Abụ Ọma
Nchịkọta Akwụkwọ nke mbụ
1
Abụ Ọma 1–41
Onye ihe na-agara nke ọma
Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ,
onye na-adịghị aga ije na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu;
onye na-adịghị eguzokwa nʼụzọ ndị mmehie
maọbụ soro nʼotu ndị nkwutọ.
Kama ihe na-atọ ya ụtọ bụ ime ihe niile dị nʼiwu Onyenwe anyị.
Ọ na-atụgharịkwa uche ya nʼiwu Onyenwe anyị ehihie na abalị,
Ọ dị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi,
nke na-amịpụta mkpụrụ ya nʼoge ya,
nke ahịhịa ya na-adịghị akpọnwụ akpọnwụ.
Ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma.
 
Ma ndị ajọ omume adịghị otu a.
Ha dị ka igbugbo ọka
nke oke ifufe na-efesasị.
Ya mere, ndị ajọ omume agaghị eguzosi ike nʼụbọchị ikpe;
ndị mmehie agaghị eguzokwa na nzukọ ndị ezi omume.
 
Nʼihi na Onyenwe anyị na-eche ụzọ ndị ezi omume nche.
Ma ụzọ ndị ajọ omume ga-eduba ha nʼịla nʼiyi.