23
Amụma Belam nke mbụ
Belam sịrị, “Wuoro m ebe ịchụ aja asaa nʼebe a. Kwadokwaara m oke ehi asaa na ebule asaa.” Balak mezuru dịka Belam gwara ya. Ha abụọ gburu otu oke ehi na otu nwa ebule nʼebe ịchụ aja asaa ahụ nʼotu na otu.
Mgbe ahụ, Belam gwara Balak sị, “Guzoro nʼebe a nʼakụkụ aja gị ka m gaa nʼihu chọpụta ma eleghị anya Onyenwe anyị ga-ezute m. Aga m agwa gị ihe ọbụla o kpughere m.” Ya mere, Belam rigooro nʼebe ọhịa na-adịghị.
Chineke zutere ya nʼebe ahụ. Belam gwara ya sị, “Edoziela m ebe ịchụ aja asaa, gbukwaa otu oke ehi na otu ebule nʼelu ha niile nʼotu na otu.”
Nʼoge a, Onyenwe anyị tinyere Belam ozi nʼọnụ sị ya, “Laghachi gaa zie Balak ozi a.”
Mgbe Belam lọghachiri ọ hụrụ ya ka o guzoro nʼakụkụ ihe aja ya ndị ahụ, ya na ndịisi Moab niile. Nke a bụ ozi Belam ziri:
“Balak esitela nʼobodo Aram kpọta m.
Eze Moab esitela nʼọwụwa anyanwụ nke ugwu ahụ kpọta m.
Ọ sịrị m, bịa bụọrọ m Jekọb ọnụ
bịa kwutọọ Izrel.
M ga-esi aṅaa bụọ
onye Chineke na-abụghị ọnụ ọnụ?
M ga-esi aṅaa
kọchaa onye Onyenwe anyị na-akọchaghị?
Esitela m nʼelu nkume ndị a hụ ha.
Elegidere m ha anya site nʼugwu ahụ,
hụ na ha bụ ndị biri onwe ha,
ndị dị iche site nʼetiti mba niile ọzọ.
10 Onye pụrụ ịgụta ole uzuzu Jekọb dị?
Maọbụ gụta ole otu ụzọ nʼime nkewa anọ nke Izrel dị.
Ọ ga-atọ m ụtọ ịnwụ ụdị ọnwụ ndị na-eme ezi omume.
Ka ọgwụgwụ ndụ m bụrụ ihe nwere ike iyi nke ha!”
11 Balak sịrị Belam, “Gịnị bụ ihe a i mere m? Akpọtara m gị ka ị bụọrọ m ndị iro m ọnụ, ma ugbu a, ọ dịghị ihe ọzọ i mere karịa naanị ịgọzi ha!”
12 Ma Belam zaghachiri sị ya, “Ọ bụghị ihe Onyenwe anyị tinyere m nʼọnụ ka m ga-ekwu?”
Amụma Belam nke abụọ
13 Mgbe ahụ, Balak sịrị ya, “Soro m bịa nʼebe ọzọ ebe ị ga-ahụ ha; ọ bụ naanị nsọtụ ọmụma ụlọ ikwu ha ka ị ga-ahụ, ị gaghị ahụ ha niile. Site nʼebe ahụ bụọrọ m ha ọnụ.” 14 Ya mere, eze Balak duuru Belam gaa nʼọhịa Zofim, nʼelu ugwu Pisga, wuo ebe ịchụ aja asaa nʼebe ahụ. O jikwa otu oke ehi, otu oke ehi, na otu ebule, otu ebule, chụọ aja nʼebe ịchụ aja ndị ahụ.
15 Belam sịrị Balak, “Guzoro nʼebe a nʼakụkụ ihe aja gị, ebe mụ onwe m ga-ezute ya nʼofe nke ọzọ.”
16 Ma Onyenwe anyị zutere Belam gwa ya ihe ọ ga-ekwu sị ya, “Laghachikwuru Balak zie ya ozi a.”
17 Ya mere, ọ lọghachiri azụ nʼebe ahụ Balak na ụmụ eze Moab guzoro nʼakụkụ ihe aja ha. Balak jụrụ ya sị, “Gịnị ka Onyenwe anyị sịrị?”
18 Ma Belam zaghachiri sị ya:
“Bilie ọtọ Balak, nụrụ ozi.
Ṅaa ntị nʼokwu m, gị nwa Zipoa.
19 Chineke agaghị agha ụgha, nʼihi na ọ bụghị mmadụ.
Ọ gaghị agbanwe obi ya, nʼihi na ọ bụghị nwa mmadụ.
O kwuola okwu, ma ghara ime ihe o kwuru?
O kwela nkwa ma ghara imezu nkwa o kwere?
20 Chineke enyela m iwu sị m gọzie ha.
Ọ gọziela ha, a pụghịkwa ịgbanwe ya!
 
21 “O nweghị ajọ ihe nke ahụrụ nʼime Jekọb,
ahụghịkwa mwute ọbụla nʼIzrel.
Onyenwe anyị Chineke ha nọnyeere ha.
Iti mkpu nke Eze dịkwa nʼetiti ha.*
22 Chineke kpọpụtara ha site nʼIjipt.
Ha dị ike dịka ehi ọhịa.
23 Ọ dịghị mgbaasị ga-emegide ha.
Ọ dịkwaghị ịgba afa a pụrụ iji megide Izrel.
Nʼihi na ugbu a, ihe dị otu a ka a ga-ekwu banyere Jekọb
na Izrel. ‘Lee, ihe Chineke mere ha.’
24 Ha na-ebili ọtọ dịka nne ọdụm,
ha na-enugharị onwe ha dịka ọdụm,
nke na-adịghị edina ala tutu o richaa ihe o gburu,
ma ṅụọkwa ọbara ihe ahụ o tigburu!”
25 Mgbe ahụ, Balak sịrị Belam, “Abụla ha ọnụ ma ọlị, ma ọ bụkwanụ gọzie ha ma ọlị.”
26 Ma Belam zaghachiri, “Ọ bụ na m agwaghị gị, ihe ọbụla nke Onyenwe anyị ga-ekwu ka m ga-eme?”
Amụma Belam nke atọ
27 Mgbe ahụ, Balak sịrị Belam, “Bịa, aga m akpọrọ gị gaa nʼebe ọzọ. Eleghị anya ọ ga-amasị Chineke ka i si nʼebe ahụ bụọrọ m ha ọnụ.” 28 Ya mere, Balak duuru Belam gaa nʼelu ugwu Peoa nke na-elegide ọzara ahụ anya.
29 Belam gwara Balak okwu sị ya, “Wuoro m ebe ịchụ aja asaa ọzọ. Doziekwa ụmụ oke ehi asaa na ebule asaa e ji achụ aja.” 30 Balak mere dịka Belam gwara ya. O ji otu oke ehi na otu ebule chụọ aja nʼebe ịchụ aja ahụ nʼotu na otu.
* 23:21 23:21 Maọbụ, Ọ bụ eze ha!