3
Ịba mba nye ndịisi na ndị amụma
Mgbe ahụ ekwuru m sị,
“Geenụ ntị unu ndịisi ụlọ Jekọb,
na unu ndị na-achị ezinaụlọ Izrel.
Ọ bụ na unu ekwesighị ịmata ikpe ziri ezi
unu bụ ndị kpọrọ ezi ihe asị ma na-ahụ ajọ ọrụ nʼanya.
Unu na-agba ndị m akpụkpọ na ndụ
na-agbapụkwa anụ ahụ kpuchiri ọkpụkpụ ha.
Unu na-erida anụ ahụ ndị nke m,
na-agba ha akpụkpọ,
na-etijisi ọkpụkpụ ha,
na-egburi anụ ahụ ha,
dịka anụ a na-esinye nʼite.”
 
Mgbe ahụ ha ga-akpọku Onyenwe anyị,
ma ọ gaghị aza ha!
Mgbe oge ahụ bịaruru, ọ ga-ezo ihu ha site nʼebe ha nọ
nʼihi ihe ọjọọ nke ha mere.
Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru:
“Banyere ndị amụma
bụ ndị na-eduhie ndị m,
mgbe ha nwere ihe ha ga-eri,
ha na-ekwusa ‘Udo’
ma ọ bụrụ na mmadụ enyeghị ha nri,
ha na-ebili buo agha* megide onye dị otu a.
Ya mere nʼabalị ga-abịakwasị ha, napụ ha ike ịhụ ọhụ;
ọchịchịrị ga-ekpuchi ha, ka ha ghara ịjụta ase ọbụla.
Anwụ ga-ada nʼebe ndị amụma ahụ nọ,
ụbọchị ga-agbakwa ọchịchịrị nye ha.
Ndị ọhụ ụzọ ka ihere ga-eme,
ndị na-ajụ ase ka a ga-emebọ.
Ha ga-ekpuchi ihu ha,
nʼihi na ọsịsa ọbụla agaghị esite nʼebe Chineke nọ bịara ha.”
Ma mụ onwe m, ejupụtara m nʼike,
ejupụtara m na Mmụọ nke Onyenwe anyị,
jupụtakwa na mmụọ nke ikpe ziri ezi,
na nke ịdị ike ikwupụta nye Jekọb njehie ya,
na nye Izrel mmehie ya.
 
Geenụ ntị unu ndị na-achị ezinaụlọ Jekọb,
na unu ndịisi ezinaụlọ Izrel.
Ndị kpọrọ ikpe ziri ezi asị,
ma na-ewere ihe niile na-ezighị ezi nʼọnọdụ ihe ziri ezi.
10 Ndị ji ọbara wuo Zayọn,
werekwa ajọ omume wuo Jerusalem.
11 Ndịisi ya na-ekpe ikpe nʼihi ngarị,
ndị nchụaja ya na-akụzi ihe nʼihi ụgwọ,
ebe ndị amụma ya na-ajụta ase nʼihi ego.
Ma ha dabere na Onyenwe anyị na-asị,
Onyenwe anyị ọ nọnyeereghị anyị?
O nweghị ihe ọjọọ ga-abịakwasị anyị.”
12 Ọ bụ nʼihi gị
ka a ga-akọgharị Zayọn dịka ala ubi,
Jerusalem ga-aghọ ebe e kpokọtara nkume na ngwongwo ụlọ dakpọrọ adakpọ,
ugwu nke ụlọnsọ ukwu ahụ ga-aghọ ebe dị elu nke oke ọhịa tochiri.
* 3:5 3:5 Nʼakwụkwọ ụfọdụ ha na-ede agha nsọ