57
Ndị ezi omume na-ala nʼiyi,
ma ọ dịghị onye ọbụla na-etinye ya nʼobi;
a na-ewezuga ndị ji obi ha niile na-efe Chineke,
ma ọ dịghị onye na-aghọta,
na-ewezugara onye ezi omume
pụọ nʼihu ihe ọjọọ.
Ndị na-agazi agazi nʼụzọ ha
na-abanye nʼudo.
Ha na-enwekwa izuike mgbe ha dinara nʼọnwụ.
 
“Ma unu onwe unu, bịanụ nʼebe a, unu ụmụ ndị mgbaasị,
unu ụmụ ndị na-akwa iko, na ụmụ ndị akwụna.
Onye ka unu na-akwa emo?
Onye ka unu na-akọcha,
na-arapụtakwara ire unu?
Unu ọ bụghị ụmụ ndị nnupu isi,
mkpụrụ ndị na-ekwu okwu ụgha?
Unu na-emejupụta ihe ọjọọ niile na-agụ obi unu agụụ
mgbe unu zukọrọ na-efe arụsị unu nʼokpuru osisi ook ọbụla.
Unu na-ewerekwa ụmụ unu chụọ aja
na ndagwurugwu niile, na nʼokpuru nkume niile dị elu.
Chi unu na-efe bụ nkume niile na-akwọ mụrụmụrụ,*
nke dị na ndagwurugwu niile, ha bụ ihe nketa nza unu fere.
E, ọ bụ ha ka unu na-awụpụrụ onyinye mmanya unu niile
na onyinye mkpụrụ ọka unu niile.
Nʼihi ihe ndị a niile, m ga-esi aṅaa dere duu?
Ọ bụ nʼelu ugwu dị elu ka unu doziiri onwe unu ihe ndina,
nʼebe ahụ kwa ka unu gara chụọ aja unu.
Ọ bụkwa nʼazụ ọnụ ụzọ niile, na ibo ụzọ niile,
ka ị kwụbara oyiyi arụsị gị.
Ị gbakụtara m azụ,
yipụ uwe gị rịbanye nʼime ihe ndina gị,
ebe gị na ndị ahụ ị hụrụ nʼanya dinakọrọ,
imejupụta ihe ọjọọ ahụ na-agụ obi gị agụụ.
Ị were mmanụ jekwuru Molek
meekwa ka mmanụ otite gị na-esi isi ụtọ baa ụba.
Ị zipụrụ ndị nnọchite anya gị gaa na mba dị anya;
ị gbadara ruo nʼime ime ala mmụọ.
10 Oke mwagharị ndị a niile emeela ike gwụsịa gị,
ma ị dịghị asị, ‘Olileanya adịghị.’
Ị chọtara ntute nye ndụ gị,
ya mere, na ị daghị mba.
 
11 “Onye na-emenye gị ụjọ na egwu dị otu a?
Nke mere na ị dịghị agwa m eziokwu?
Ị naghị echetakwa m,
ị naghị atụgharịkwa ihe banyere m nʼobi gị?
Ọ bụ nʼihi na m gbara nkịtị oge ndị a niile
ka i ji hapụ ịtụ m egwu?
12 Lee, aga m ekpughe ezi omume gị na ọrụ ọma gị,
igosi gị na ihe ndị a ị gụrụ dị ka ezi ihe agaghị enyere gị aka.
13 Mgbe ị ga-eti mkpu akwa maka enyemaka,
ka arụsị niile ndị ịchịkọbara zọpụta gị.
Ikuku ga-eburu ha niile bufuo,
naanị otu nkuume ga-ekutu ha.
Ma onye ọbụla gbabara nʼime m izere ndụ
ga-eketa ala ahụ;
ha ga-enwetakwa ugwu nsọ m.”
Nkasiobi dịrị ndị dị umeala nʼobi
14 A ga-asịkwa,
“Dozienụ ụzọ! Dozienụ ụzọ, mee ya ka ọ maa mma.
Bupụsịanụ ihe ịsọ ngọngọ niile nʼụzọ ndị m.”
15 Nʼihi ihe a ka onye dị elu, onye e mere ka ọ dị ukwuu,
onye dị mgbe ebighị ebi, onye aha ya dị nsọ kwuru:
“Ebi m nʼebe dị elu nke dịkwa nsọ,
ibinyere onye dị umeala nʼobi, na onye wedara mmụọ ya nʼala,
itute mmụọ nke onye e wedara nʼala,
na ịkpọlite mmụọ nke onye dị umeala nʼobi.
16 Nʼihi na ọ bụghị ruo ebighị ebi ka m ga na-emegide gị,
maọbụ na-egosi iwe m.
Ọ bụrụ na m emee otu a, mmụọ ndị mmadụ ụwa niile ga-ada mba,
ya na mkpụrụobi niile ahụ m ji aka m kpụọ.
17 Ewesoro m ha iwe nʼihi mmehie ha na oke ọchịchọ ha.
Ọ bụkwa nʼihi ya ka m ji taa ha ahụhụ, gbakụtakwa ha azụ.
Ma lee, ha nọgidesikwara ike na-eme mmehie, na-eme ihe ọbụla nke na-atọ obi ha ụtọ.
18 Ahụla m ihe niile ha mere ma aga m agwọ ha.
Aga m edu ha, kasịekwa ndị na-eru ụjụ nʼIzrel obi.
19 Aga m eme ka abụ otuto dị nʼegbugbere ọnụ ha.
Udo, udo, dịrị ndị nọ nso na ndị nọ nʼebe dị anya,”
ka Onyenwe anyị kwuru.
“Aga m agwọkwa ha.”
20 Ma ndị niile na-emebi iwu dị ka oke osimiri na-amagharị amagharị,
nke na-adịghị ezu ike mgbe ọbụla.
Ọ na-amapụtakwa ụrọ na apịtị.
21 “Ọ dịkwaghị udo dịrị onye na-emebi iwu,” ka Chineke kwuru.
* 57:6 57:6 Nkume ndị a na-akwọ mụrụmụrụ bụ ihe ha ji ejere chi ndị ahụ na-abụghị chi ozi. 57:9 57:9 Maọbụ, eze 57:9 57:9 Ya bụ, arụsị apịrị apị