Oziọma Jọn
1
Okwu ghọrọ mmadụ
Na mbụ okwu ahụ dịrịị, okwu ahụ na Chineke nọ, okwu ahụ bụkwa Chineke. Ya na Chineke nọ site na mbụ. E sitere na ya kee ihe niile, ọ dịghịkwa ihe ọbụla e kere eke nke a na-ekeghị site na ya. Nʼime ya ka ndụ dịrịị, ndụ ahụ bụkwa ìhè nye mmadụ niile, ìhè ahụ na-enwu nʼime ọchịchịrị, ma ọchịchịrị ahụ emenyụghị ya.
Ọ dị otu nwoke Chineke zitere, aha ya bụ Jọn. Ọ bịara dị ka onye akaebe ịgba ama banyere ìhè ahụ, ka mmadụ niile site nʼaka ya kwere. Ya onwe ya abụghị ìhè ahụ, ọ bịara naanị ịgba akaebe banyere ìhè ahụ.
Ezi ìhè ahụ nke na-enye mmadụ ọbụla ìhè na-abịa nʼime ụwa. 10 Ọ bịara nʼụwa, ma ụwa bụ ihe e kere site nʼaka ya, ma ụwa amataghị onye ọ bụ. 11 Ọ bịakwutere ihe ndị ahụ bụ ndị nke ya, ma ndị ahụ bụ ndị nke ya anabataghị ya. 12 Ma ndị ahụ niile nabatara ya, ndị ahụ niile kweere nʼaha ya ka o nyere ike ịghọ ụmụ Chineke. 13 Ụmụ a na-amụghị site nʼọbara, maọbụ site na mkpebi nke anụ ahụ, ma ọ bụkwanụ mkpebi nke mmadụ, kama site na Chineke.
14 Okwu ahụ ghọrọ anụ ahụ* birikwa nʼetiti anyị. Anyị ahụla ebube ya, ebube nke onye naanị ya bụ Ọkpara Nna mụrụ, onye si nʼebe Nna nọ bịa, onye jupụtara nʼamara na eziokwu.
15 Jọn gbara ama banyere ya mgbe ọ na-eti mkpu na-asị, “Onye a bụ onye ahụ m kwuru banyere ya, ‘Onye na-abịa m nʼazụ dị ukwuu karịa m, nʼihi na o bukwa m ụzọ dịrị.’ ” 16 Site nʼịba ụba nke amara ya, anyị niile anatala amara a tụkwasịrị nʼamara. 17 Nʼihi na e nyere iwu site nʼaka Mosis, ma amara na eziokwu bịara site nʼaka Jisọs Kraịst. 18 Ọ dịbeghị onye ọbụla hụrụla Chineke, ma Chineke, onye naanị ya bụ Ọkpara Nna mụrụ. Onye ya na Nna dị na mma, emeela ka anyị mata ya.
Jọn ekwupụta na ya abụghị Kraịst
19 Nke a bụ ịgba ama Jọn mgbe ndị ndu ndị Juu nọ na Jerusalem zipụrụ ndị nchụaja na ndị Livayị ka ha bịa jụọ ya onye ọ bụ? 20 O mechighị ọnụ ya, kama o kwupụtara sị, “Abụghị m Kraịst ahụ.”
21 Mgbe ahụ ha jụrụ ya sị, “Ị bụkwanụ onye? Ị bụ Ịlaịja?”
Ọ zara sị ha, “Abụghị m ya.”
“Ị bụ Onye amụma ahụ?”
“Mba.”
22 Ha sịrị ya, “Ị bụ onye? Nye anyị ọsịsa anyị ga-eweghachiri ndị zitere anyị. Gịnị ka i kwuru banyere onwe gị?”
23 Ọ sịrị, dịka Aịzaya onye amụma kwuru, “Abụ m onye na-eti mkpu nʼime ọzara, ‘Meenụ ka ụzọ Onyenwe anyị guzozie.’ ”
24 Ma ndị Farisii ahụ ezitere 25 jụrụ ya, sị, “Gịnị mere i ji na-eme baptizim ọ bụrụ na ị bụghị Kraịst maọbụ Ịlaịja, maọbụ onye amụma ahụ?”
26 Jọn zara ha sị, “Eji m mmiri na-eme baptizim, ma ọ dị otu onye nọ nʼetiti unu nke unu na-amaghị. 27 Onye ahụ nke na-abịa nʼazụ m, onye m na-erughị ịtọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya.”
28 Ihe a mere na Betani nʼofe osimiri Jọdan bụ ebe Jọn nọ na-eme baptizim.
Nwa atụrụ Chineke
29 Nʼechi ya, ọ hụrụ ka Jisọs na-abịakwute ya sị, “Leekwa, Nwa Atụrụ Chineke, onye na-ebupụ mmehie ụwa. 30 Ọ bụ onye a ka m kwuru okwu ya mgbe ahụ m sịrị, ‘otu nwoke na-abịa nʼazụ m, onye dị ukwuu karịa m, nʼihi na o bukwa m ụzọ dịrị.’ 31 Mụ onwe m amataghị ya, ma a bịara m were mmiri na-eme baptizim nʼihi nke a, ka e kpughee ya nye ndị Izrel.”
