Abụ Ọma 102
Ekpere nke onye nọ na mmekpa ahụ na ọnọdụ ịda mba, na-ekwupụta otu o si dịrị ya nʼihu Onyenwe anyị.
Arịrịọ maka ime ebere
Nụrụ ekpere m, O Onyenwe anyị;
ka ịkwa akwa m maka inyeaka ruo gị ntị.
Ezonarịla m ihu gị
nʼụbọchị nsogbu m.
Gee ntị nʼekpere m,
zakwaa m ngwangwa.
 
Nʼihi na ụbọchị m niile na-agabiga, dịka anwụrụ ọkụ;
ọkpụkpụ m niile dịkwa ka ọlọkọ ọkụ.
Mkpụrụobi m etiwaala abụọ na-achanwụkwa dịka ahịhịa;
ana m echefu iri nri m.
Nʼihi oke ịsụ ude m na-asụ,
enwekwaghị m anụ ahụ ọbụla nʼahụ m. Abụ m naanị ọkpụkpụ.
Adị m ka ikwighịkwighị nke ọzara,
a dị m ka ikwighịkwighị nʼetiti ebe dakpọsịrị adakpọsị.
Ana m amụ anya abalị niile;
adị m ka nwa nnụnụ naanị ya bekwasịrị nʼelu ụlọ.
Ụbọchị niile, ndị iro m na-eji m eme ihe ọchị;
ndị na-akwa m emo na-eji aha m mere ihe ịbụ ọnụ.
Nʼihi na ejirila m ntụ mere ihe oriri m,
anya mmiri m na-agwakọta nʼiko ihe ọṅụṅụ m
10 nʼihi oke iwe gị,
i bulitela m, ma tụpụ m nʼakụkụ.
11 Ụbọchị m niile dịka onyinyo nke a na-ahụ anya mgbe anwụ na-ada.
Ana m akpọnwụ akpọnwụ, dịka ahịhịa.
 
12 Ma gị Onyenwe anyị, na-anọgide nʼocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi;
aha gị ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
13 Ị ga-ebili nwee ọmịiko nʼebe Zayọn nọ,
nʼihi na oge izi ya ihuọma eruola;
oge ahụ a kara aka eruola.
14 Nʼihi na nkume ya niile dị oke ọnụahịa nye ndị ohu gị;
mgbe ha hụrụ uzuzu ya, ha na-emere ya ebere.
15 Mba niile ga-atụ egwu aha Onyenwe anyị,
ndị eze niile nke ụwa ga-asọpụrụkwa ebube gị.
16 Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ewugharị Zayọn,
ọ ga-apụta ihe nʼebube ya.
17 Ọ ga-aza ekpere ndị nọ na mkpa;
ọ gaghị eleda arịrịọ ha anya.
 
18 Ka e depụta ihe ndị a maka ọgbọ nke dị nʼihu,
ka ndị a na-amụbeghị nwee ike too Onyenwe anyị:
19 Onyenwe anyị sitere nʼebe nsọ ya dị elu ledata anya,
o sitere nʼeluigwe ledata anya ya nʼụwa,
20 ịnụ ịsụ ude nke ndị a tụrụ mkpọrọ
na ịgbapụta ndị a mara ikpe ọnwụ.”
21 Nʼihi nke a, a ga-ekwuwapụta aha Onyenwe anyị na Zayọn;
a ga-eto ya na Jerusalem,
22 mgbe mba niile na alaeze niile,
ga-ezukọta nʼotu ebe, ife Onyenwe anyị ofufe.
 
23 O meela ka ike gwụ m nʼoge ndụ m;
o meela ka ndụ m dịrị mkpụmkpụ.
24 Nʼihi ya, ekwuru m sị,
“Anapụla m ndụ m, o Chineke m, ugbu a m ka dị ndụ;
ị na-adịgide ndụ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
25 Na mmalite, ị tọrọ ntọala ụwa,
eluigwe bụkwa ọrụ aka gị.
26 Ha ga-ala nʼiyi, ma ị ga-adịgide;
ha ga-erichasị dịka akwa ochie.
Ị ga-agbanwe ha dịka mmadụ si agbanwe uwe ya,
ha ga-abụ ndị ewezugara ewezuga.
27 Ma gị onwe gị enweghị mgbanwe,*
ọnụọgụgụ afọ gị adịghị agwụkwa agwụ.
28 Ụmụ ndị ohu gị ga-ebigide;
ụmụ ụmụ ha ga-eguzosie ike nʼihu gị.”
* Abụ Ọma 102:27 102:27 Aịz 41:1; Aịz 43:10; Mal 3:6; Hib 13:8; Jem 1:17