31
“Nʼoge ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara ya, sị, “Aga m abụ Chineke nke agbụrụ Izrel niile. Ha ga-abụkwa ndị m.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Ndị ahụ gbanarịrị mma agha
ga-ahụta ihuọma nʼọzara.
Aga m abịa iwetara Izrel izuike.”
Onyenwe anyị mere ka anyị hụ ya anya site nʼebe dị anya, na-asị,
“Ọ bụ ịhụnanya nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi ka m ji hụ gị nʼanya;
Ọ bụ ebere nke na-adịghị agbanwe ka m ji dọta unu nso.
Aga m ewulikwa gị elu ọzọ,
e, aga m eme ka ị bụrụ ihe e wugharịrị ọzọ, gị Izrel bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke.
Mgbe ahụ, ị ga-eji ihe iti egwu gị pụọ
soro ndị ọṅụ juru obi tee egwu.
Mgbe ahụ, ị ga-akụkwa ubi vaịnị a gbara ogige
nʼelu ugwu Sameria.
Ndị ọrụ ubi kụrụ ya
ga-erikwa mkpụrụ si na ya.
Ụbọchị ahụ ga-adị mgbe ndị nche ga-anọ
nʼelu ugwu nta niile nke Ifrem tikuo ndị niile sị ha,
‘Bịanụ ka anyị jeruo Zayọn,
ka anyị jee nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị.’ ”
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Tienụ mkpu ọṅụ nʼihi Jekọb,
tienụ mkpu ọṅụ nʼihi onye ahụ kachasị mba niile nʼịdị ukwuu.
Meenụ ka a nụrụ ya, toonu ma na-asịkwanụ,
Onyenwe anyị, biko, zọpụta ndị gị,
bụ ndị Izrel fọdụrụ.’
Lee, aga m esite nʼala ahụ dị nʼugwu kpọta ha;
aga m eme ka e si na nsọtụ niile nke ụwa chịkọtaa ha.
Nʼetiti ha ka a ga-ahụ ndị kpuru ìsì na ndị ngwụrọ,
na ndị inyom dị ime, na ndị inyom ime na-eme.
Ndị ga-alọta ga-adị nnọọ ukwuu!
Ha ga na-akwa akwa mgbe ha na-alọta,
ha ga-anọkwa nʼekpere mgbe m ga-edulata ha.
Aga m edu ha site nʼakụkụ iyi,
nʼala dị larịị, ebe ha na-agaghị akpọbi ụkwụ ha,
nʼihi na aghọọlara m Izrel nna,
Ifrem bụkwa ọkpara m.
 
10 “Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu mba niile;
kwusaanụ ya nʼebe dị anya nke ala ahụ dị nʼakụkụ osimiri niile.
Onye ahụ chụsara Izrel ga-achịkọtakwa ha.
Ọ ga-elekọtakwa igwe ewu na atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ.
11 Nʼihi na Onyenwe anyị ga-agbapụta Jekọb,
ọ ga-anapụtakwa ha site nʼaka ndị ka ha ike.
12 Ha ga-abịa nọọ nʼugwu Zayọn tie mkpu ọṅụ,
ha ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi ịdị ukwu nke ezi ihe Onyenwe anyị nyere ha,
dịka ọka, na mmanya ọhụrụ, na mmanụ,
na ụmụ igwe ewu na atụrụ, na ọtụtụ ehi.
Ha ga-adị ka ubi a na-agba mmiri mgbe niile;
ha agaghị erukwa ụjụ ọzọ.
13 Mgbe ahụ, obi ga-atọ ụmụ agbọghọ ụtọ, ha ga-etekwa egwu ọṅụ,
ụmụ okorobịa na ndị agadi ga-aṅụrịkwa ọṅụ.
Aga m eme ka iru ụjụ ha ghọọrọ ha obi ụtọ,
aga m enyekwa ha nkasiobi na ọṅụ nʼọnọdụ mwute.
14 Aga m emekwa ka afọ jubiga ndị nchụaja oke nʼihi ịdị ukwuu nke onyinye ha ga-enweta,
afọ ezi ihe m ga-ejukwa ndị m,”*
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
15 Ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru,
“A nụrụ otu olu na Rema,
iru ụjụ na oke ịkwa akwa.
Rechel na-akwa akwa nʼihi ụmụ ya,
o kwekwaghị ịnabata nkasiobi a na-akasị ya,
nʼihi na ụmụ ya adịghịkwa.”
16 Ma otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Jide olu gị aka, ka ọ ghara ịkwa akwa,
jidekwa anya gị abụọ, ka ha ghara ịgba anya mmiri,
nʼihi na a ga-akwụ gị ụgwọ ọrụ nʼihi ọrụ gị.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
“Ha ga-esite nʼala ndị iro ha lọtakwa.
17 Nʼihi ya, olileanya dịkwara ọdịnʼihu gị.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
“Ụmụ gị ga-alọtakwa nʼala nke aka ha.
 
