29
Onye a na-abara mba mgbe niile ma ọ naghị anata ndụmọdụ,
nʼotu ntabi anya ka a ga-etipịa ya, ọ gaghị ekulikwa ọzọ.
 
Mgbe ndị ezi omume nọ nʼọchịchị, ndị a na-achị na-aṅụrị ọṅụ,
ma ha na-asụ ude mgbe onye ajọ omume na-achị.
 
Nwoke hụrụ amamihe nʼanya na-eme ka nna ṅụrịa,
ma onye bụ enyi ụmụ nwanyị akwụna, na-ala akụnụba ya nʼiyi.
 
Eze na-achị nʼeziokwu na-ewetara obodo ya ọganihu,
ma nke na-achọ ngarị na-ala ya nʼiyi.
 
Onye ahụ ji ire ụtọ na-aja onye agbataobi ya mma
bụ ọnya ka ọ na-esiri ya.
 
Ọ bụ onye ajọ omume siri ọnya ka ọnya ahụ na-ama.
Ma ndị ezi omume na-anọrọ onwe ha na-agụ egwu ọṅụ.
 
Onye ezi omume na-etinye anya nʼihe banyere ikpe ziri ezi nke ndị ogbenye,
ma ụdị echiche ahụ adịghị abata ndị ajọ omume nʼobi.
 
Ndị nzuzu na-amalite ọgụ ebe niile,
ma ndị nwere uche na-agbalịsị ike ime ka udo dị.
 
Ọ bụrụ na onye maara ihe esoro onye nzuzu gaa nʼụlọikpe,
onye nzuzu ga-ewe iwe ọkụ, mee mkpọtụ, kwaa emo ma udo agaghị adị.
 
10 Ndị ndụ ha na-ebi bụ ime ihe ike na-akpọ onye eziokwu asị,
ha na-achọsikwa ike ụzọ ha ga-esi gbuo onye ndụ ya ziri ezi.
 
11 Onye nzuzu na-egosi oke iwe ya,
ma onye nwere uche na-ejide onwe ya na-emekwa ka mmụọ ya dajụọ.
 
12 Ọ bụrụ na onye na-achị achị aṅaa ntị nʼokwu ụgha,
ndị niile na-ejere ya ozi ga-aghọ ndị ajọ omume.
 
13 Ogbenye na ọgaranya bụ otu na nke a:
ọ bụ Onyenwe anyị na-eme ka ha jiri anya ha na-ahụ ụzọ.
 
14 Ọ bụrụ na eze esite nʼizi ezi kpee ndị ogbenye ikpe,
a ga-eme ka ocheeze ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.
 
15 Ịba mba na iti nwantakịrị ihe na-enye aka mee ka ọ bụrụ ezi nwa,
ma nwantakịrị a na-adịghị adụ ọdụ na-eme nne ya ihe ihere.
 
16 Mgbe ndị na-emebi iwu na-aga nʼihu, njehie na-aba ụba nʼetiti ndị a na-achị achị,
ma ndị ezi omume ga-eguzo hụ ọdịda ha.
 
17 Dọọ nwa gị aka na ntị, ndụ ya ga-enye obi gị udo na ọṅụ.
Ọ gaghị emekwa ka ihere mee gị.
 
18 Obodo na-adịghị atụ egwu Chineke bụ obodo na-adịghị agazi nʼusoro,
ma ọṅụ na-adịrị obodo ahụ na-edebe ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu.
 
19 Ọ bụghị naanị okwu ọnụ ka e ji adọ ndị na-eje ozi aka na ntị,
nʼihi na ha nwere ike ghọta ma ha ga-ajụ ime ihe ị chọrọ.
 
20 Olileanya dịrị onye nzuzu
karịa onye ahụ na-adịghị echezi echiche tupu o kwuo okwu.
 
21 Ị malite na mbụ na-emezi onye na-ejere gị ozi,
ọ ga-emesịa chọọ ka i meere ya dịka nwa gị.
 
22 Onye na-ewe iwe na-akpali ọgụ,
onye na-ewe iwe ọkụ na-eme ọtụtụ mmehie.
 
23 Nganga mmadụ na-eme ka ọ daa,
ma mmadụ ahụ dị umeala nʼobi ga-eweta nsọpụrụ.
 
24 Ndị ọbụla na-enyere ndị ohi aka bụ ndị iro nke ndụ ha,
a na-edu ha nʼịṅụ iyi, ma ha adịghị agba akaebe.
 
25 Ịtụ egwu mmadụ bụ ihe ịma nʼọnya,
ma onye ọbụla na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-anọ nʼudo.
 
26 Ị chọrọ ikpe ziri ezi?
Elela onye ikpe anya nʼihu, kama gwa Onyenwe anyị maka ya.
 
27 Onye ezi omume na-akpọ ajọ omume asị;
ndị na-emebi iwu na-akpọ onye ndụ ya ziri ezi asị.