13
Nwa maara ihe na-ege ntị na ndụmọdụ nna ya
ma onye na-akwa emo adịghị ege ntị nʼịba mba.
 
Onye na-eme ezi ihe ga-esite nʼokwu ọnụ ya nweta ụgwọ ọrụ,
ma ndị na-aghọgbu ibe ha ga-anata ihe ike dịka ụgwọ ọrụ ha.
 
Mmadụ zuruoke bụ onye na-ejide ire ya aka!*
Ma onye ekwuruekwu na-ewetara onwe ya mbibi.
 
Ndị umengwụ na-achọ ọtụtụ ihe ma ọ dịghị ihe ha na-enweta;
ma onye na-arụsị ọrụ ike na-enweta ihe niile ọ chọrọ.
 
Onye ezi omume kpọrọ ụgha asị,
ma okwu ọnụ onye na-emebi iwu
na-ewetara ya ihere na nkọcha.
 
Ezi omume mmadụ na-abara ya uru na ndụ ya niile,
ma ajọ omume ndị mmehie na-ala ha nʼiyi.
 
Ọ dị mmadụ na-eme ka ọ bụ ọgaranya maọbụ onye ụkpa.
Ma ọ dịkwa mmadụ na-eme ka ọ bụ onye ụkpa maọbụ ọgaranya.
 
Ọgaranya nwere ike jiri ego ya gbapụta onwe ya,
ma ogbenye adịghị azaghachi mba banyere imerụ ya ahụ.
 
Ìhè onye ezi omume na-enwupụ enwupụ,
ma oriọna onye mmebi iwu ga-anyụ.
 
10 Nganga na-eweta esemokwu,
ma a na-ahụ amamihe nʼime ndụ ndị na-anata ndụmọdụ.
 
11 Akụ a kpatara ngwangwa na-emebikwa ngwangwa;
ma akụ sitere nʼịrụsị ọrụ ike na-eto eto.
 
12 Nchere a na-echere ogologo oge maka imezu olileanya e nwere na-egbu obi,
mgbe ihe a na-eche mezuru, oke ọṅụ na-adị.
 
13 Onye na-elelị ntụziaka anya ga-akwụ ụgwọ nʼihi ya,
ma onye na-atụ egwu ihe enyere nʼiwu ga-anata ụgwọ ọrụ ya.
 
14 Nkuzi nke onye maara ihe bụ isi iyi nke ndụ,
nke na-eme ka mmadụ ghara ịma nʼọnya ọnwụ.
 
15 Ezi nghọta na-eweta ihuọma,
ma ụzọ nke ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi na-eduba ha na mbibi.
 
16 Onye nwere uche na-eji ọmụma ihe nʼarụ ọrụ,
ma ndị nzuzu na-egosipụta enweghị uche ya.
 
17 Onyeozi ajọ omume na-adaba na nsogbu,
ma onyeozi kwesiri ntụkwasị obi na-eweta ọgwụgwọ.
 
18 Onye na-ajụ ịdọ aka na ntị ga-anwụ nʼụkpa na nʼihere;
ma onye na-anabata ịdọ aka na ntị ka a ga-asọpụrụ.
 
19 Mgbe ihe a na-ele anya mezuru ọ na-atọ mkpụrụobi ụtọ,
ma ndị nzuzu kpọrọ isite nʼajọ ihe wezuga onwe ha asị.
 
20 Na-eso ndị maara ihe ka ị ghọọ onye mara ihe,
nʼihi na onye na-eso ndị nzuzu na-aba na nsogbu.
 
21 Nsogbu bụ ihe na-esogharị ndị mmehie,
ma ngọzị na-esogharị ndị ezi omume.
 
22 Mgbe ezi mmadụ nwụrụ, ọ na-ahapụrụ ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya akụ,
ma mgbe onye mmehie nwụrụ, akụ ya na-abụ nke ndị ezi omume.
 
23 Ubi onye ogbenye pụrụ inwe ọtụtụ ihe oriri,
ma ikpe na-ezighị ezi na-azachapụ ya.
 
24 Onye ọbụla na-adọghị ụmụ ya aka na ntị, na-egosi na ọ hụghị ha nʼanya;
ma onye hụrụ ha nʼanya, ga-adọsi ha aka na ntị ike.
 
25 Onye ezi omume na-eri nri ruo na nriju afọ onwe ya,
ma nri na-akọ nʼafọ onye ajọ omume.
 
* 13:3 13:3 Abụ 141:3; Ilu 21:23