9
Onyenwe anyị emee ka Solomọn hụ ya anya
Mgbe Solomọn rụchara ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na ụlọeze, rụzukwaa ihe niile bụ nke o bu nʼobi ime, Onyenwe anyị mere ka ọ hụ ya anya nke ugboro abụọ dịka o mere ka ọ hụ ya anya na Gibiọn.* Onyenwe anyị sịrị ya,
“Anụla m ekpere gị, na arịrịọ gị, nke ị rịọrọ nʼihu m. Edoola m ụlọnsọ a nke i wuru nsọ, site nʼitinye Aha m nʼebe ahụ ruo mgbe ebighị ebi. Anya m na obi m abụọ ga-adịkwa nʼebe ahụ ụbọchị niile.
“Ma gị onwe gị, ọ bụrụ na ị jiri obi zuruoke na omume ziri ezi, bie ndụ nʼikwesị ntụkwasị obi nʼihu m dịka Devid nna gị mere, na-eme ihe niile m nyere nʼiwu, debe ụkpụrụ m na iwu m niile, mgbe ahụ, aga m eme ka ocheeze ọchịchị gị nʼIzrel guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi, dịka m kwere nna gị Devid nkwa, mgbe m sịrị, ‘Ị ghaghị inwe onye nnọchite anya nʼocheeze Izrel.’
“Ma ọ bụrụ na unu, maọbụ ụmụ ụmụ unu alaghachi azụ, site nʼebe m nọ, jụ idebe iwu na ụkpụrụ niile bụ nke m nyere unu, pụọ gbasoro chi ndị ọzọ ife ha ofufe na ịkpọ isiala nye ha, mgbe ahụ, aga m esite nʼala ahụ nke m nyere ha wezuga Izrel. Aga m ajụkwa ụlọnsọ a m doro nsọ nye Aha m. Izrel ga-aghọ ihe eji atụ ilu na ihe ịkpa ọchị nʼetiti ndị niile. Ọ bụ ezie na ụlọnsọ ukwu a kachasị elu ugbu a, ma ọnọdụ ya ga-eju ndị niile ga-esi nʼakụkụ ya gafee anya. Ha ga-emi ọnụ, sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị ji mee ala a na ụlọnsọ a, ihe dị otu a?’ Ndị mmadụ ga-aza, ‘Nʼihi na ha gbakụtara Onyenwe anyị Chineke ha azụ, onye kpọpụtara ha site nʼala Ijipt azụ, makụọ chi ndị ọzọ, na-akpọ isiala na-efekwa ha ofufe. Ọ bụ nʼihi nke a ka O ji mee ka ihe ọjọọ niile ndị a bịakwasị ha.’ ”
Ọrụ ndị ọzọ Solomọn rụrụ
10 Nʼọgwụgwụ iri afọ abụọ, mgbe Solomọn ji wuo ụlọ abụọ ndị a, ya bụ ụlọnsọ Onyenwe anyị na ụlọeze. 11 Eze Solomọn nyere Hiram, eze Taịa, iri obodo abụọ dị na Galili, nʼihi osisi sida, na osisi junipa, na ọlaedo niile Hiram butere ya dịka o si chọọ ya. 12 Ma mgbe Hiram si Taịa gaa ịhụ obodo ndị a nke Solomọn nyere ya, ha amasịghị obi ya. 13 Ya mere, ọ jụrụ sị, “Nwanne m nwoke, ụdị obodo dị aṅaa bụ ihe a i nyere m?” Nʼihi ya, ọ kpọrọ ha Kabul, aha ọ na-aza ruo taa. 14 Hiram zigaara eze ọlaedo dị puku kilogram anọ na iri asatọ.
15 Nke a bụ akụkọ banyere ndị ọrụ mmanye niile eze bụ Solomọn chịkọtara maka ịrụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na ụlọeze nke ya, na ebe e wusiri ike nke Milo, na mgbidi Jerusalem, Hazọ, Megido nakwa Gaza. 16 Fero eze Ijipt buru agha na mbụ merie Gaza, kpọọ ya ọkụ, gbukwaa ọtụtụ ndị Kenan bi nʼobodo ahụ, were ya nye nwa ya nwanyị, bụ nwunye Solomọn, ka ọ bụrụ ihe o ji duo ya ụlọ. 17 Solomọn wugharịrị obodo Gaza, wuokwa ndịda Bet-Horon, 18 Baalat na Tadmọ nke dị nʼọzara nʼime ala ya. 19 O wukwara ọtụtụ obodo ebe nchịkọba ihe, obodo ebe idebe ụgbọ agha na ịnyịnya ya niile. O wuru ihe ọbụla gụrụ obi ya agụụ iwu na Jerusalem, Lebanọn na nʼoke ala ahụ niile ọ na-achị.
