3
Ngabiga osimiri Jọdan
Nʼisi ụtụtụ, Joshua na ụmụ Izrel niile hapụrụ Shitim bịaruo nʼakụkụ osimiri Jọdan, maa ụlọ ikwu nʼebe ahụ. Nʼebe a ka ha nọ chere tutu ruo mgbe ha ga-agafe. Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ndịisi ụmụ Izrel gabigara jegharịa nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ahụ, nye ha iwu sị, “Mgbe unu hụrụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke unu, ka ndị nchụaja, ụmụ Livayị, bulitere ya, unu onwe unu ga-esi nʼebe unu nọ bilie soro ha nʼazụ. Ma a ga-enwe oke nʼetiti unu na ha, ihe dịka otu kilomita site nʼebe igbe ọgbụgba ndụ ahụ dị. Unu agaghị abịaru ya nso. Nke a bụ maka ị mara ụzọ unu ga-eso, nʼihi na unu esibeghị nʼụzọ a gaa ije mbụ.”
Joshua gwara ndị Izrel sị, “Doonụ onwe unu nsọ, nʼihi na echi ka Onyenwe anyị ga-eme oke ihe ebube dị iche iche nʼetiti unu.”
Joshua gwara ndị nchụaja sị ha, “Bulienụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ, gabiga nʼihu ndị Izrel.” Ha buliri igbe ọgbụgba ndụ ahụ, bido ịga nʼihu ụmụ Izrel.
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua sị, “Taa, ka m ga-amalite ime ka ị dị ukwuu nʼanya ụmụ Izrel niile, ka ha niile mata na dịka m si nọnyere Mosis, otu a ka m ga-esi nọnyere gị. Ị ga-enye ndị nchụaja bụ ndị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ iwu si, ‘Mgbe unu ruru nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan, banyekwanụ gaa guzo nʼime osimiri ahụ.’ ”
Mgbe ahụ, Joshua gwara ụmụ Izrel niile sị, “Bịanụ nso, bịanụ nụrụ okwu niile nke Onyenwe anyị Chineke unu. 10 Otu a ka unu ga-esi mata nʼezie na Chineke dị ndụ nọ nʼetiti unu, unu ga-amatakwa na ọ ghaghị ịnapụ ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Hiv, na ndị Periz, na ndị Gigash, na ndị Amọrait, na ndị Jebus ala ha nʼihu unu. 11 Lee, igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Onyenwe ụwa niile ga-agabiga nʼihu unu banye nʼime Jọdan. 12 Ugbu a sitenụ nʼebo Izrel niile họpụta ndị ikom iri na abụọ, site nʼebo ọbụla otu onye. 13 Ngwangwa ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Onyenwe ụwa niile zọnyere ụkwụ na Jọdan, mmiri Jọdan nke si nʼebe elu ya na-arịdata ga-akwụsị ịsọ, guzoro dịka mgbidi.”
14 Ya mere, mgbe ndị Izrel sitere nʼụlọ ikwu ha bilie njem ịgabiga osimiri Jọdan, ndị nchụaja bụ igbe ọgbụgba ndụ buuru ha ụzọ na-aga ha nʼihu. 15 Nʼoge owuwe ihe ubi ọbụla, osimiri Jọdan na-etoju etoju, sọjukwaa akụkụ ya niile.* Ma ngwangwa ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ a bịaruru nso zọnye ụkwụ ha nʼọnụ mmiri Jọdan, 16 mmiri si nʼelu elu osimiri ahụ kwụsịrị ịsọ, ọ gara elu tụkọta onwe ya dịka mgbidi nʼebe dị anya, nʼobodo a na-akpọ Adam, nke dị nso obodo Zaretan. Ebe mmiri nke na-eruda na-asọbanye osimiri Araba, ya bụ, osimiri Nnu kwụsịrị ịsọ kpamkpam. Ya mere, ndị Izrel gabigara na ncherita ihu Jeriko. 17 Ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị guzoro nʼala akọrọ nʼetiti Jọdan, Izrel niile gabigakwara tutu ruo mgbe mba ahụ niile gafesịrị nʼala akọrọ.
* 3:15 3:15 Jos 4:18; 1Ih 12:15