwu ukwu niile ghọọ okporoụzọ,
meekwa ka okporoụzọ niile guzozie.
12 Lee, ndị m ga-alọghachi, ha ga-esitekwa nʼebe dị anya,
ụfọdụ ga-esite nʼugwu, ụfọdụ nʼọdịda anyanwụ,
ndị ọzọ ga-esite na mpaghara Aswan.
 
13 Tienụ mkpu ọṅụ, eluigwe niile;
ka ụwa ṅụrịa ọṅụ.
Ugwu ukwu niile, bụọnụ abụ,
nʼihi na Onyenwe anyị akasịela ndị ya obi.
Ọ ga-enwekwa obi ebere nʼihi iru ụjụ ha.
 
14 Ma Zayọn sịrị, “Onyenwe anyị agbakụtala m azụ;
Onyenwe m echefuola m.”
 
15 “Nwanyị ọ pụrụ ichezọ nwa ya na-aṅụ ara,
hapụ inwe obi ebere nʼahụ nwa si nʼafọ ya?
Eleghị anya ọ pụrụ ichezọ,
ma agaghị m echezọ unu.
16 Lee, edeela m aha gị nʼọbụaka m,
nʼihu m kwa ka m debere foto mgbidi gị nke ga-adịgide.
17 Ụmụ gị emeela ngwangwa lọghachite,
ndị ahụ mere ka ị tọgbọrọ nʼefu ga-esi nʼime gị pụọ.
18 Welie anya gị abụọ lee gburugburu, legharịa anya,
ụmụ gị niile na-ezukọta na-alọghachikwute gị.
Dịka m na-adị ndụ,” ka Onyenwe anyị kwubiri.
“Ị ga-eyi ha niile dịka ọla ịchọ mma,
ị ga-ekekwa ha dịka nwanyị a na-alụ ọhụrụ si eme.
 
 
19 “Ọ bụ ezie na e bibiri gị, mee ka ị tọgbọrọ nʼefu,
ala gị abụrụ nkpọnkpọ ebe,
ma ugbu a, ị gaghị ezuru ndị gị,
otu a kwa, ndị ahụ ripịara gị ga-anọ gị nʼebe dị anya.
20 Ụmụ niile a mụrụ nʼoge ọnwụ gbabara gị aka,§
ga-asịkwa na ntị gị,
‘Ebe a dịrị anyị oke ntakịrị,
nye anyị ebe sara mbara karịa nke anyị ga-ebi nʼime ya.’
21 Mgbe ahụ, ị ga-eche nʼime onwe gị sị,
‘Onye mụtaara m ọtụtụ ụmụ ndị a niile?
A dịrị m ka nwanyị na-amụghị nwa maọbụ onye ụmụ ya nwụchara.
Onye ajụrụ ajụ na nke e mere ka ọ gaa biri nʼala ọzọ.
Mụ onwe m fọdụrụ, naanị m.
Onye kwa mụụrụ m ụmụ ndị a?
Onye zụlitere ha?’ ”
22 Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,
“Lee, aga m akpọku ndị mba ọzọ,
weliere ha ọkọlọtọ m,
ha ga-ekulatara gị ụmụ gị ndị ikom nʼaka ha.
Ụmụ ndị inyom ka ha ga-ekukwasị nʼubu ha kulatakwa ha.
23 Ndị eze ga-abụkwa ndị nna na-azụ ụmụ gị,
ndị eze nwanyị ha ga-abụkwa ndị inyom na-enye ụmụ gị ara.
Ha ga-akpọ isiala nye gị,
rachakwaa aja dị nʼụkwụ gị abụọ.
Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị,
matakwa na ihere agaghị eme ndị niile na-ele anya inyeaka m.”
 
24 A ga-anara dike nʼagha ihe ọ lụtara nʼagha,
maọbụ zọpụta ndị a dọọrọ nʼagha site nʼaka onye afọ tara mmiri*?
25 Ma otu a ka Onyenwe anyị sịrị,
“Nʼezie, a ga-esi nʼaka ndị bụ dike nʼagha pụnara ha ndị ha dọtara nʼagha.
A ga-esitekwa nʼaka onye na-akpa ike napụta ya ihe ọ dọtara nʼagha.
Nʼihi na aga m ebuso ha agha bụ ndị niile na-ebuso gị agha.
Aga m anapụtakwa ụmụ gị.
26 Aga m eme ka ndị na-akpagbu gị rie anụ ahụ onwe ha;
ha ga-aṅụ ọbara onwe ha ṅụbiga ya oke, dịka mmanya.
Mgbe ahụ, ihe niile bụ mmadụ nʼụwa ga-amata,
na mụ onwe m Onyenwe anyị, bụ Onye na-azọpụta gị,
Onye mgbapụta gị, na Onye dị ike nke Jekọb.”
* 49:3 49:3 Maọbụ, ịdị ukwuu 49:9 49:9 Maọbụ, ndị a dọtara nʼagha 49:12 49:12 Nʼime akwụkwọ ndị mgbe ochie, aha ị ga-ahụ bụ Sinim. § 49:20 49:20 Ndị a nọ na mba ọzọ mụọ ga-alọta * 49:24 49:24 Ndị onye ezi omume dọtara nʼagha, a ga-eme ka ha wezuga onwe ha.