6
Ọkpụkpọ Aịzaya
Nʼafọ ahụ, mgbe eze bụ Ụzaya nwụrụ, ahụrụ m Onyenwe anyị ka ọ nọ nʼocheeze ya dị oke elu. Ọnụ ọnụ ala uwe ya jupụtara ụlọnsọ ukwuu ya. Ndị na-erugharị nʼelu ocheeze ya bụ ndị mmụọ ozi a na-akpọ seraf, ndị nwere nku isii. Ha ji nku ha abụọ kpuchie ihu ha; abụọ ka ha ji kpuchie ụkwụ ha, abụọ nke fọdụrụ ka ha ji na-efegharị. Ha na-abụrịtara onwe ha abụ, sị,
“Nsọ, Nsọ, Nsọ, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile dị.
Ụwa niile jupụtara nʼebube ya.”
Nʼihi ụda olu ha, ọnụ ụzọ na mgbidi ụlọnsọ mara jijiji, ụlọ ahụ jupụtara nʼanwụrụ ọkụ.
Etiri m mkpu akwa sị. “Ewoo! Onye nwụrụ anwụ ka m bụ, nʼihi na onye mmehie ka m bụ, egbugbere ọnụ m bụ egbugbere ọnụ rụrụ arụ; ọ bụkwa nʼetiti ndị egbugbere ọnụ ha rụrụ arụ ka m bi. Ugbu a, ejirila m anya m hụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Eze ukwu ahụ!”
Mgbe ahụ, otu nʼime seraf ndị ahụ sitere nʼebe ọ nọ fekwute m, were mkpa gụta otu icheku dị ọkụ site nʼebe ịchụ aja.* O weere icheku ọkụ ahụ sọtụ m nʼọnụ, sị m, “Ugbu a, a gụọla gị dịka onye dị ọcha, nʼihi na icheku a emetụla gị nʼọnụ. A gbagharakwala gị mmehie gị niile.”
Mgbe ahụ, anụrụ m olu Onyenwe anyị ka ọ na-ajụ, “Onye ka m ga-eziga? Onye ga-ejekwara anyị?”
Asịrị m, “Lee m, ziga m.”
Ọ siri, “Gaa gwa ndị a sị,
“ ‘Na-anụnụ, ma unu aghọtala,
na-elenụ anya ma unu ahụla.
10 Mee ka obi ndị a maa abụba, dịkwa arọ,
mee ka ntị ha kpọchie,
mechiekwa anya ha.
Ma ọ bụghị otu a, ha nwere ike iji anya ha hụ ụzọ,
jiri ntị ha nụ ihe,
jirikwa obi ha ghọta,
ma chigharịa bụrụ ndị a gwọrọ.”
11 Ma ekwuru m sị, “Onyenwe m, ọ bụ ruo ole mgbe?”
Ọ zara,
“Ọ bụ ruo mgbe obodo ha tọgbọrọ nʼefu,
mgbe ọ na-adịghị onye ga-afọdụ nʼime ya;
mgbe ụlọ obibi ha niile ga-atọgbọrọ nʼefu,
mgbe e bibisịrị ala ubi ha niile.
12 Ọ bụ ruo mgbe Onyenwe anyị zigara onye ọbụla gaa ebe dị anya,
ala niile atọgbọkwara nʼefu.
13 Ma ọ bụrụkwa na otu ụzọ nʼime ụzọ iri nʼime ha niile afọdụ nʼala a,
a ga-eme ka ọ laa nʼiyi.
Ma dịka osisi terebint na osisi ook
na-ahapụ ogwe mgbe e gbujiri ha,
ya mere mkpụrụ nsọ ahụ ga-abụ ogwe osisi nʼala ahụ.”
* 6:6 6:6 Ebe ịchụ aja a, nke dị nʼetiti ebe nsọ ahụ, ka a na-achụ aja ụda ndị ahụ na-esi isi ụtọ Mkp 8:3 6:9 6:9 Mat 13:14; Mak 4:12; Luk 8:10 6:10 6:10 Abụ 119:70; Ọrụ 7:51