11
Ọtụtụ ndị inyom Solomọn
Ma eze Solomọn hụrụ ọtụtụ ndị inyom mba ọzọ nʼanya, tinyere nwa nwanyị Fero, ha bụ ndị inyom ndị Moab, ndị Amọn, ndị Edọm, ndị Saịdọn na ndị Het. Ha bụ ndị sitere na mba ndị ahụ Onyenwe anyị gwara Izrel sị, “Unu na ha agaghị alụrịtakwa di na nwunye, nʼihi na ha aghaghị ime ka obi unu gbasoo chi niile ha.” Ma, nʼagbanyeghị nke a, Solomọn rapara ha nʼahụ nʼihi ịhụnanya. Ọnụọgụgụ ndị inyom Solomọn lụrụ dị narị asaa, bụ ndị amụrụ nʼobi ndị eze. O nwekwara ndị iko nwanyị, ọnụọgụgụ ha dị narị atọ. Ndị inyom ya duhiere obi ya. Mgbe Solomọn ghọrọ agadi, ndị inyom ndị a duhiere obi ya mee ka ọ gbasoo chi ndị ọzọ, nke mere na o jikwaghị obi ya niile gbasoo Onyenwe anyị Chineke ya, dịka Devid bụ nna ya mere. Ọ gbasoro Ashtọret, bụ chi ndị Saịdọn na Molek,* bụ chi rụrụ arụ nke ndị Amọn. Nʼụzọ dị otu a, Solomọn mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị. O soghị ụzọ Onyenwe anyị dịka nna ya Devid si mee nʼụbọchị niile nke ndụ ya.
Nʼelu ugwu dị nʼọwụwa anyanwụ Jerusalem, Solomọn wuru ebe dị elu nye Kemosh, chi rụrụ arụ nke ndị Moab, wuokwara Molek chi rụrụ arụ nke ndị Amọn. O mekwara otu ihe ahụ nye ndị nwunye ya niile si mba ọzọ, bụ ndị na-achụ aja nsure ọkụ ihe na-esi isi ụtọ, na-achụkwa aja nsure ọkụ dị iche iche nye chi niile ha.
Onyenwe anyị were iwe dị ukwuu megide Solomọn, nʼihi na obi ya esitela nʼebe Onyenwe anyị Chineke Izrel nọ pụọ, bụ onye mere ka ọ hụ ya anya ugboro abụọ. 10 Ọ bụ ezie na o nyere Solomọn iwu ka ọ ghara ịgbaso chi ndị ọzọ, ma Solomọn erubeghị isi nʼiwu a Onyenwe anyị nyere. 11 Ya mere, Onyenwe anyị gwara Solomọn okwu sị, “Ebe ọ bụ na i mere ihe dị otu a, jụ idebe ọgbụgba ndụ m na ụkpụrụ m, nke m nyere gị idebe, aghaghị m isite nʼaka gị dọkapụ alaeze a, were ya nye otu nʼime ndị na-ejere gị ozi. 12 Ma nʼihi nna gị Devid agaghị m eme ihe ndị a mgbe ị dị ndụ. Aga m anapụ nwa gị nwoke alaeze Izrel. 13 Ma agaghị m anapụcha ya alaeze Izrel niile, kama aga m eme ka ọ bụrụ eze otu ebo Izrel, nʼihi Devid, na nʼihi Jerusalem, obodo m họpụtara nye onwe m.”
Ndị iro Solomọn
14 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị mere ka onye iro bilie megide Solomọn. Onye a bụ Hadad onye Edọm, onye sikwa nʼezinaụlọ ndị eze Edọm. 15 Nʼoge gara aga, mgbe Devid na-ebuso ndị Edọm agha, Joab, onyeisi ndị agha, onye gara ili ndị agha e gburu egbu, tigburu ndị ikom niile nọ nʼEdọm. 16 Joab na ndị agha Izrel niile nọgidere nʼebe ahụ ọnwa isii, tutu ruo mgbe ha gbuchapụrụ ndị ikom niile nọ nʼEdọm. 17 Ma Hadad, onye bụ nwantakịrị nʼoge ahụ, gbapụrụ ọsọ gbaga Ijipt, ya na ụfọdụ ndịisi ọchịchị Edọm, ndị jeere nna ya ozi. 18 Ha sitere nʼala Midia gaa Paran. Site na Paran, ha duuru ụfọdụ ndị mmadụ, ndị sooro ha gaa Ijipt, jekwuru Fero eze Ijipt, onye nyere Hadad ụlọ obibi na ala, nyekwa ya ihe oriri.
19 Hadad hụtara amara nʼihu Fero, nke mere na ọ kpọnyere ya nwanne nwanyị Tapenes bụ nwunye eze ka ọ bụrụ nwunye ya. 20 Nwanne Tapenes mụtara ya nwa nwoke aha ya bụ Genubat, onye Tapenes zụlitere nʼụlọeze. Genubat biri nʼetiti ụmụ Fero.
21 Mgbe Hadad nọ nʼIjipt, ọ nụrụ na Devid sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ na Joab ọchịagha ndị agha anwụọkwala, ọ rịọrọ Fero arịrịọ ka o kwenye ka ọ laghachi nʼEdọm.
22 Fero jụrụ ya ajụjụ sị ya, “Gịnị mere i ji chọọ ịla? O nwere ihe ị chọrọ nke ị na-adịghị enweta nʼebe a?”
Hadad zara sị ya, “O nweghị ihe kọrọ m, kama kwere ka m laghachi.”
