22
Ihe nhọrọ dị ezi mma ka aha ọma bụ karịa ọtụtụ akụ,
ịnata amara* ihuọma ka mma karịa ọlaọcha na ọlaedo.
 
Ma ogbenye ma ọgaranya bụ otu nʼihu Onyenwe anyị
onye kere ha niile.
 
Onye nwere uche na-ahụ nsogbu nke na-abịa nʼihu ma zobe onwe ya,
ma onye na-enweghị uche anaghị ele anya, ọ na-adaba nʼime nsogbu ahụ taa ahụhụ so ya.
 
Obi umeala bụ egwu Onyenwe anyị,
ụgwọ ọ na-akwụ bụ akụnụba, na nsọpụrụ na ndụ ogologo.
 
Ogwu na igbudu dị nʼụzọ onye na-emebi iwu;
ma onye kpọrọ ndụ ya ihe na-asọ ya asọ.
 
Kuziere nwantakịrị ka ọ họrọ ụzọ ziri ezi,
mgbe o tolitere ọ ga-anọgide nʼime ya.
 
Dịka ọgaranya si achị ogbenye,
otu a kwa ka onye na-ebi ego si bụrụ ohu onye na-ebinye ya ego.
 
Onye na-agha ikpe na-ezighị ezi dịka mkpụrụ, ga-ewe ajọ ihe dịka ihe ubi,
mkpanaka nke ikike iwe ha ga-agbajikwa.
 
Onye na-agbasapụ aka enye onyinye ga-abụ onye a gọziri agọzi,
nʼihi na ha na ekenyetụ ndị ogbenye nri.
 
10 Chụpụ onye na-akwa emo, ise okwu ga-akwụsị,
e, ịlụ ọgụ na nlelị ga-akwụsịkwa.
 
11 Onye na-ahụ ịdị ọcha nke obi nʼanya,
onye okwu ya jupụtara nʼamara ga-abụ enyi eze.
 
12 Anya Onyenwe anyị na-echebe ihe ọmụma,
ma ọ na-emebi atụmatụ niile nke ndị aghụghọ.
 
13 Onye umengwụ na-asị, “Ọdụm nọ nʼezi!
A ga-egbu m nʼama ọha mmadụ!”
 
14 Ọnụ nwanyị na-akwa iko bụ oke olulu,
nwoke nọ nʼokpuru oke iwe Onyenwe anyị na-adaba nʼime ya.
 
15 Obi ụmụntakịrị jupụtara nʼenweghị uche,
ma apịpịa ịdọ aka na ntị ga-achụpụ ya nʼebe dị anya.
 
16 Onye na-achọ uru site nʼimegbu onye na-enweghị ike,
maọbụ onye na-enye ọgaranya onyinye ga-ebi nʼoke ụkọ.
Okwu iri atọ onye maara ihe
Okwu nke mbụ
17 Lezie anya gee ntị nʼokwu niile nke ndị maara ihe,
tinye uche gị nʼihe m na-akụzi.
18 Ọ dị ụtọ ma idebe ha nʼobi gị,
ma ha dịkwa nʼegbugbere ọnụ gị mgbe niile.
19 Ọ bụ ka ntụkwasị obi gị dị nʼime Onyenwe anyị,
ya ka m na-akụziri gị taa, ọbụladị gị onwe gị.
20 Ọ bụ na m edepụtabereghị gị iri ndụmọdụ atọ ndị a,
bụ okwu ndụmọdụ na ihe ọmụma?
21 Ha na-ezi gị ihe bụ ikwesi ntụkwasị obi na ikwu eziokwu.
Mgbe ahụ ọ bụrụ na-ezie gị sị gị gaa chọta eziokwu
ị ga-eji ezi ọsịsa lọghachi.
Okwu nke abụọ
22 Emegbula ogbenye nʼihi na ọ bụ ogbenye.
Emegidekwala ya nʼụzọ ikpe.
23 Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ekwuchitere ha ọnụ ha
ma bibiekwa ndị na-emegide ha.
Okwu nke atọ
24 Gị na onye na-ewe oke iwe abụla enyi,
gị na onye na-ewe iwe ọsịịsọ emekọkwala ihe,
25 ma ọ bụghị ya, i nwere ike ịmụta ndụ ha,
si otu a tinye ndụ gị na nsogbu.
Okwu nke anọ
26 Abụla onye otu nʼime ndị na-anara ndị mmadụ akaebe
maọbụ kwee nkwa ikwu ụgwọ onye ọzọ ji.
27 Nʼihi na ọ bụrụ na i nweghị ego ị ga-eji kwụọ ụgwọ ahụ,
a ga-anapụ gị ọ bụladị ihe ndina gị.
Okwu nke ise
28 Ehigharịla oke ala e tinyere site na mgbe ochie.
Nke ndị nna ochie gị ha hiwere.
Okwu nke isii
29 Ị hụrụ mmadụ ahụ nke nwere ǹka nʼịrụ ọrụ ya nke ọma?
Ọ ga-eguzo nʼihu ndị eze,
ọ gaghị eguzo nʼihu ndị a na-amaghị aha ha.
* 22:1 22:1 Maọbụ, mmadụ inwe ugwu 22:6 22:6 Efe 6:4; 2Tm 3:15