14
Ọlụlụ nwunye Samsin
Samsin gbadara nʼobodo Timna* ebe ọ hụrụ otu nwaagbọghọ onye Filistia. Mgbe ọ lọtara nʼụlọ, ọ gwara nne na nna ya, “Ahụrụ m otu nwanyị nʼime Timna sitere nʼụmụ ndị inyom Filistia; ugbu a, lụtara m ya na nwunye.”
Nne na nna ya zara ya, “Ọ bụ na ọ dịghị nwanyị dị nʼetiti ndị inyom ụmụnne gị, maọbụ nʼetiti ndị anyị niile? Gịnị mere o ji bụrụ nʼetiti ndị Filistia a na-ebighị ugwu ka i si lụtara onwe gị nwunye?”
Ma Samsin sịrị nna ya, “Gaa lụtara m ya. Nʼihi na o ziri ezi nʼanya m.” (Nne na nna ya aghọtaghị na aka Onyenwe anyị dị nʼọlụlụ nwunye a Samsin chọrọ ịlụ. Nʼihi na Onyenwe anyị na-achọ ụzọ ọ ga-esi megide ndị Filistia, ndị na-achị ụmụ Izrel nʼoge ahụ.)
Samsin na nne na nna ya gawara obodo Timna maka ọlụlụ nwanyị a. Mgbe ha na-erute ubi vaịnị dị obodo Timna nso, otu nwa ọdụm sitere nʼọhịa mapụta, gbọrọ ụja na-abịakwute Samsin. Nʼotu oge ahụ, Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị Samsin nʼike. O jekwuuru ọdụm ahụ, were aka ya abụọ dọwaa ya ọnụ, dịka a ga-asị na ọ bụ nwa ewu. Ma Samsin agwaghị nne na nna ya ihe mere. Ma mgbe ha bịaruru Timna, Samsin na nwaagbọghọ ahụ kparịtara ụka. Ihe banyere nwaagbọghọ ahụ dị Samsin ezi mma.
Ọ laghachiri mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị ka ọ kpọrọ ya. Ma mgbe ọ tụgharịrị ka ọ hụ ozu ọdụm ahụ, ọ hụrụ na igwe aṅụ bizi nʼime ozu ọdụm ahụ, na-emepụtakwa mmanụ aṅụ. Ọ kọpụtara mmanụ aṅụ ahụ tinye nʼaka ya, malite ịracha ka ọ na-aga nʼụzọ. Mgbe ọ bịakwutere nne na nna ya, o nyebinyere ha ụfọdụ, ha onwe ha rachakwara ya. Ma ọ gwaghị ha na o wetara ya site nʼozu ọdụm.
10 Nna ya gara ịhụ nwanyị ahụ ma Samsin kpọkọtara ụmụ okorobịa obodo ahụ meere ha oriri dịka omenaala ha sị di. 11 Mgbe Samsin rutere, a kpọnyere ya ndị bịara mmemme ọnụọgụgụ ha dị iri atọ.
12 Mgbe ahụ, Samsin gwara ha okwu sị ha, “O nwere ajụjụ, gwa m, gwa m, gwa m, m chọrọ ka unu kọwaara m. Ọ bụrụ na unu enwee ike kọwaa ya, site taa ruo nʼụbọchị asaa nke mmemme a, aga m enye unu iri uwe mwụda atọ, nyekwa unu iri uwe mwụda atọ ọzọ akpara akpa. 13 Ọ bụrụkwanụ na unu enweghị ike kọwaa ya, unu ga-enye m iri uwe mwụda atọ, na iri uwe mwụda atọ akpara akpa.”
Ha niile kwenyere sị, “Ọ dị mma. Kwuo ka anyị nụ.”
14 Ọ gwara ha sị,
“Ihe oriri si nʼime onye na-eri eri na-apụta,
ọzọkwa, ihe dị ụtọ si nʼime onye dị ike pụta.”
Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ha enwebeghịkwa ike kọwaa ya.
15 Ma nʼụbọchị nke anọ, ha jekwuuru nwunye Samsin gwa ya okwu sị, “Chọọ ụzọ rafụta di gị ọnụ, ka ọ gwa gị ihe okwu a pụtara. Ma ọ bụghị ya, anyị ga-akpọ gị na ezinaụlọ nna gị ọkụ. Ọ bụ ịnapụ anyị ihe anyị nwere ka unu ji kpọọ anyị oku bịa nʼebe?”
16 Mgbe ahụ nwunye Samsin buuru onwe ya tụọ nʼelu ahụ ya, nʼebe akwa, sị, “Ị kpọrọ m asị! Nʼezie, ị hụghị m nʼanya. Ị tụụrụ ndị m ilu, ma ị gwaghị m ọsịsa ya.”
Ọ sịrị ya, “Lee, agwaghị m nne na nna m, ọ bụkwa gị ka m ga akọwara ya?” 17 Ma nwanyị ahụ kwagidere akwa abalị asaa ha nọ na mmemme ahụ. Nʼikpeazụ, nʼụbọchị nke asaa, Samsin kọwaara ya okwu ahụ nʼihi na ọ nọgidere na-enye ya nsogbu. Nwanyị ahụ gakwara kọwaara ụmụ okorobịa obodo ihe okwu ahụ pụtara.
18 Ma tupu anwụ adaa nʼụbọchị nke asaa ahụ, ndị ikom obodo ahụ sịrị ya,
“Olee ihe dị ụtọ karịa mmanụ aṅụ?
Gịnị dịkwa ike karịa ọdụm?”
Ma Samsin zara sị ha,
“A sị na unu enyeghị nwa ehi m nsogbu,
unu agaraghị enwe ike kọwaa ya.”
19 Otu mgbe ahụ kwa, Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị ya. O sitere nʼebe ahụ pụọ, gaa nʼobodo Ashkelọn.§ Nʼebe ahụ ka ọ nọ tigbuo iri mmadụ atọ, napụ ha uwe ha niile, chịrị ha chịnye ndị ahụ kọwaara ya ilu ahụ. Ma site nʼoke iwe, o laghachiri nʼụlọ nna ya. 20 E duuru nwunye Samsin dunye enyi Samsin ka ha abụọ bụrụ di na nwunye.
* 14:1 14:1 Timna bụ otu obodo nʼihe nketa ebo Dan Jos 19:43 Ọ bụ obodo ndị Filistia, tupu ndị Izrel e merie ha. 14:2 14:2 Jen 38:13; Jos 15:10,57 14:5 14:5 Nʼoge ahụ, ọtụtụ ọdụm bi na ndịda ala Palestia. § 14:19 14:19 Ashkelọn bụ otu obodo nʼala Palestia.