14
Otite mmanụ Jisọs na Betani
Abalị abụọ tupu e mee Mmemme Ngabiga* na mmemme achịcha na-ekoghị eko, ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu nọkwa na-achọ ụzọ aghụghọ ha ga-esi jide Jisọs gbuo ya. Ma ha kwuru sị, “Ọ gaghị abụ nʼoge mmemme a, ka ọgbaaghara ghara ịdị.”
Ka ọ nọdụrụ nʼoche nri na Betani nʼụlọ Saimọn onye ekpenta, otu nwanyị bu karama alabasta mmanụ otite dị oke ọnụahịa, nke e jiri ezigbo naad mee, batara. Ọ kụwara karama ahụ, wụsa ya mmanụ otite ahụ nʼisi.
Ụfọdụ ndị nọ nʼebe ahụ were iwe nke ukwuu. Ha sịrịtara onwe ha, “Gịnị mere e jiri laa mmanụ otite nke a nʼiyi otu a? A gaara ere mmanụ otite a ihe karịrị narị denarị atọ, were ego e retara ya nye ndị ogbenye.” Ha baara ya mba nʼolu ike.
Ma Jisọs sịrị, “Hapụnụ ya aka. Gịnị mere unu ji esogbu ya? Ọ bụ ezi ọrụ ka ọ rụrụ nʼebe m nọ. Unu na ndị ogbenye na-anọ oge niile, unu nwekwara ohere inyere ha aka mgbe ọbụla unu chọrọ. Ma mụ na unu agaghị anọ tee anya. O mere ihe o nwere ike, ọ na-ete m mmanụ otite a ugbu a iji kwado ahụ m maka olili a ga-eli ya. Nʼezie, ana m agwa unu, nʼebe ọbụla a ga-ekwusa oziọma a nʼụwa niile, ọrụ a ọ rụrụ ka a ga-akọkwa akụkọ ya, iji cheta ihe ọma a o mere.”
10 Mgbe ahụ Judas Iskarịọt, otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ jekwuuru ndịisi nchụaja ịgba izu otu ọ ga-esi rara ya nye ha nʼaka. 11 Mgbe ha nụrụ nke a, ha ṅụrịrị ọṅụ kwee ya nkwa inye ya ego. Site nʼụbọchị ahụ, o bidoro ịchọgharị ụzọ ọ ga-esi rara ya nye ha.
Oriri Mmemme Ngabiga
12 Nʼụbọchị mbụ nke Mmemme achịcha na-ekoghị eko, mgbe ha na-achụ aja atụrụ ngabiga, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị ya, “Ebee ka ị chọrọ ka anyị gaa kwadoro gị ihe, maka oriri ngabiga?”
13 O zipụrụ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya, sị ha, “Gaanụ nʼime obodo, otu nwoke bu ite mmiri ga-ezute unu. Soronụ ya. 14  Ebe ọbụla ọ banyere, sịnụ onyenwe ụlọ ahụ, Onye ozizi sịrị, Olee ụlọ ọbịa a kwadoro m, ebe mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-anọ rie oriri ngabiga? 15  Ọ ga-egosi unu otu ọnụụlọ buru ibu nʼelu ụlọ ahụ, ebe e dozichara ihe niile. Kwadoonụ ihe anyị nʼebe ahụ.”
16 Ndị na-eso ụzọ ya pụrụ baa nʼime obodo, ha hụrụ ihe niile dị ka ọ gwara ha. Ma kwadokwa nri ngabiga ahụ.
17 Mgbe o ruru uhuruchi, ya na ndị ozi ya iri na abụọ ahụ so bịa. 18 Mgbe ha nọ na-eri nri, Jisọs gwara ha sị, “Nʼezie agwa m unu, otu onye nʼime unu ga-arara m nye. E, otu onye so m ugbu a na-eri nri!”
19 Ha bidoro inwe obi mwute, na-asị ya nʼotu nʼotu, “Ọ bụ m? Ọ bụ m?”
20 Ọ sịrị ha, “Ọ bụ otu onye nʼime mmadụ iri na abụọ a. Onye mụ na ya na-amanyekọta aka nʼime otu efere. 21  Nwa nke Mmadụ ga-ala dị ka e dere banyere ya. Ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ onye a ga-esite nʼaka ya rara Nwa nke Mmadụ nye. Ọ gaara akara onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya amụ.”
Mmalite nke oriri nsọ
22 Dị ka ha na-eri nri, o weere achịcha, nye ekele, nyawa ya, nye ha sị, “Rienụ ya, nke a bụ ahụ m.”
23 Mgbe ahụ, o buuru iko, nye ekele bunyekwa ha. Ha niile ṅụrụ site nʼotu iko ahụ.
24 Ọ sịrị ha, “Nke a bụ ọbara m nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, nke a na-awụfu nʼihi ọtụtụ mmadụ. 25  Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, agaghị m aṅụ mmanya vaịnị ọzọ tutu ruo ụbọchị ahụ, mgbe m ga-aṅụ ya ọhụrụ nʼalaeze Chineke.”