32 Mgbe ahụ Jọn gbara ama a sị, “Ahụrụ m ka Mmụọ Nsọ sitere nʼeluigwe rịdata dị ka nduru, nọkwasị ya. 33 Mụ onwe m amabughị ya, ma onye ahụ zitere m ka m jiri mmiri mee baptizim kwuru, ‘Onye ahụ ị ga-ahụ, onye Mmụọ Nsọ ga-ebekwasị, ma nọgidekwa, ọ bụ ya ga-eji Mmụọ Nsọ mee baptizim.’ 34 Mụ onwe m ahụla ya, na-agbakwa ama na onye a bụ Ọkpara Chineke.”
Ndị mbụ soro Kraịst
35 Nʼechi ya, Jọn na mmadụ abụọ ndị na-eso ụzọ ya guzoro nʼebe ahụ ọzọ. 36 Mgbe ọ hụrụ Jisọs ka ọ na-agafe, ọ sịrị, “Leenụ, Nwa Atụrụ Chineke.”
37 Mgbe mmadụ abụọ ahụ na-eso ụzọ ya nụrụ nke a, ha tụgharịrị soro Jisọs. 38 Mgbe Jisọs tụgharịrị hụ ka ha na-eso ya, ọ sịrị ha, “Gịnị ka unu chọrọ?”
Ha sịrị ya, “Rabbi”§ (nke pụtara “Onye ozizi”), “olee ebe i bi?”
39 Ọ sịrị ha, “Bịanụ, unu ga-ahụ.”
Ha sooro ya ga hụ ebe ọ na-anọ. Ha nọnyekwara ya ụbọchị ahụ niile. Ọ bụ nʼihe dị ka elekere anọ nke mgbede.
40 Otu nʼime mmadụ abụọ ahụ nụrụ ihe Jọn kwuru, nke sooro ya bụ Andru nwanne Saimọn Pita. 41 Ihe mbụ o mere bụ ịchọta Saimọn nwanne ya sị ya, “Anyị achọtala Mezaya ahụ” (onye a na-akpọkwa Kraịst). 42 Ọ kpọtaara ya Jisọs.
O lere ya anya sị, “Ị bụ Saimọn nwa Jọn. A ga-akpọ gị Sefas” (nke nsụgharị ya, pụtara Pita*).
Jisọs akpọọ Filip na Nataniel
43 Nʼechi ya, o kpebiri ịga Galili. Mgbe ọ hụrụ Filip, ọ sịrị ya, “Soro m.”
44 Filip bụ onye obodo Betsaida dị ka Andru na Pita. 45 Filip chọtara Nataniel sị ya, “Anyị achọtala onye ahụ Mosis dere banyere ya nʼiwu, onye ndị amụma dekwara banyere ya, Jisọs onye Nazaret, nwa Josef.”
46 Nataniel sịrị ya, “Ihe ọma ọbụla ọ pụrụ i si na Nazaret pụta?”
Ma Filip sịrị ya, “Bịa ka ị hụrụ.”
47 Mgbe Jisọs hụrụ ka Nataniel na-abịaru ya nso, o kwuru sị, “Leenụ ezi nwa afọ Izrel onye aghụghọ na-adịghị nʼime ya.”
48 Nataniel sịrị ya, “Olee otu i si mata onye m bụ?”
Jisọs sịrị ya, “Tupu Filip akpọ gị, ahụlarị m gị ka ị nọ nʼokpuru osisi fiig.”
49 Mgbe ahụ, Nataniel zaghachiri, “Onye ozizi, ị bụ Ọkpara Chineke; ị bụ eze Izrel.”
50 Jisọs zara sị ya, “I kwere nʼihi na agwara m gị na ahụrụ m gị nʼokpuru osisi fiig? Ị ga-ahụ ihe dị ukwuu karịa nke a.” 51 Ọ sịkwara ya, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, unu ga-ahụ eluigwe ka o meghere hụkwa ndị mmụọ ozi Chineke ka ha na-arịgokwuru, ma na-arịdakwuru Nwa nke Mmadụ.”
* 1:14 1:14 Maọbụ, mmadụ 1:23 1:23 Aịz 40:3 1:34 1:34 Onye Chineke họọrọ. § 1:38 1:38 Ụfọdụ na-akpọkwa mkpụrụ okwu a, Rabaị. * 1:42 1:42 Sefas bụ asụsụ Hibru, ebe Pita bụ asụsụ Griik, ma ha abụọ pụtara otu ihe okwute.