20 Ndị niile fọdụrụ ndụ nʼetiti ndị Amọrait, ndị Het, ndị Periz, ndị Hiv na Jebus (ndị ahụ abụghị ndị Izrel), 21 ndị ụmụ ụmụ ha niile fọdụrụ nʼala ahụ, ndị ahụ ndị Izrel na-enweghị ike egbuchapụ, ndị a ka Solomọn mere ndị ọrụ mmanye na ndị ohu, nke a bụkwa ọnọdụ ha ruo taa. 22 Ma Solomọn emeghị ka onye Izrel ọbụla bụrụ ohu. Kama ha bụ ndị ikom agha, ndịisi ọrụ nʼọchịchị, ndịisi ndị ọchịagha, ndịisi ụgbọ agha na ndị na-agba ịnyịnya agha ya. 23 Ndị a bụkwa ndịisi na-ahụ ihe banyere ọrụ niile nke Solomọn ji nʼaka. Ndị Izrel dị narị ise na iri ise (550), ka e mere ndịisi na-elekọta ndị ọrụ Solomọn.
24 Emesịa, ada Fero sitere nʼobodo Devid pụta gbagoo nʼụlọeze nke Solomọn wuuru ya. Solomọn wukwara ebe mpụta nke ụlọ ahụ.
25 Ugboro atọ nʼafọ,§ ka Solomọn na-achụ aja nsure ọkụ, na aja udo nʼelu ebe ịchụ aja o wuru nye Onyenwe anyị, tinyere aja nsure ọkụ ihe na-esi isi ụtọ ọ na-achụ nʼihu Onyenwe anyị. O si otu a wuchaa ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
26 Eze Solomọn wukwara ọtụtụ ụgbọ mmiri nʼEziọn Geba,* bụ nke dị nʼakụkụ Elat, nʼọnụ mmiri Oke osimiri Uhie nʼala Edọm. 27 Hiram zigaara ndị ikom ya na-anya ụgbọ, ndị maara ihe banyere ime njem osimiri nke ọma, ka ha soro ndị ikom Solomọn jee ozi nʼime ụgbọ ndị a. 28 Ha nyaara ụgbọ gaa Ọfịa, site nʼebe ahụ bulatara eze Solomọn ọlaedo nke ịdị arọ ya ruru puku kilogram iri na anọ na narị abụọ na asatọ.
* 9:2 9:2 1Ez 3:5; 11:9; 2Ih 1:7 9:13 9:13 Ala na-adịghị ihe ọ dị mma iji ya mee. 9:18 9:18 Maọbụ, Tama nʼasụsụ ndị Hibru § 9:25 9:25 Ọ bụ nʼusoro ụzọ mmemme atọ dị mkpa nke ndị Izrel na-eme kwa afọ. Ndị a bụ mmemme achịcha ekoghị eko, mmemme owuwe ihe ubi, na mmemme ibi ụlọ ikwu. Ọpụ 23:14-17; Dit 16:16; 2Ih 8:13 * 9:26 9:26 Obodo Eziọn Geba dị nʼakụkụ Elat nʼala Edọm, baara Solomọn uru nʼebe ọ dị ukwu nʼihi osimiri Uhie na oke osimiri India dị ya nso. Ọnụ 33:35; Dit 2:8; 1Ez 22:48 9:28 9:28 Ọtụtụ mmadụ na-ama atụ ebe a ga-enwe ike chọta obodo Ọfịa taa. Ụfọdụ na-asị, na ọ bụ nʼọnụ mmiri Arebịa ka ọ dị, ndị ọzọ na-asị, ọ bụ na mpaghara akụkụ ọnụ mmiri Sọmalia. Ebe ndị ọzọ na-asị, na ọ dị nʼala India maọbụ nʼala Zimbabwe.