10
Nguzo nke anyanwụ
Mgbe Adoni-Zedek, eze Jerusalem nụrụ na Joshua emeriela Ai, laa ya nʼiyi, gbukwaa eze ya, dịka ọ lara Jeriko na eze ya nʼiyi, mgbe ọ hụkwara na ndị Gibiọn na ndị Izrel emeela udo, na ha bikwa nso ndị Izrel, ọ tụrụ egwu nke ukwuu, ya na ndị ya. Nʼihi na Gibiọn bụ obodo a ma ama, dịka otu nʼime obodo ndị eze, ndị ikom ya bụkwa ndị dị ike, nʼihi na ọ dịkwa ukwuu karịa Ai. Ndị ikom ya niile maara otu e si ebu agha. Ya mere, Adoni-Zedek, eze Jerusalem ziri ozi zigara eze ndị a: Homa, eze Hebrọn, Piram, eze Jamut, Jafia, eze Lakish, na Debịa, eze Eglọn, na-asị, “Bịanụ nyere m aka, ka anyị gaa tigbuo Gibiọn, nʼihi na ha na Joshua na ụmụ Izrel emeela udo.”
Mgbe ahụ, eze ise ndị Amọrait ndị a, eze Jerusalem, na eze Hebrọn, na eze Jamut, na eze Lakish na eze Eglọn chịkọtara ndị agha. Ha na ndị agha ha gara were ọnọdụ ha imegide Gibiọn, ha lụsokwara ha ọgụ.
Ma ndị Gibiọn mere ngwangwa zigara Joshua ozi nʼụlọ ikwu dị na Gilgal sị ya, “Bịa nyere ndị ohu gị aka. Bịa ngwangwa zọpụta anyị, nʼihi na eze niile nke ndị Amọrait, ndị bi nʼugwu, abịala nʼebe a, ha na ndị agha ha ibuso anyị agha.”*
Joshua na ndị agha ya niile, tinyere ndị ahụ niile ibu agha were anya, hapụrụ Gilgal gawa ịzọpụta Gibiọn. Ma Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị ya, “Atụla ha egwu! Nʼihi na ha bụ ndị e meriri emeri. Enyela m ha nʼaka unu ịla ha nʼiyi. Ọ dịkwaghị otu onye nʼetiti ha nwere ike iguzo nʼihu unu.”
Joshua bịakwutere ha na mberede, nʼihi na ogologo abalị niile ka o si Gilgal gaa njem. 10 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị tinyere ha nʼọnọdụ ọgbaaghara mgbe ha zutere ndị Izrel. Nke a mere ka ndị agha Izrel lụgbuo ha na Gibiọn. Nʼezie, ọnụọgụgụ ndị ha tigburu na Gibiọn dị nnọọ ukwuu. Ma ha chụkwara ndị fọdụrụ ọsọ chụruo ha Bet-Horon, na Azeka, na Makeda, na-egbu ha nʼụzọ. 11 Mgbe ha si nʼihu Izrel gbapụ ọsọ nʼụzọ nrịda Bet-Horon na-aga Azeka, Onyenwe anyị sitere nʼelu na-atụdakwasị ha ọtụtụ mkpụrụ mmiri. Ọnụọgụgụ ndị mkpụrụ mmiri ndị a dagburu dị ukwuu karịa ndị ụmụ Izrel ji mma agha ha gbuo.
12 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị mere ka ndị Izrel lụgbuo ndị Amọrait. Joshua gwara Onyenwe anyị okwu nʼihu ndị Izrel niile sị,
“Gị, anyanwụ, guzo nʼotu ebe na mbara eluigwe Gibiọn.
Gị, ọnwa, guzokwa nʼotu ebe na mbara eluigwe na Ndagwurugwu Aijalon”
13 Anyanwụ guzoro,
ọnwa guzokwa.
Ha abụọ adaghị tutu ruo mgbe ndị agha mba ahụ gbuchasịrị ndị iro ha.
Ihe banyere akụkọ agha a ka e dere nʼakwụkwọ Jasha.