23 Nwoke ọzọ Chineke mere ka ọ bụrụ onye iro Solomọn bụ Rezon nwa Eliada, onye gbapụrụ site nʼaka nna ya ukwu bụ Hadadeza, eze Zoba. 24 Devid lara ndị agha Zoba nʼiyi, Rezon chịkọtara ndị ikom gbara ya gburugburu, ghọọ onyendu ha, ndị nnupu isi a gara Damaskọs biri nʼebe ahụ, na-achịkwa nʼebe ahụ. 25 Ogologo ụbọchị niile nke ndụ Solomọn, Rezon bụ onye iro Izrel, tinyekwara nsogbu nke Hadad wetaara Izrel. Rezon bụ eze ndị Aram, bụrụkwa onye na-emegide Izrel.
Nnupu isi Jeroboam
26 Jeroboam nwa Nebat, onye Ifrem nke Zereda, otu nʼime ndị ozi Solomọn, biliri megide eze. Nne ya bụ Zerua, nwanyị di ya nwụrụ anwụ.
27 Nke a bụ akụkọ banyere otu o siri bilie imegide eze: Solomọn wugharịrị Milo, wuziekwa ntipu dị na mgbidi obodo Devid bụ nna ya. 28 Ugbu a Jeroboam, nʼonwe ya, bụ dimkpa. Mgbe Solomọn hụrụ otu nwokorobịa a si arụzi ọrụ ya nke ọma, o mere ya onye nlekọta ndị ọrụ niile si nʼezinaụlọ Josef.
29 Ma otu ụbọchị, mgbe Jeroboam si Jerusalem na-apụ, o zutere Ahija onye amụma, onye Shilo, nʼụzọ, ebe o yi uwe ọhụrụ. Ọ bụkwa naanị ha abụọ nọ nʼọhịa mgbe ahụ. 30 Mgbe ahụ, Ahija yipụrụ uwe ọhụrụ nke o yi nʼahụ dọwasịa ya ụzọ iri na abụọ. 31 Mgbe ahụ, ọ gwara Jeroboam sị, “Chịrị iberibe iri nye onwe gị, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel sịrị, ‘Lee, aga m anapụ Solomọn alaeze a, ma aga m enyekwa gị ebo iri nʼime ha. 32 Ma aga m ahapụrụ ya otu ebo, nʼihi ohu m Devid na nʼihi Jerusalem obodo m họpụtara site nʼebo niile nke Izrel. 33 Nʼihi na ha ahapụla m malite ịkpọ isiala nye Ashtọret, chi nwanyị ndị Saịdọn; na nyekwa Kemosh, chi ndị Moab; na nye Molek, chi ụmụ Amọn. Ha agbasoghị ụzọ m, ha emekwaghị ihe ndị ahụ m gụrụ dịka ezi ihe. Ha edebeghị iwu m na ụkpụrụ m niile dịka Devid nna Solomọn mere.
34 “ ‘Ma agaghị m anapụ alaeze ya ugbu a, nʼihi ohu m Devid, onye m họpụtara, na onye mere ihe tọrọ m ụtọ. Aga m ahapụ Solomọn ka ọ nọgide dịka eze ụbọchị ndụ ya niile. 35 Ma aga m anapụ alaeze ya site nʼaka nwa ya, nye gị ebo iri. 36 Nwa ya ka m ga-enye otu ebo, nʼihi na achọrọ m ka Devid ohu m nọgide ịbụ eze Jerusalem, obodo m họpụtara nye onwe m, ebe m mere ka Aha m dịrị. 37 Ma otu ọ dị, gị ka m ga-ewere. Ị ga-abụkwa onye ga-achị ebe ahụ niile obi gị chọrọ; i ga-abụ eze Izrel. 38 Ọ bụrụ na i gee ntị mee ihe niile m ga-enye gị nʼiwu, jekwa ije nʼirubere m isi, mee ihe ziri ezi nʼanya m, site nʼidebe ụkpụrụ niile na iwu niile, dịka ohu m Devid mere, aga m anọnyere gị. Aga m ewuru gị ụlọ ga-adịgide dịka m siri wuoro Devid. Aga m enyekwa gị Izrel. 39 Aga m eweda agbụrụ Devid nʼihi ihe a, ma ha agaghị abụ ndị e wedara nʼala ruo ebighị ebi.’ ”
40 Solomọn gbalịrị igbu Jeroboam, ma Jeroboam gbaara ọsọ gbakwuru eze Shishak nke Ijipt. Ọ nọkwara nʼIjipt ruo mgbe Solomọn nwụrụ.
Ọnwụ Solomọn
41 Ma banyere ihe ndị ọzọ mere nʼoge ọchịchị Solomọn, nke bụ, ihe niile o mere na amamihe o gosipụtara, ọ bụ na-edeghị ha nʼakwụkwọ akụkọ nke Solomọn? 42 Solomọn chịrị Izrel niile iri afọ anọ na Jerusalem. 43 O sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼobodo Devid bụ nna ya. Rehoboam nwa ya, ghọkwara eze nʼọnọdụ nna ya.
* 11:5 11:5 Maọbụ, Milkọm 11:7 11:7 Ugwu dị nʼọwụwa anyanwụ Jerusalem Ugwu a, bụ Ugwu Oliv, nke aha ọzọ a na-akpọ ya bụ Ugwu rụrụ arụ, 2Ez 23:13 11:40 11:40 Eze Shishak, bụ Fero mbụ chịrị Ijipt na senchuri nke iri. Mgbe ọchịchị pụrụ site nʼaka ezinaụlọ a, ahọpụtara onye ọzọ ga-achị 1Ez 14:25-26; 2Ih 12:2-9