3
Abụ m onye hụrụla ahụhụ site
na mkpara igwe nke nrubiga oke nke iwe Onyenwe anyị.
O sitela nʼihu ya chụpụ m, mee ka m jegharịa
nʼọchịchịrị kama nʼìhè.
Nʼezie, ọ tụgharịala aka ya megide m,
mgbe mgbe, ogologo ụbọchị niile.
 
O meela ka akpụkpọ ahụ na anụ ahụ m fịkpọọ,
ọ nyajisiela ọkpụkpụ di m nʼahụ.
O busola m agha,
jiri ihe ilu na oke mkpagbu gbaa m gburugburu.
O meela ka m biri nʼọchịchịrị
dịka ndị nwụrụ anwụ kemgbe oge gara aga.
 
Ọ gbachibidola m ogige, ime ka m ghara ịgbapụ;
o jirila ụdọ igwe dị arọ mee ka m ghara ijegharị.
Ọ na-eme ka ekpere m hapụ irute ya,
ọ bụladị mgbe m kpọkuru ya ka o nyere m aka.
O jirila nkume a wara awa gbachie ụzọ m niile,
o meela ka okporoụzọ m gbagọọ agbagọ.
 
10 Dịka anụ ọhịa bịa nke makpu na-eche nche,
na dịka ọdụm nke na-ezo onwe ya,
11 o sitela nʼokporoụzọ dọkpụrụ m dọbisie m ahụ,
hapụ m na-enweghị onye inyeaka.
12 Ọ dọọla ụta ya
mee m ka m bụrụ onye àkụ ya ga-agbata.
 
13 O ji àkụ nke si nʼakpa àkụ ya
gbapuo m obi.
14 Aghọrọ m ihe ọchị nye ndị m niile;
ha ji abụ na-akwa m emo ogologo ụbọchị niile.
15 O meela ka ihe niile na-elu ilu ju m afọ,
meekwa ka m ṅụjuo oluilu afọ.
 
16 O meela ka m jiri okwute tajisie eze m,
o kponyekwala m ntụ nʼọnụ m.
17 Enweghị m udo,
echezọkwaala m ihe ọganihu bụ.
18 Nʼihi ya, ana m ekwu, “Ịma mma m ọbụla adịghịkwa.
Agaghị m enwetakwa ihe ndị ahụ m lere anya na m ga-esi nʼaka Onyenwe anyị nweta.”
 
19 Ana m echeta ahụhụ m, na mwagharị m,
ya na ihe ilu na oluilu.
20 Mgbe m na-echeta ya,
obi m na-ada mba nʼime m.
21 Ma ọ dị ihe m na-echeta nʼobi m
nke na-eme ka m nwee olileanya.
 
22 Ọ bụ nʼihi ịhụnanya dị ukwuu nke Onyenwe anyị na-emeghị ka anyị gwụsịa,
nʼihi na obi ebere ya adịghị agwụ agwụ.
23 Ha na-adị ọhụrụ ụtụtụ niile;
ikwesi ntụkwasị obi gị bụ ihe kwudosiri ike.
24 Mkpụrụobi m na-ekwu, “Onyenwe anyị bụ oke m,
nʼihi ya, aga m enwe nchekwube na ya.”
 
25  Onyenwe anyị dị mma nʼebe ndị olileanya ha dị nʼime ya,
e, nʼebe obi ahụ dị, nke na-achọsi ya ike.
26 Ọ bụ ihe dị mma iji nwayọọ
chere nzọpụta nke Onyenwe anyị.
27 Ọ bụ ihe dị mma ka mmadụ buru ibu arọ dịrị ya
mgbe ọ bụ okorobịa.
 
28 Ya nọrọkwa duu naanị ya,
nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị bokwasịrị ya ibu ahụ.
29 Ya tinye ihu ya nʼaja,
nʼihi na olileanya nwere ike dịrị.
30 Ya cheziere onye ahụ chọrọ iti ya ihe ntị ya,
ya kwerekwa ka ihe ihere ju ya afọ.
 
31 Nʼihi na Onyenwe anyị adịghị ajụ onye ọbụla ruo
mgbe ebighị ebi.
32 Ọ bụ ezie na ọ na-eme ka mmekpa ahụ bịa, ma ọ na-emesịakwa gosi obi ebere ya,
nʼihi na ịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ, dị ukwuu.
33 Nʼihi na ọ naghị elezi anya eweta ahụhụ,
maọbụ mee ka ụmụ mmadụ nọọ na mmekpa ahụ.
 