Ya mere, anyanwụ guzoro nʼotu ebe nʼetiti mbara eluigwe. Ọ nọkwa nʼotu ebe ihe dịka otu ụbọchị zuru ezu. 14 O nweghị ụbọchị ọzọ dịka ụbọchị ahụ nʼoge niile gara aga. Ọ dịbekwaghị ụbọchị yiri ụbọchị ahụ ruo taa. Ọ bụ ụbọchị Onyenwe anyị mere ka anyanwụ na ọnwa kwụsị, nʼihi naanị ekpere otu nwoke. Nʼihi na Onyenwe anyị na-eburu Izrel agha.
15 Joshua na ndị Izrel niile laghachiri nʼọmụma ụlọ ikwu dị na Gilgal.
Ogbugbu ndị eze Amọrị ise
16 Ma nʼoge ahụ a na-alụ agha ahụ, ndị eze ise ahụ si nʼọgbọ agha gbapụ, zoo onwe ha nʼime ọgba nkume dị na Makeda. 17 Mgbe ozi ruru Joshua ntị, na a chọtala eze ise ndị ahụ, ebe ha zoro onwe ha nʼime ọgba nkume dị na Makeda, 18 Joshua nyere iwu sị, “Werenụ nkume buru ibu mechie ọnụ ọgba nkume ahụ. Debekwanụ ndị nche nʼebe ahụ, ka ha chee ndị eze ahụ nche. 19 Ma unu eguzola nʼebe ahụ nʼonwe unu, chụsonụ ndị iro unu, na-egbukwanụ ha site nʼazụ. Unu ekwela ka ha gbaba nʼobodo ha dị iche iche, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu enyefeela ha nʼaka unu.”
20 Ya mere, Joshua na ndị Izrel tigbuchara ha kpamkpam nʼụzọ dị egwu, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole nʼime ha nwere ike gbaba nʼime obodo ha e wusiri ike. 21 Ndị agha niile laghachikwuru Joshua nʼọmụma ụlọ ikwu ha dị na Makeda nʼudo. Ọ dịkwaghị onye ọbụla nwara anwa kwuo okwu megide ndị Izrel nʼala ahụ.
22 Mgbe ahụ Joshua sịrị, “Megheenụ ọnụ ọgba nkume ahụ, wepụtanụ ndị eze ise ahụ.” 23 Ya mere, ha kpọpụtara ndị eze ise ahụ site nʼọgba nkume ahụ, ha bụ eze Jerusalem, na eze Hebrọn, na eze Jamut, na eze Lakish, na eze Eglọn. 24 Mgbe a kpụtara ha nʼihu Joshua, ọ kpọrọ ndị ikom Izrel niile ka ha zụkọta, ọ gwara ndịisi agha bụ ndị so ya jee, “Bịanụ nso, zọkwasịnụ ụkwụ unu nʼolu eze ndị a.” Ya mere, ha bịara zọkwasị ụkwụ ha nʼolu ha.
25 Joshua sịrị ha, “Unu atụla egwu, maọbụ daa mba. Dịnụ ike, nweekwanụ ume, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị ga-eme ndị iro unu niile bụ ndị na-ebuso unu agha.” 26 Emesịa, Joshua ji mma agha ya gbuo eze ise ndị a. Ọ kwụbara ha nʼelu osisi ise, ebe ha nọ ruo nʼoge anyasị.
27 Ma mgbe anwụ bidoro ịda, Joshua nyere iwu ka e site nʼosisi wedata ozu ndị eze ise ahụ, tụba ha nʼime ọgba nkume ahụ, ebe ha zoro onwe ha. Ha ji nkume dị ukwuu mechie ọnụ ọgba nkume ahụ. Nkume ukwuu ahụ dịkwa nʼebe ahụ ruo taa.
Obodo ndị ọzọ Joshua lụgburu
28 Nʼotu ụbọchị ahụ, Joshua lara obodo Makeda nʼiyi, jiri mma agha gbuo eze ya, na onye ọbụla bi nʼime ya. Ọ dịkwaghị onye ọbụla nọ nʼime obodo ahụ ọ hapụrụ ndụ. Otu ihe ahụ o mere eze Jeriko ka o mere eze Makeda.
