27
Anyala isi banyere echi,
nʼihi na ị maghị ihe echi ga-abụ.*
 
Ka onye ọzọ too gị, ọ bụghị ọnụ gị.
Ka onye ọzọ too gị, ka egbugbere ọnụ gị abụọ ghara ito gị.
 
Nkume dị arọ, aja bụkwa ibu arọ,
ma mkpasu iwe nke onye nzuzu dị arọ karịa ha abụọ.
 
Iwe na-emebi ihe,
ma ekworo jọrọ njọ karịa iwe.
 
Mba abara nʼihe ka mma
karịa ịhụnanya ezoro ezo.
 
Ihe kwesiri ntụkwasị obi ka mmerụ ahụ nke sitere nʼaka enyi bụ,
ma onye iro na-eme ka isutu ọnụ mụbaa.
 
Mmanụ aṅụ adịghị atọ onye rijuru afọ ụtọ;
ma mgbe agụụ ji ya, ọ ga-eri ọ bụladị ihe dị ilu.
 
Nwoke na-akpafu site nʼụlọ ya
dị ka nnụnụ na-amakwaghị akwụ ya.
 
Mmanụ isi ụtọ na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-eme ka obi ṅụrịa,
otu a ka ụtọ enyi dị,
site na ndụmọdụ nke mkpụrụobi ha.
 
10 Ahapụla enyi gị maọbụ ndị enyi nna gị.
Mgbe ị nọ na mkpa arịọla nwanne gị ka o nyere gị aka.
Onye agbataobi nọ gị nso nwere ike inyere gị aka karịa nwanne gị nọ ebe dị anya.
 
11 Nwa m, obi ga-atọ m ụtọ nke ukwuu ma a sị na ị ga-amụta ihe!
Mgbe ahụ, aga m enwe ihe m ga-asa ndị na-akọcha m.
 
12 Onye nwere uche na-ahụ nsogbu nke na-abịa nʼihu ma zobe onwe ya.
Ma onye na-enweghị uche anaghị ele anya, ọ na-adaba nʼime nsogbu ahụ taa ahụhụ so ya.
 
13 Chịrị uwe onye ahụ nke naara onye mba ọzọ na mbe.
E, chiri ya ma ọ bụrụ nwanyị na-abụghị nwunye ya ka o nara na mbe.
 
14 Ọ bụrụ na onye ọbụla e jiri oke olu gọzie onye agbataobi ya nʼisi ụtụtụ
a ga-agụ nke a dịka ịbụ ọnụ.
 
15 Mmiri na-ata nʼime ụlọ mgbe mmiri na-ezo
na nwanyị na-eso okwu bụ otu.
16 Onye nwere ike ịkwụsị ya nwere ike iji aka jide ifufe,
maọbụ were aka jide mmanụ.
 
17 Dịka e si eji igwe amụ igwe ọzọ ka ọ dị nkọ,
otu a ka mmadụ si enyere ibe ya aka ịdị nkọ.
 
18 Onye na-eche osisi fiig nche ga-eri mkpụrụ ya,
onye na-echebekwa nna ya ukwu ka a ga-asọpụrụ.
 
19 Dịka e si ahụ ihu mmadụ nʼime mmiri
otu a ka obi mmadụ si egosi ihe onye ahụ bụ.
 
20 Dịka afọ adịghị eju ọnwụ na mbibi,
otu a ihe na-agụ anya mmadụ adịghị agwụ agwụ.
 
21 Ite eji anụcha ihe dịrị ọlaọcha, oke ọkụ dịkwara ọlaedo
ma a na-anwale ndị mmadụ site nʼotuto a na-enye ha.
 
22 Nʼagbanyeghị na ị ga-egwepịa onye nzuzu nʼime ikwe,
were aka odo gwee ha dịka mkpụrụ ọka,
ị pụghị isite nʼahụ ha wepụ enweghị uche ha.
 
23 Lezie ọrụ gị anya nke ọma,
marakwa ọnọdụ igwe ewu na atụrụ gị na anụ ụlọ ndị ọzọ,
24 nʼihi na akụnụba adịghị adịgide.
Ọ bụladị okpueze nke onye eze na-emesịa gabiga.
25 Mgbe e gbupụchara ahịhịa ochie, nke ọhụrụ na-epupụta,
mgbe ahụ ka a na-achịkọbata ahịhịa sị nʼugwu.
26 Ụmụ atụrụ ga-enye gị uwe ị ga-eyi,
ụmụ ewu ga-enyekwa gị ego ọnụahịa ala ubi gị.
27 Ị ga-enwe mmiri ara ewu nke ga-ezuru gị na ndị ezinaụlọ gị nri,
na nke ga-edozi ahụ ndị odibo nwanyị gị.
 
* 27:1 27:1 Luk 12:19-21; Jem 4:13-16 27:2 27:2 Etola onwe gị, chere ka ndị ọzọ too gị