5
Abụ Debọra
Nʼụbọchị ahụ, Debọra na Barak nwa Abinoam bụrụ abụ* sị,
“Mgbe ndị ndu na-edu nʼIzrel,
mgbe ndị mmadụ jikwa afọ ofufu nye onwe ha,
toonu Onyenwe anyị!
 
“Nụrụnụ nke a, unu ndị eze, Geenụ ntị, unu ndịisi!
Mụ onwe m, ọ bụladị mụ onwe m, ga-abụku Onyenwe anyị abụ.
Aga m abụ abụ otuto nye Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel.
 
 
Onyenwe anyị, mgbe i si Sia pụta,
mgbe i sitere nʼala Edọm gabiga,
ụwa mara jijiji, mmiri ozuzo dị ukwuu
sikwa na mbara eluigwe zodata.
E, ọ bụladị ugwu ukwu niile mara jijiji nʼihu Onyenwe anyị.
Ugwu Saịnaị makwara jijiji nʼihu Onyenwe anyị, Chineke Izrel.
 
“Nʼụbọchị Shamga, nwa Anat,
nʼụbọchị Jael, ndị ịnyịnya ibu na-azụ ahịa nʼọzara kwusịrị,
ndị ije niile na-esi nʼakụkụ ụzọ gbagọrọ agbagọ na-aga.
Ọ dịkwaghị ihe gara aga nʼobodo Izrel,
tutu ruo mgbe m bịara,
ee, mgbe m bụ Debọra bịara dịka nne nye Izrel.
Mgbe ụmụ Izrel họrọ ife chi ndị ọzọ ofufe,
mgbe agha bịara nʼọnụ ụzọ ama niile,
ahụghị ọ bụladị otu ụta maọbụ ùbe.
E, ọ bụladị nʼetiti iri puku ndị agha anọ, a hụghị otu ngwa agha ọbụla.
Ma ugbu a, ana m aṅụrị ọṅụ banyere ndị na-achị ụmụ Izrel.
Ndị ji obi ha niile were onwe ha nye nʼetiti ndị Izrel.
Toonu Onyenwe anyị!
 
10 “Kwupụtanụ ya, unu ndị na-agba ịnyịnya ibu dị ọcha,
unu ndị na-anọkwasị nʼelu akwa dị oke ọnụahịa nʼelu ịnyịnya unu,
na unu ndị na-eji ukwu na-agagharị nʼokporoụzọ.
Tụleenụ 11 olu abụ igwe mmadụ ndị nọ nʼakụkụ olulu mmiri niile.
Ha na-akọ akụkọ mmeri niile nke Onyenwe anyị,
ya bụ, mmeri nke obodo nta ya niile nʼIzrel.
 
“Mgbe ahụ, ndị nke Onyenwe anyị
ridara gaa nʼọnụ ụzọ ama niile e si abata nʼobodo.
12 ‘Teta, teta, gị Debọra!
Teta, teta, bụọ abụ.
Bilie, gị Barak nwa Abinoam, bilie!
Duru ndị ahụ niile ị dọtara nʼagha.’
 
13 “Ndị fọdụrụ na ndị a na-asọpụrụ rịdatara,
ndị nke Onyenwe anyị bịakwutere m imegide ndị dị ike.
14 Ụfọdụ si Ifrem bịa, bụ ndị ahụ nwere mgbọrọgwụ nʼala ndị Amalek,
ndị Benjamin sokwa pụta,
ndị ndu sikwa Makia bịa,
ndị na-eso ndị ndu sikwa Zebụlọn pụta.
15 Ndị ndu ebo Isaka pụkwutekwara Debọra.
E, Isaka sokwara Barak
na ndagwurugwu ahụ ka ezigara ha nʼokpuru ya.
Ma nʼetiti ndị Ruben,
ha nọ na-atụgharị uche.
16 Gịnị mere unu ji nọdụ nʼetiti ọgba atụrụ,
ịnụ ụda ọja a na-egburu igwe atụrụ?
Nʼetiti obodo niile nke Ruben,
ka e nwere ọtụtụ ntụgharị uche.
17 Ndị Gilead nọgidere nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan.
Ndị Dan nọgidekwara nʼime ụgbọ mmiri ha.
Ndị Asha nọgidere nʼahụ udo
nʼakụkụ ọnụ mmiri.
18 Ma ndị Zebụlọn na Naftalị jiri ndụ ha chụọ aja,
pụọ nʼọzara ibu agha ahụ.
 