26 Mgbe ha bụsịrị abụ, ha pụrụ gaa nʼUgwu Oliv.
Jisọs ekwuo maka ngọnarị Pita
27 Jisọs sịrị ha, “Unu niile ga-agbahapụ m, nʼihi na e dere ya otu a sị,
“ ‘Aga m etigbu onye ọzụzụ atụrụ,
igwe atụrụ ga-agbasasịkwa.’
28  Ma mgbe e mesịrị ka m si nʼọnwụ bilie, aga m ebu unu ụzọ gaa Galili.”
29 Pita kwuru, “Ọ bụrụ na mmadụ niile agbahapụ gị, agaghị m eme otu a.”
30 Jisọs sịrị ya, “Ịgwa gị eziokwu, nʼụbọchị taa, nʼabalị taa, tupu oke ọkụkụ akwaa akwa ugboro abụọ, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.”
31 O kwusịrị ike sị, “Ọ bụrụkwa na ihe ọnwụ adapụta, aga m eso gị nwụọ. Agaghị m agọnarị gị!” Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka ha niile kwuru.
Ekpere Jisọs nʼogige Getsameni
32 Ha pụrụ garuo ebe a na-akpọ Getsameni. Nʼebe ahụ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Nọdụnụ nʼebe a ka m gaa kpee ekpere.” 33 Ọ kpọọrọ Pita, na Jemis na Jọn tinyere onwe ya. Ọ malitere inwe ihe mwute dị ukwuu nakwa obi ịlọ mmiri. 34 Ọ sịrị ha, “Ọ na-ewute mkpụrụobi m nke ukwuu ruo nʼọnụ ọnwụ. Nọdụnụ nʼebe a na-eche nche.”
35 Ọ gatụrụ nʼihu daa nʼala kpee ekpere, sị, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee ka oge awa ahụ gabiga ya. 36 O kwuru sị, “Abba,Nna, ị pụrụ ime ihe niile. Napụ m iko a, ma otu ọ dị, ọ bụghị ka e mee uche m, kama ka e mee uche gị.”
37 Ọ bịara hụ ha ka ha na-arahụ ụra. Ọ sịrị Pita, “Saimọn, ị na-arahụ ụra? Ọ bụ na ị nweghị ike iche nche otu awa? 38  Nọrọnụ na nche, na-ekpekwanụ ekpere ka unu ghara ịdaba nʼọnwụnwa. Mmụọ dị ike ma anụ ahụ adịghị ike.”
39 Ọ pụkwara ọzọ, gaa kpee ekpere, na-ekwukwa otu okwu ahụ. 40 Mgbe ọ lọghachiri azụ ọ hụrụ na ha na-arahụ ụra, nʼihi na anya ha dị arọ nke ukwuu. Ha amakwaghị ihe ha ga-agwa ya.
41 Mgbe ọ lọghachiri nke ugboro atọ, ọ sịrị ha, “Unu ka nọ na-arahụ ụra na-ezukwa ike? O zuola! Oge awa ahụ abịala. Lee, a rarala Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ndị mmehie. 42  Bilienụ! Ka anyị gawa! Lee, onye na-arara m nye nọ nso.”
Njide e jidere Jisọs
43 Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, Judas, otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ batara, ya na igwe mmadụ, ndị ji mma agha na mkpọ. Ọ bụ ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu, na ndị ode akwụkwọ, na ndị okenye ndị Juu zitere ha.
44 Ma onye na-arara ya nye, nyere ha rịị ihe ịrịbama sị, “Onye ahụ nke m ga-esutu ọnụ bụ ya; jidenụ ya, kpụrụnụ ya gawa, ma jidesiekwanụ ya ike.” 45 Ngwangwa o jekwuuru Jisọs, sị ya, “Onye ozizi!” ma sutukwa ya ọnụ. 46 Ndị ikom ahụ jidere Jisọs ma sekpụrụ ya nʼike. 47 Ma otu onye nʼime ndị guzo nʼebe ahụ, mịpụtara mma agha ya, gbuo ohu onyeisi nchụaja, gbupụ ntị ya.
48 Jisọs sịrị ha, “Abụ m onyendu nke ndị na-enupu isi nke mere unu ji were mma agha na mkpọ bịa ijide m? 49  Ụbọchị niile ka mụ na unu nọ mgbe m na-ezi ihe nʼụlọnsọ ukwu, ma unu ejideghị m. Ma ihe akwụkwọ nsọ kwuru aghaghị imezu.” 50 Mgbe ahụ, ha niile hapụrụ ya gbalaga.
51 Ọ dị otu nwokorobịa na-eso ya, ọ ji naanị akwa ọcha linin kpuchie onwe ya. Mgbe ha jidere ya, 52 ọ hapụụrụ ha akwa ọcha linin ya, gbara ọtọ gbalaga.
