8
“ ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, nʼoge ahụ a ga-esi nʼili ha wezuga ọkpụkpụ ndị eze, na ọkpụkpụ ndịisi ọchịchị Juda, na ọkpụkpụ ndị nchụaja na ndị amụma, na ọkpụkpụ ndị niile bi na Jerusalem. A ga-agbasapụ ha nye anyanwụ, na ọnwa, na kpakpando niile nke mbara eluigwe, bụ ihe ndị ahụ niile ha hụrụ nʼanya na ihe ha na-akpọ isiala nye. Bụkwa ihe ndị ahụ ha na-agbaso, nke ha na-ajụta ase site nʼaka ha, na-efekwa. A gaghị ekpokọta ọkpụkpụ ndị a niile, maọbụ lie ha nʼala. Kama ha ga-aghasara nʼala dịka unyi. Nʼebe niile nke m chụsara ha, bụ ndị fọdụrụ ndụ site na mba ọjọọ a, ha ga-ahọrọ ọnwụ karịa ịdị ndụ. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.’
Mmehie na ahụhụ
“Ị ga-asịkwa ha, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru:
“ ‘Mgbe mmadụ dara ada, ọ dịghị ebili ọtọ?
Mgbe mmadụ daghachiri azụ, ha ọ dịghị alaghachi azụ?
Gịnịkwa mere ndị a ji tụgharịa site nʼịgbaso ụzọ ọjọọ ha?
Gịnị mere Jerusalem ji nọgide na-agbaso ụzọ ọjọọ?
Lee, ha na-ejidesi aghụghọ aka ike;
ha jụrụ ịtụgharị.
Aṅaala m ntị,
ma anụbeghị m ka ihe ọma ọbụla si ha nʼọnụ na-apụta.
O nweghị onye nʼime ha chegharịrị tie aka nʼobi sị,
“Gịnị bụ ihe a m mere?”
Kama onye ọbụla na-agbaso ụzọ nke aka ya,
dịka ịnyịnya nke na-agbaba nʼọgbọ agha.
Ọ bụladị ụgbala na-efegharị na mbara eluigwe
maara oge ya a kara aka.
Nduru, na eleke, na okwolo
makwaara mgbe ha kwesiri isite nʼotu ebe obibi ha gafee nʼebe obibi ọzọ.
Ma ndị m amaghị
ihe Onyenwe anyị chọrọ site nʼaka ha.
 
“ ‘Unu si aṅaa kwuo, “Ndị maara ihe ka anyị bụ,
nʼihi na iwu Onyenwe anyị dị nʼaka anyị,”
ebe ọ bụ na mkpisi akwụkwọ aghụghọ ndị ode akwụkwọ unu
adịghị akọwa iwu ya otu o kwesiri?
A ga-eme ka ihere mee ndị maara ihe;
a ga-eme ka ụjọ jupụta ha obi, meekwa ka ha maa nʼọnya.
Ebe ọ bụ na ha ajụla okwu Onyenwe anyị,
ọ bụ ụdị amamihe dị aṅaa ka ha nwere?
10 Ya mere, aga m akpọnye ndị ikom ọzọ nwunye ha,
werekwa ubi ha nyefee nʼaka ndị ọrụ ubi ọzọ.
Nʼihi na site nʼonye ukwu ruo nʼonye dịkarịsịrị nta,
ọ bụ naanị akpịrị uru na-ezighị ezi ka e ji mara ha.
Ọ bụladị ndị amụma na ndị nchụaja
na-etinyekwa aka nʼọrụ aghụghọ.
11 Ha na-ekechi ọnya ndị m
dịka a ga-asị na ọ dịghị ihe ọ bụ.
Ha na-asị, “Udo dị, udo dị,”
mgbe udo na-adịghị.
12 Ihere o mere ha nʼihi omume arụ ha niile?
Mba! Ihere adịghị eme ha ma ọlị;
nʼezie, ha amakwaghị ihe a na-akpọ inwe ihere.
Nʼihi ya, ha ga-ada nʼetiti ndị dara ada;
ha ga-asọ ngọngọ mgbe e nyere ha ntaramahụhụ.
Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.
 
13 “ ‘Aga m anapụ ha ihe owuwe ubi niile ha nwetara,
otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Ha agaghị enwekwa mkpụrụ vaịnị,
maọbụ mkpụrụ osisi fiig nʼelu osisi fiig ha.
Akwụkwọ osisi ndị a niile ga-akpọnwụ.
A ga-anapụkwa ha
ihe niile m nyere ha.’ ”
 
14 Gịnị ka unu na-eme nʼebe a unu nọdụrụ ala?
Kwakọtaanụ ihe unu niile.
Ngwa, ka anyị gbapụnụ ọsọ gaa nʼobodo ndị ahụ niile e wusiri ike
nọdụ nʼebe ahụ nwụọ!
Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke anyị amaala anyị ikpe ọnwụ.
O nyela anyị mmiri e tinyere nsi ka anyị ṅụọ,
nʼihi na anyị emehiela megide ya.
15 Anyị lere anya udo,
ma o nweghị ihe ọma ọbụla anyị hụrụ.
Anyị lere anya ọgwụgwọ ọrịa anyị,
maọbụ naanị ihe egwu ka anyị hụrụ.
16 E sitere na Dan
nụ ụda ịma imi ịnyịnya ndị iro.
Ala a niile mara jijiji
mgbe ha nụrụ akwa nke ịnyịnya ndị ahụ dị ike.
Ha na-abịa ịla ala a na ihe niile dị nʼime ya nʼiyi.
Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka ha
na-abịa ime obodo a na ndị bi nʼime ya.
 
17 “Lee, ana m ezibata agwọ ọjọọ, ndị na-atagbu atagbu, nʼetiti unu.
Ajụala nke ọ dịkwaghị ụra ga-arata ha.*
Ana m ezibata ha ka ha taa unu.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
 
18 Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na m hụrụ onye ga-akasị m obi nʼime ọnọdụ iru ụjụ m,
nʼihi na obi m na-ada mba nʼime m.
19 Gee ntị nụrụ akwa ndị m
ka ọ na-ada site nʼebe dị anya.
“Onyenwe anyị, ọ sitela na Zayọn pụọ?
Ọ pụtara na Eze ha anọkwaghị nʼebe ahụ?”
 
“Gịnị mere ha ji site nʼoyiyi a tụrụ atụ,
na arụsị ndị mba ọzọ ha na-efe kpasuo m iwe?”
 
20 “Oge owuwe ihe ubi agafeela,
leekwa na ọkọchị agabigakwala,
ma a zọpụtabeghị anyị.”
 
21 Ebe ọ bụ na a zọpịara ndị m, ọ bụkwa m ka azọpịara.
Anam eru ụjụ, oke egwu jisikwara m aka ike.
22 Ọ pụtara na o nweghị mmanụ otite na-eme ka ọnya laa dị na Gilead?
Ọ bụ na e nwekwaghị dibịa nọ nʼebe ahụ?
Gịnị mere o nweghị ọgwụgwọ dịrị ndị m
nʼihi mmerụ ahụ ha niile?
* 8:17 8:17 Ihe pụrụ ime na ha agaghị ata unu 8:18 8:18 Maọbụ, Unu ndị na-akasị m obi nʼime ọnọdụ iru ụjụ m, obi m na-ada mba nʼime m.