29 Joshua na ndị Izrel niile so ya sitere na Makeda gaa na Libna lụso ya agha. 30  Onyenwe anyị nyekwara obodo a na eze ya nʼaka Izrel. Joshua weere mma agha ya tigbuo mmadụ niile dị nʼime ya. O nweghị onye ọbụla nke ọ hapụrụ ndụ nʼebe ahụ. O mekwara eze obodo a ihe o mere eze Jeriko.
31 Site na Libna, Joshua na ndị Izrel gara ruo Lakish, lụso ha agha. 32 Ma Onyenwe anyị nyefere Lakish nʼaka ụmụ Izrel. Joshua lụgburu ya nʼụbọchị nke abụọ ya. Ha weere mma agha ha tigbuo mmadụ niile bi nʼime ya, dịka ha mere Libna. 33 Ma mgbe a na-alụ agha na Lakish, Horam eze Gaza, duuru ndị agha ya bịa inyere ndị obodo Lakish aka, ka ha si otu a gbochie ndị agha Izrel ịbata nʼime ya. Ma ndị agha Joshua gburu ya, laa ndị agha ya niile nʼiyi, ruo na ọ fọdụghị otu onye.
34 Emesịa, nʼụbọchị ahụ kwa, Joshua na ndị Izrel hapụrụ Lakish gaa Eglọn lụgbuo ya. 35 Ha were obodo ahụ nʼotu ụbọchị ahụ, jiri mma agha ha tigbuo mmadụ niile dị nʼime obodo ahụ, dịka ha mere na Lakish.
36 Mgbe Joshua na ndị Izrel sitere nʼEglọn pụọ, ha gara Hebrọn buso ya agha. 37 Ha weere obodo ahụ, jiri mma agha gbuo eze ha, na obodo nta niile gbara ya gburugburu. Ha gburu ndị mmadụ niile bi nʼime ya dịka ha mere nʼEglọn. Ọ dịkwaghị otu onye a hapụrụ ndụ.
38 Joshua na ndị Izrel niile ya na ha so laghachiri azụ gaa busoo Debịa agha. 39 Ha meriri obodo a, na obodo nta niile gbara ya gburugburu, na eze ya, jiri mma agha gbuchapụ ha niile, mmadụ niile nọ nʼime ya ka ha gburu kpamkpam. Ha ahapụghị onye ọbụla ndụ, ha mere Debịa na eze ya dịka ha mere Libna na eze ya, na Hebrọn kwa.
40 Ya mere, Joshua na ndị agha ya meriri obodo ahụ niile, na ala ahụ niile. O meriri eze niile nke obodo ugwu ahụ, na ndị bi na Negeb, na mgbada ala ugwu dị nʼọdịda anyanwụ, na mgbada ala ugwu ugwu ahụ. O gbuchara mmadụ niile bi nʼala ahụ, dịka Onyenwe anyị, Chineke Izrel si nye ya iwu. 41 Joshua tigburu ha niile site na Kadesh Banea ruo Gaza, sitekwa na Goshen ruo Gibiọn. 42 Eze ndị a niile, na ala ha niile, ka Joshua meriri nʼotu oge ibu agha, nʼihi na Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-alụrụ Izrel agha.
43 Emesịa, Joshua na ndị Izrel niile laghachiri nʼọmụma ụlọ ikwu ha dị na Gilgal.
* 10:6 10:6 Ọgbụgba ndụ ahụ dị nʼetiti ụmụ Izrel na ndị Gibiọn, pụtara na Joshua ga na-enyere ha aka, nʼoge ọbụla e nwere ndị bịara ibuso ha agha. 10:41 10:41 Ka anyị ghara iche na Goshen nke a, bụ otu ihe ya na nke ahụ dị nʼakụkụ mmiri nʼala Ijipt, nke a dị ndịda ala Palestia. Jos 11:16; 15:51