45
Ozi e ziri Baruk
Okwu ndị Jeremaya onye amụma gwara Baruk nwa Neraya, mgbe o dere okwu ndị a nʼakwụkwọ dịka Jeremaya na-akpọpụta ha, nʼafọ nke anọ nke ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya eze Juda. Jeremaya gwara Baruk sị, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị bụ Chineke Izrel na-agwa gị, gị Baruk, Ị sịrị, ‘Ahụhụ dịịrị m! Lee na Onyenwe anyị atụkwasịrịla m mwute nʼelu ihe mgbu nke m nwere. Ike ịsụ ude agwụla m, ma ruo ugbu a, achọtabeghị m izuike.’ Ma ihe ndị a ka ị ga-agwa ya, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, Aga m akwada ihe ndị ahụ niile m wuru, hopukwa ihe ndị ahụ niile m kụrụ nʼala* a niile. Ma gị onwe gị, ị na-achọrọ onwe gị ihe ukwu? Achọkwala ha. Nʼihi na, lee, aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị mmadụ niile, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, ma aga m eme ka ị jiri ndụ gị gbapụ jee ebe ọbụla ị ga-eje.’ ”
* 45:4 45:4 Maọbụ, nʼụwa 45:5 45:5 Ị ga-agbapụ na ndụ ga nʼebe ọbụla ị ga-agbaga