19 “Ndị eze ala Kenan bịara ọgụ na Teanak,
nʼakụkụ mmiri ala Megido.
Ma ha enweghị mmeri ọbụla.
Ha akwataghị ọlaọcha maọbụ ihe nkwata ọzọ nʼagha.
20 Ọ bụladị kpakpando niile
dị na mbara eluigwe lụrụ ọgụ megide Sisera.
21 Mmiri na-achị ọkụ nke iyi ukwu Kishọn bupụrụ ha niile.
Ya mere, mkpụrụobi m gaa nʼihu,
zoo ụkwụ gị nʼala, dị ike dịka ọdụm!
22 Gee ntị nụrụ ụda nzọ ụkwụ nke ịnyịnya ndị iro.
Leekwa mwuli elu nke ụkwụ ịnyịnya ahụ!
23 Ma Mmụọ ozi Onyenwe anyị sịrị,
‘Bụọ Meroz§ ọnụ.’
‘Bụọ ndị bi na ya ọnụ ebe ọ dị ukwuu,
nʼihi na ha abịaghị nyere Onyenwe anyị aka imeri ndị iro ya.’
 
 
24 “Onye a gọziri karịchasịa ka Jael,
nwunye Heba onye Ken bụ,
e, onye a gọziri karịchasịa ndị inyom niile na-ebi nʼụlọ ikwu.
25 Nwoke ahụ rịọrọ mmiri, ma o nyere ya mmiri ara ehi,
o ji iko kwesiri ndị a na-asọpụrụ nye ya mmiri ara ehi rahụrụ arahụ.
26 O setịpụrụ aka ya were ǹtu ji ụlọ ikwu ahụ,
aka nri ya welitere mkpirisi igwe nke onye ọrụ ji arụ ọrụ.
Ọ kpọrọ ya Sisera otu mkpọ, kpọrie ya isi,
ọ kpọwasịrị, ma kpọmie ǹtu ahụ nʼegedege ihu ya.
27 Nʼụkwụ ya ka o milara nʼala,
nʼebe ahụ ọ dara, ka o dinara.
Nʼụkwụ ya ka o milara nʼala, nʼebe ọ dara,
nʼebe ahụ o milara nʼala, nʼebe ahụ ọ dara nwụọ.
 
28 “Nne Sisera si na oghereikuku lepụ anya
nʼazụ oghere ịnata ikuku, o tiri mkpu,
‘Gịnị mere ụgbọala igwe ya ji anọ ọdụ ịbịa?
Gịnị ji na mkpọtụ ụkwụ ụgbọala ya adawabeghị?’
29 Ma otu nʼime ndị inyom na-ejere ya ozi, nke makarịsịrị ibe ya nʼihe.
E, ya onwe ya kwukwara sị,
30 ‘Ọ bụ na ha adịghị achọta ma na-ekekwa ọtụtụ ihe a kwatara nʼagha:
onye agha ọbụla ga-eketa otu nwaagbọghọ, maọbụ abụọ.
Sisera ga-enweta uwe nwere ọtụtụ agwa dị iche iche,
uwe nwere ọtụtụ agwa ndị a kpara nke ọma
uwe ndị akpaziri nke ọma maka ịnya nʼolu m,
ihe ndị a niile dịka ihe nkwata nʼagha?’
 
 
31 Onyenwe anyị, biko, ka ndị iro gị niile si otu a laa nʼiyi.
Ka ndị niile hụrụ gị nʼanya nwupụta ihe dịka anyanwụ
mgbe o biliri nʼike.”
E nwere izuike nʼala ahụ iri afọ anọ.
* 5:1 5:1 Banyere mmeri ahụ dị ukwu 5:4 5:4 Duuru anyị gabiga ọzara Edọm 5:8 5:8 Ndị iro ha ekwekwaghị ka onye Izrel ọbụla jide ngwa agha ọbụla. § 5:23 5:23 Meroz bụ obodo dị nʼebo Naftalị. Ha esonyeghị ndị Izrel mgbe ha na-alụ agha, ha e nyeghịkwa aka jide ndị iro Izrel e meriri emeri, mgbe ha na-agbapụ ọsọ ndu, ya mere e ji bụọ ha ọnụ.