18 “Anụla m nnọọ ịsụ ude Ifrem, na okwu o kwuru sị,
‘Ị dọọla m aka na ntị dịka nwa ehi nke na-eme isiike.
Lee, amụtala m ihe ị chọrọ ka m mụta site nʼịdọ aka na ntị gị.
Ya mere, kpọlata m, ka m nwee ike lọtakwa,
nʼihi na ị bụ Onyenwe anyị na Chineke m.
19 Mgbe m kpafuru,
echegharịrị m.
Mgbe m ghọtakwara,
e tiri m aka nʼobi m,
ihere mere m, ọ wutekwara m
nʼihi nʼọnọdụ ihe ihere nʼihi ụdị ndụ m biri nʼokorobịa m.’
20 Ifrem, ọ bụghị nwa m nwoke,
onye ihe ya na-atọ m ụtọ?
Ọ bụ ezie na m na-ekwu okwu megide ya,
ma anọkwa m na-echeta ya.
Nʼihi ya, ihe banyere ya na-agụsị obi m agụụ ike.
Ana m enwekwa obi ebere nʼebe ọ nọ.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
 
21 “Manyenụ ogidi ịhụba ụzọ ama,
manyekwanụ osisi ịhụba ụzọ ama.
Lezienụ anya mụta aha okporoụzọ niile,
bụ okporoụzọ unu ga-eso.
Lọta, gị Izrel, bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke,
laghachi nʼobodo gị ndị a.
22 Ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-awagharị,
gị nwaagbọghọ na-ekwesighị ntụkwasị obi Izrel?
Nʼihi na Onyenwe anyị na-aga ime ihe ọhụrụ nʼụwa;
nwanyị ga-anọ nwoke gburugburu.”
23 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwuru, “Mgbe m si na mba ọzọ kpọghachi ha, ndị ga-ebi nʼala Juda na nʼime obodo ya niile ga-ekwu okwu ndị a ọzọ sị: ‘Onyenwe anyị gọzie gị, gị ebe obibi dị nsọ, gị ugwu dị nsọ.’ 24 Ndị mmadụ ga-ebikọta ọnụ na Juda na nʼobodo niile dị nʼime ya, ma ndị na-arụ ọrụ ubi, ma ndị na-elekọta igwe ewu na atụrụ ha. 25 Aga m enwoghakwa ike ndị na-ada mba, meekwa ka afọ ju ndị ike gwụrụ.”
26 Nʼoge a, esi m nʼụra teta, lee anya gburugburu m. Ụra m rahụrụ tọrọ m ụtọ nke ukwuu.
27 Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “Lee, ụbọchị ndị ahụ na-abịa, mgbe m ga-akụ ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ nʼụlọ Izrel na nʼụlọ Juda. 28 Ọ ga-erukwa na dịka m legidere ha anya maka ihopu ha, ikwada ha, itikpọ ha, laa ha nʼiyi, ma mee ka ihe ọjọọ bịakwasịrị ha, otu a ka m ga-esikwa lezie ha anya iwuzi ha na ịkụ ha dị ka mkpụrụ.” Ọ bụ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 29 “Nʼụbọchị ndị ahụ, ndị mmadụ agaghị asịkwa,
“ ‘Nna anyị ha arachaala mkpụrụ osisi na-achaghị acha,
ma lee, eze ụmụ ha na-ejiji ejiji.’
30 Kama onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya; onye rachara mkpụrụ osisi na-achaghị acha ka eze ya ga-ejiji.
31 “Lee, oge na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ dịrị
nʼetiti mụ na ụlọ Izrel,
nakwa ụlọ Juda.
32 Ọ bụghị ụdị ọgbụgba ndụ ahụ
mụ na nna nna ha gbara,
mgbe ahụ m jidere ha nʼaka
site nʼala Ijipt dupụta ha,
nʼihi na ha mebie ọgbụgba ndụ m,
ọ bụ ezie na mụ onwe m bụ di nye ha,”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
33 “Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ mụ na ụlọ Izrel ga-agba
mgbe oge ndị ahụ gasịrị,” ka Onyenwe anyị kwupụtara.
“Aga m etinye iwu m nʼime obi ha,
aga m edekwasịkwa ha nʼuche ha.
Aga m abụ Chineke ha,
ha onwe ha ga-abụkwa ndị m.
34 Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe,
maọbụ otu onye asị ibe ya, ‘Mara Onyenwe anyị,’
nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ,
site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu nʼetiti ha.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
“Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha,
agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ.”
35 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
bụ onye ahụ họpụtara anyanwụ
mee ka ọ na-enye ihe nʼehihie,
onye ahụ nyere ọnwa na kpakpando iwu
ka ha na-enye ihe nʼanyasị,
onye na-akpali oke osimiri,
na-eme ka ebiliri mmiri na-ebigbọ.
Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
36 Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“Ọ bụ naanị ma ụkpụrụ ndị a ọ pụrụ nʼihu m, ghara ịdịkwa,
ka a ga-eme ka ụmụ ụmụ Izrel ghara ịdị,
ka ha ghara ịbụkwa mba nʼihu m ọzọ.”
37 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Ọ bụ naanị mgbe e nwere ike ịtụ ma chọpụta ịsa mbara nke mbara eluigwe,
na ịdị omimi nke ntọala ụwa,
ka m ga-ajụ ụmụ ụmụ niile nke Izrel,
nʼihi ihe niile ha mere.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
38 “Ụbọchị ndị ahụ na-abịa, Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, mgbe a ga-ewugharị obodo a nye m, site nʼụlọ elu Hananel ruo nʼọnụ ụzọ ama Akụkụ. 39 Ịdị ogologo nke eriri ọtụtụ a ga-eji tụọ ya ga-adị ka site nʼihu ọnụ ụzọ ama ahụ ruo nʼugwu Gareb, gaakwa ruo Goa. 40 Ndagwurugwu ahụ niile ebe a tụnyere ozu ndị mmadụ, na ebe e kpofuru ntụ, na mgbada ugwu ahụ niile ebe e doziri edozi maka ịkụ ihe, ruo na ndagwurugwu iyi Kidrọn nke dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama ịnyịnya, ga-aghọkwa ebe dị nsọ nye Onyenwe anyị. A gaghị ehopukwa obodo ahụ ọzọ, maọbụ tikpọọ ya.”
* 31:14 Ndị m ga-enwejubigakwa ihe niile oke 31:37 Ya bụ, ihe ọjọọ