34 Iji ụkwụ zọgbuo
ndị mkpọrọ nọ nʼala ahụ
35 ime ka ihe ruru mmadụ hapụ iru ya aka
nʼihu Onye kachasị ihe niile elu,
36 ime ka ikpe ziri ezi ghara irute mmadụ.
Ọ bụ na Onyenwe anyị agaghị ahụ ihe ndị a?
 
37 Onye pụrụ ikwu okwu mekwa ka ọ dị ire
ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị enyeghị iwu ka ọ dị otu ahụ?
38 Ọ bụghị site nʼọnụ Onye kachasị ihe niile elu
ka ihe ọma na ihe ọjọọ si abịa?
39 Gịnị mere mmadụ dị ndụ ga-eji tamuo ntamu
mgbe ọ na-ahụ ahụhụ nʼihi mmehie ya?
 
40 Ka anyị nyochaanụ ụzọ anyị nwapụta ya.
Ka anyị lọghachikwutenụ Onyenwe anyị.
41 Ka anyị welie aka anyị abụọ na obi anyị elu nye
Chineke nọ nʼeluigwe, sị:
42 “Anyị emehiela, nupu isi,
ma ị gbagharabeghị.
 
43 “I jirila iwe kpuchie onwe gị, si otu a chụọ anyị ọsọ.
I gbuola anyị, jụ imere anyị ebere.
44 I jiri igwe ojii kpuchie onwe gị
ka ekpere anyị ghara irute gị.
45 I meela ka anyị ghọọ unyi na ihe a zachapụrụ azachapụ
nʼetiti mba niile.
 
46 “Ndị iro anyị niile asaghepụla ọnụ ha
megide anyị.
47 Anyị ahụọla ahụhụ site nʼoke ihe egwu na ihe ndaba dị iche iche,
na mbibi na ịla nʼiyi.”
48 Anya mmiri nke dịka iyi na-asọ asọ si nʼanya m na-asọpụta
nʼihi ndị m a lara nʼiyi.
 
49 Anya mmiri si m nʼanya ga-anọgide na-asọpụta
na-akwụsịghị akwụsị,
50 tutu ruo mgbe Onyenwe anyị ga-esite nʼeluigwe
ledata anya ma hụ.
51 Ihe anya m na-ahụ na-ewetara mkpụrụobi m ihe mgbu,
nʼihi ọnọdụ nke ndị inyom niile nọ nʼime obodo m.
 
52 Ndị ahụ mere onwe ha ndị iro m, ndị m na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla,
na-achụ m ọsọ dịka m bụ nnụnụ.
53 Ha gbalịrị ime ka m nwụọ nʼime olulu
site nʼịtụ m nkume.
54 Mmiri kpuchiri m isi,
echere m na-efuola m.
 
55 Esitere m na nsọtụ olulu ahụ kpọkuo aha gị,
gị Onyenwe anyị.
56 Ị nụrụ arịrịọ m rịọrọ gị, “Biko, emechila ntị gị.
Nụrụ arịrịọ inyeaka nke m na-arịọ gị.”
57 Ị bịara nso mgbe m kpọkuru gị.
Ị sịrị, “Atụla egwu.”
 
58 Gị onwe gị, Onyenwe anyị, kpechitere ọnụ m,
gị gbapụtara ndụ m.
59  Onyenwe anyị, ị hụla ihe ọjọọ ha mere m.
Kpechitere m ọnụ m.
60 Ị hụla ịbọ ọbọ ha niile
na nzube niile ha na-ezube megide m.
 
61  Onyenwe anyị, ị nụla nkọcha niile ha na-akọcha m
na nzube niile ha na-ezube megide m.
62 Ị na-anụ izu na ntamu nke ndị iro m
megide m ogologo ụbọchị niile.
63 Lee ha! Ha na-akọcha m mgbe ha guzoro ọtọ, na-akọcha m mgbe ha nọdụrụ ala.
Ha ji abụ na-akọcha m.
 
64  Onyenwe anyị, biko, kwụghachi ha ihe ruuru ha,
nʼihi ihe niile aka ha rụpụtara.
65 Jiri ihe mkpudo kpuchie obi ha.
Meekwa ka ịbụ ọnụ gị dịkwasị ha.
66 Site nʼiwe gị chụọ ha ọsọ. Laakwa ha nʼiyi nʼiwe gị,
ka ha ghara ịdịkwa nʼokpuru eluigwe nke Onyenwe anyị ọzọ.