15
Ọchịchị eze Abija
Abija malitere ịbụ eze Juda, nʼafọ iri na asatọ nke ọchịchị eze Jeroboam nwa Nebat. Ọ chịrị afọ atọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Maaka, nwa nwanyị Abishalom.
O mere mmehie niile nna ya mere nʼihu ya; o jighị obi zuruoke gbasoo Onyenwe anyị Chineke ya, dịka obi nna nna ya Devid dị. Ma nʼihi Devid, Onyenwe anyị Chineke ya nyere ya oriọna na Jerusalem, site na-ime ka nwa ya nwoke nọchie ọnọdụ ya nakwa ime ka Jerusalem guzosie ike. Nʼihi na Devid mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa iwu Onyenwe anyị ọbụla nke ọ na-edebeghị nʼụbọchị ndụ ya niile, ma ọ bụghị naanị ihe banyere okwu Ụraya, onye Het.
Agha dị nʼetiti Abija na Jeroboam nʼụbọchị niile nke ndụ Abija. Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Abija, o bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Juda? Agha dịgidere nʼetiti Abija na Jeroboam. Abija sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼobodo Devid. Asa, nwa ya nwoke ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
Asa, eze Juda
Nʼafọ nke iri abụọ nke ọchịchị Jeroboam eze Izrel, ka Asa ghọrọ eze Juda. 10 Ọ chịrị iri afọ anọ na otu na Jerusalem. Aha nne nne ya bụ Maaka, nwa nwanyị Abishalom.
11 Asa mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị dịka Devid nna ya mere.* 12 O sitere nʼala ahụ niile chụpụ ndị ikom akwụna ụlọ arụsị niile, wezugakwa arụsị niile nke ndị nna nna ya ha mere. 13 Ọ chụdakwara ọbụladị nne nne ya bụ Maaka, site nʼọnọdụ ya dịka nne eze, nʼihi na ọ kpụrụ ihe arụ, ogidi Ashera maka iji fee ya ofufe. Asa gbuturu ya kpọọ ya ọkụ na ndagwurugwu iyi Kidrọn. 14 Ọ bụ ezie na o wezugaghị ugwu niile dị elu, ma Asa ji obi zuruoke jere Onyenwe anyị ozi nʼoge ndụ ya niile. 15 O webatara nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị ọlaọcha na ọlaedo na ihe niile nke nna ya na ya onwe ya doro nsọ.
16 Ma agha dịgidere nʼetiti Asa na Baasha, eze Izrel ụbọchị ọchịchị ha niile. 17 Baasha eze Izrel, busoro Juda agha, wuchie Rema igbochi onye ọbụla na-apụ apụ maọbụ onye na-abata abata nʼoke ala Asa, eze Juda.
18 Mgbe ahụ, Asa chịịrị ọlaọcha na ọlaedo niile dị nʼụlọakụ ụlọnsọ Onyenwe anyị, na ndị dị nʼụlọeze ya, nyefee ya nʼaka ndị ozi ya ka ha chịrị ha zigara Ben-Hadad, nwa Tabrimọm, nwa Hezion, bụ eze Aram, onye na-achị na Damaskọs, sị, 19 “Biko, ka anyị gbaa ndụ dịka nna m na nna gị mere. Lee, ana m ezitere gị onyinye ọlaọcha na ọlaedo. Ugbu a, mebie ọgbụgba ndụ dị nʼetiti gị na Baasha, bụ eze Izrel, ka o si nʼebe m nọ wezuga onwe ya.”
20 Ben-Hadad kwenyere eze Asa, zipụ ndị ọchịagha ndị agha ya ka ha gaa buso obodo Izrel niile agha. Ọ lụgburu Ijon, Dan, Ebel-Bet-Maaka na ala Kineret niile, tinyere ala niile nke ndị Naftalị. 21 Mgbe Baasha nụrụ nke a, ọ kwụsịrị iwu Rema, laghachi biri na Tịaza. 22 Mgbe ahụ, eze Asa nyere iwu zigara ndị Juda niile, na ọ dịghị onye iwu ahụ hapụrụ, ha bịara bupusịa nkume na osisi niile dị na Rema, nke Baasha ji na-ewu ihe nʼebe ahụ. Eze Asa ji ihe ndị a wulie Geba nke Benjamin, wuokwa Mizpa.
23 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Asa, na ihe niile ọ rụpụtara na obodo niile ndị o wuru, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe e mere nʼoge ndị eze Juda? Ma ọ rịara ọrịa nke metụtara ụkwụ ya abụọ, mgbe o mere agadi. 24 Asa sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha, nʼobodo Devid, bụ nna ya. Jehoshafat nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
Nadab, eze Izrel
25 Nadab, nwa Jeroboam, malitere ịbụ eze Izrel, nʼafọ nke abụọ nke Asa, eze Juda. Ọ chịrị Izrel afọ abụọ. 26 O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị. Ọ gbasoro ụzọ niile nke nna ya ma na-emekwa otu mmehie ahụ nke nna ya ji duba Izrel nʼime mmehie.
27 Baasha nwa Ahija, onye si nʼebo Isaka gbara izu ọjọọ megide ya. O tidara ya na Gibeton, nʼotu obodo ndị Filistia, mgbe Nadab na ndị Izrel niile nọchibidoro ya. 28 Baasha gburu Nadab, nọchie ọnọdụ ya dịka eze, nʼafọ nke atọ nke ọchịchị Asa, eze Juda.
29 Ngwangwa, mgbe ọ malitere ọchịchị ya, o gburu ndị ezinaụlọ Jeroboam niile. O kweghị ka onye ọbụla na-eku ume fọdụ, kama ọ lara ha niile nʼiyi, dịka okwu Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onyeozi ya, bụ Ahija onye Shilo. 30 Ihe ndị a mere nʼihi mmehie niile Jeroboam mere, nke o mere ka Izrel mee, nakwa nʼihi na ọ kpasuru Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel iwe.
31 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Nadab, o bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Izrel? 32 Ma agha dịgidere nʼetiti Asa na Baasha, eze Izrel, ụbọchị ọchịchị ha niile.
Baasha, eze Izrel
33 Nʼafọ nke atọ nke Asa, eze Juda, Baasha nwa Ahija ghọrọ eze ndị Izrel niile na Tịaza. Ọ chịrị iri afọ abụọ na abụọ. 34 O mere ọtụtụ ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị. Ọ gbasoro ụzọ ọjọọ niile nke Jeroboam, jeekwa ije nʼime otu mmehie ahụ nke Jeroboam dubara ndị Izrel ime.
* 15:11 15:11 2Ih 14:2; 1Ez 9:4; 14:8