4
Amamihe Kachasị ihe niile
Ụmụ m ndị ikom, geenụ ntị na ndụmọdụ nke nna unu,
lezienụ anya ka unu nwee nghọta.
Ṅaanụ ntị, nwee uche, nʼihi na ọ bụ ezi ozizi ka m na-ezi unu;
ya mere, unu ahapụkwala iwu m.
Mgbe m bụ nwantakịrị nʼụlọ nna m,
mgbe m ka dị ntakịrị, bụrụkwa naanị otu nwa nne m ji,
ọ ziri m ihe, sịkwa m,
“Ka obi gị jidesie okwu m niile ike,
debe nʼiwu niile, ị ga-adịkwa ndụ.
Nweta amamihe, nwetakwa nghọta,
echezọkwala okwu m, maọbụ site na ya wezuga onwe gị.
Ahapụla amamihe, ọ ga-echebe gị,
hụ ya nʼanya, nʼihi na ọ ga-eduzi gị.
Mmalite amamihe bụ nke a, nweta amamihe,
ihe ọbụla o ga-efu gị, nweta nghọta.
Ọ bụrụ na i bulie amamihe elu, o ga-ebulikwa gị elu.
Jidesie ya ike, ọ ga-ewetara gị oke nsọpụrụ.
Ọ ga-eji okpueze okoko osisi chọọ isi gị mma
nyekwa gị okpueze mara mma nʼisi gị.”
 
10 Nwa m, ṅaa m ntị, meekwa ihe m gwara gị;
ị ga-enwekwa ndụ ogologo.
11 M ga-edu gị nʼụzọ nke amamihe,
duokwa gị nʼụzọ ziri ezi.
12 Ọ bụrụ na i bie ụdị ndụ dị otu a, ihe agaghị akpọ gị nʼụkwụ nʼije gị,
ị gaghị asụkwa ngọngọ mgbe ị na-agba ọsọ.
13 Mee ihe niile m gwara gị, echefukwala ha,
nʼihi na ọ ga-eduba gị na ndụ zuruoke.
14 Emela dịka ndị na-emebi iwu.
Esokwala ụzọ ha.
15 Zeere ha, ejekwala nʼụzọ ha;
chepu ihu gị nʼụzọ ahụ,
16 nʼihi na ndị na-emebi iwu adịghị arahụ ụra tutu ha emee arụ nke ụbọchị ahụ.
Ha anaghị ezu ike tutu ha emee ka otu onye maa nʼọnya.
17 Ha na-eri ihe oriri nke mmebi iwu,
na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ nke ọgbaaghara.
 
18 Ma ụzọ ndị ezi omume dị ka anyanwụ na-awa nʼisi ụtụtụ,
nke na-enwuwakwa dịka ìhè nʼetiti ehihie ụbọchị.
19 Ma ụzọ onye na-emebi iwu dị ka itiri nke ọchịchịrị,
ha anaghị ama ihe na-eme ka ha sụọ ngọngọ.
 
20 Gee ntị nwa m, nʼihe m na-ekwu.
Gee ntị nke ọma.
21 Doo ihe ndị a nʼuche gị mgbe niile;
ka ha bamiekwa nʼime obi gị,
22 nʼihi na ha bụ ndụ nye ndị chọtara ha,
bụrụkwa ahụ ike nye mmadụ.
23 Nke ka nke, lezie echiche uche gị niile anya,
nʼihi na ha na-emetụta ndụ gị niile.
24 Ka ụgha ọbụla ghara isi gị nʼọnụ pụta;
kpọọ ịgha ụgha niile na okwu rụrụ arụ niile asị.
25 Legide anya nʼihu ime ihe bụ eziokwu;
atụgharịkwala isi gị ile ihe ọbụla.
26 Leruo ije ụkwụ gị anya,
doziekwa ụzọ gị niile ka ọ guzozie.
27 Ewezugala onwe gị site nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe;
si nʼihe ọjọọ wezuga ụkwụ gị.