Ndị a bụ ilu Solomọn
10
Ilu dị iche iche nke Solomọn:
Nwata maara ihe na-eme ka nna ya ṅụrịa ọṅụ;
ma nwantakịrị dị nzuzu na-ewetara nne ya nʼiru ụjụ.
 
Akụ a kpatara nʼụzọ na-ezighị ezi adịghị aba uru,
ma ezi omume na-azọpụta mmadụ site nʼọnwụ.
 
Onyenwe anyị agaghị ekwe ka onye ezi omume nwụọ nʼagụụ,
ọ gakwaghị ekwe ka ihe nọgide na-agara onye ajọ omume nke ọma.
 
Aka ndị umengwụ na-eweta ogbenye,
ma aka na-arụsị ọrụ ike na-eweta ụba.
 
Onye na-ekpokọta nʼoge ọkọchị bụ nwa maara ihe,
ma nwa ahụ nke na-arahụ ụra nʼoge ọrụ bụ nwa na-eweta ihere.
 
Onye ezi omume na-anata ngọzị,
ma naanị nkọcha jupụtara nʼọnụ onye ajọ omume.
 
Aha onye ezi omume ka eji enye ngọzị,
ma aha onye ajọ omume ga-ere ure.
 
Onye obi ya maara ihe na-anabata ihe e nyere nʼiwu,
ma onye nzuzu ekwurekwu ga-ala nʼiyi.
 
Onye ụzọ ya ziri ezi na-aga ije nʼatụghị egwu,
ma onye ụzọ ya ezighị ezi ka a ga-achọpụta.
 
10 Onye ọbụla na-egbu ikuanya na-ebute ihe mwute,
onye nzuzu ekwurekwu ga-abịa nʼịla nʼiyi.
 
11 Ọnụ onye ezi omume bụ isi iyi nke ndụ,
ma naanị nkọcha jupụtara nʼọnụ onye ajọ omume.
 
12 Ịkpọ asị na-akpali esemokwu,
ma ịhụnanya na-ekpuchi mmehie niile.
 
13 Ndị nwere nghọta na-ekwu okwu nwere isi,
ma ndị na-enweghị uche ka a na-eti ihe dịka ohu.
 
14 Onye amamihe na-akpakọba ihe ọmụma,
ma onye nzuzu na-eji ọnụ ya akpọ ịla nʼiyi oku.
 
15 Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike,
ma ụbịam bụ ịla nʼiyi nke ndị ogbenye.
 
16 Ụgwọ ọrụ onye ezi omume bụ ndụ,
ma ihe nweta nke onye ajọ omume bụ mmehie na ọnwụ.
 
17 Onye na-ege ntị na ndụmọdụ na-egosi ụzọ nke ndụ,
ma onye na-adịghị anabata ndụmọdụ na-eme ka ndị ọzọ kpafuo.
 
18 Onye ji egbugbere ọnụ ụgha ekpuchi ịkpọ asị
na onye na-agbasa okwu nkwutọ bụ onye nzuzu.
 
19 Nʼọtụtụ okwu mmehie adịghị akwụsị
ma ndị nwere uche na-ejide ire ha.
 
20 Ire nke onye ezi omume bụ ọlaọcha kachasị mma,
ma obi onye ajọ omume bụ ihe ọnụahịa nta.
 
21 Egbugbere ọnụ onye ezi omume na-azụju ọtụtụ mmadụ afọ,
ma ndị nzuzu na-anwụ nʼihi amamihe nke kọrọ ha.
 
22 Ngọzị Onyenwe anyị na-eme mmadụ ọgaranya,
ọ naghị atụkwasị ya nsogbu.
 
23 Ihe na-atọ onye nzuzu ụtọ bụ izube nzube ọjọọ;
ma ihe na-atọ onye maara ihe ụtọ bụ inwe nghọta.
 
24 Ihe ahụ onye na-emebi iwu nʼatụ ụjọ ya ga-abịakwasị ya,
ihe onye ezi omume na-achọ ka a ga-enye ya.
 
25 Mgbe oke ifufe na-emebi ihe, ndị na-emebi iwu ka ọ na-eburu;
ma ndị ezi omume na-eguzosi ike ruo ebighị ebi.
 
26 Onye umengwụ na-abụ ihe mgbu nye onyenwe ya;
ọ dịka anwụrụ ọkụ nʼanya mmadụ maọbụ dịka mmanya gbara ụka nke na-ejiji eze.
 
27 Ịtụ egwu Onyenwe anyị na-enye ogologo ndụ,
ma ọnụọgụgụ afọ nke onye ajọ omume na-adị mkpụmkpụ.
 
28 Olileanya ndị ezi omume ga-abụ ọṅụ;
olileanya ndị na-emebi iwu bụ naanị ihe efu.
 
29 Ụzọ Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba nye ndị na-enweghị ịta ụta,
maọbụ ịla nʼiyi nye ndị na-eme ajọ ihe.
 
30 A pụghị iwezuga* onye ezi omume,
ma onye na-emebi iwu agaghị anọgide.
 
31 Nʼọnụ onye ezi omume ka mkpụrụ amamihe si abịa,
ma ire na-ekwu okwu nduhie ka a ga-eme ka o dere duu.
 
32 Egbugbere ọnụ onye ezi omume mara ihe na-eweta ihuọma,
ma ọnụ ndị ajọ omume bụ naanị okwu nduhie.
 
* 10:30 10:30 Maọbụ, ihopu