Jisọs nʼihu ndị ikpe ndị Juu
53 Ha duuru Jisọs gakwuru onyeisi nchụaja, ha niile bụ ndịisi nchụaja, na ndị okenye na ndị ozizi iwu zukọrọ nʼebe ahụ. 54 Pita sooro ha, ma ọ nọ nʼebe dị anya. O sooro ha bata nʼobi onyeisi nchụaja. Nʼebe ahụ, o sooro ndị nche nọdụ ọdụ na-anya ọkụ.
55 Ndịisi nchụaja na ndịisi ikpe nʼụlọikpe ukwu§ nọ na-achọ ama megide Jisọs, ka ha nwee ike gbuo ya. Ma ọ dịghị nke ha chọtara. 56 Ọtụtụ bịara gbaa ama ụgha megide ya, ma ama ha abụghị otu.
57 Mgbe ahụ ụfọdụ biliri gbaa ama ụgha megide ya, sị, 58 “Anyị nụrụ mgbe o kwuru sị, ‘Aga m akwatu ụlọnsọ ukwu a nke e ji aka wuo, nʼụbọchị atọ aga m ewukwa ụlọ ọzọ, nke a na-ejighị aka wuo.’ ” 59 Ọ bụladị na nke a, ama ha niile adakọtakwaghị nʼotu.
60 Mgbe ahụ, onyeisi nchụaja biliri ọtọ nʼihu ha, jụọ Jisọs ajụjụ sị, “Ọ bụ na ị nweghị ihe ọbụla ị ga-aza? Gịnị ka i nwere ikwu banyere ama ndị a a na-agba megide gị?” 61 Ma ọ gbakwara nkịtị, ọ zaghị ihe ọbụla.
Ọzọkwa, onyeisi nchụaja jụrụ ya sị, “Ị bụ Kraịst, Ọkpara Onye a gọziri agọzi?”
62 Jisọs sịrị, “Abụ m ya, unu ga-ahụkwa Nwa nke Mmadụ ka ọ na-anọdụ ala nʼaka nri nke Onye ji ike niile, na-abịakwa nʼigwe ojii nke eluigwe.”
63 Onyeisi nchụaja dọwara uwe ya kwuo sị, “Gịnị mere anyị ji achọ ndị akaebe ọzọ? 64 Unu anụla okwu nkwulu si ya nʼọnụ pụta! Gịnị bụ mkpebi unu?”
Ha niile mara ya ikpe sị, “O kwesiri ka ọ nwụọ!” 65 Mgbe ahụ ụfọdụ bidoro ịgbụ ya ọnụ mmiri asọ, jiri akwa kechie ya anya, tiekwa ya aka na-asị, “Buo amụma!” Ndị nche kpụpụtara ya tiekwa ya ihe.
Pita agọnarị Jisọs
66 Dịka Pita nọ nʼobi ahụ, otu nʼime ụmụ agbọghọ na-ejere onyeisi nchụaja ozi bịara nso ebe ọ nọ. 67 Mgbe ọ hụrụ Pita ka ọ na-anya ọkụ, o leziri ya anya nke ọma, sị, “Ị bụ otu nʼime ndị na-eso Jisọs onye Nazaret ahụ.”
68 Ma ọ gọrọ agọ sị, “Amaghị m, maọbụ ghọtakwa ihe ị na-ekwu.” Ma ọ pụrụ gaa nʼụzọ e si abata. Mgbe ahụ oke ọkụkụ kwara akwa.
69 Mgbe nwaagbọghọ ahụ hụrụ Pita ọzọ, o gosiri ya ndị ọzọ nọ nʼebe ahụ sị ha, “Nwoke a bụkwanụ otu nʼime ha.” 70 Ma ọ gọkwara agọ ọzọ.
Mgbe oge nta gasịrị, ndị guzo Pita nso sịrị ya, “Nʼezie, ị bụ otu nʼime ha, nʼihi na ị bụ onye Galili.”
71 Mgbe ahụ o bidoro ịbụ onwe ya ọnụ, na ịṅụ iyi na-asị, “Amaghị m onye nwoke a unu na-ekwu okwu ya bụ.”
72 Nʼotu oge ahụ, oke ọkụkụ kwara akwa nke ugboro abụọ. Mgbe ahụ Pita chetara okwu Jisọs gwara ya sị, “Tupu oke ọkụkụ akwaa akwa ugboro abụọ, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.” Obi tiwara ya mee ka ọ kwaa akwa.
* 14:1 14:1 Mmemme ndị Izrel ji echeta ọpụpụ ha site nʼala Ijipt. 14:27 14:27 Zek 13:7 14:36 14:36 Nke a pụtara nna nʼasụsụ Aramaik. § 14:55 14:55 Ha dị iri asaa nʼotu nʼọnụọgụgụ ma bụrụkwa ndị gbara site nʼafọ atọ nʼotu gaa nʼihu.